Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/15 p. 9-14
  • Okwukwe na Ọdịnihu Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwukwe na Ọdịnihu Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ihe Ndị Gara Aga Dị Ka Ya?
  • E Nweghị Ihe Ngwọta Sitere n’Aka Mmadụ
  • Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Ọdịnihu Anya
  • Ọdịnihu nke Ịchịisi Mmadụ
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Jehova
  • Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jehova Na-emezuru Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nkwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/15 p. 9-14

Okwukwe na Ọdịnihu Gị

“Okwukwe bụ ndabere nke nnwapụta nke ihe a na-ele anya.”—NDỊ HIBRU 11:1.

1. Olee ụdị ọdịnihu ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-achọ?

Ì NWERE mmasị n’ọdịnihu? Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwere. Ihe ha na-ele anya ya bụ ọdịnihu nke udo, nnwere onwe pụọ n’egwu, ọnọdụ ibi ndụ dị mma, ọrụ na-eweta uru na nke na-enye obi ụtọ, ezi ahụ ike na ogologo ndụ. Obi abụọ adịghị ya na ọgbọ ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme achọwo ihe ndị ahụ. Taakwa, n’ụwa nke a jupụtara nnọọ ná nsogbu, a na-achọ ọnọdụ ndị dị otú ahụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

2. Olee otú otu onye ọnụ na-eru n’okwu si kwupụta otu echiche banyere ọdịnihu?

2 Ka ihe a kpọrọ mmadụ na-abanye na narị afọ nke 21, è nwere ụzọ ọ bụla a ga-esi mata ihe ọdịnihu ga-adị ka ya? Onye America ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Patrick Henry kwuru otu ụzọ ihe karịrị afọ 200 gara aga. Ọ sịrị: “Amaghị m ụzọ ọ bụla e si ekpebi ọdịnihu ma ọ̀ bụghị site n’ihe ndị gaworo aga.” Dị ka echiche a si dị, a pụrụ ịmata ọdịnihu ụmụ mmadụ ruo nnọọ n’ókè dị ukwuu site n’ihe mmadụ mere n’oge gara aga. Ọtụtụ kwenyere n’echiche ahụ.

Gịnị Ka Ihe Ndị Gara Aga Dị Ka Ya?

3. Gịnị ka ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme na-egosi banyere olileanya maka ọdịnihu?

3 Ọ bụrụ na ọdịnihu gaje iyi ihe ndị gaworo aga, ị̀ na-ahụ nke ahụ dị ka ihe na-agba ume? Ọdịnihu ọ̀ kaara ọgbọ ndị gara aga mma? Ọ dịchaghị otú ahụ. N’agbanyeghị olileanya ndị ndị mmadụ nweworo ruo ọtụtụ puku afọ na n’agbanyeghị ọganihu ihe onwunwe n’ebe ụfọdụ, akụkọ ihe mere eme ejupụtawo ná mmegbu, mpụ, ime ihe ike, agha, na ịda ogbenye. Ụwa a enwewo ọdachi kwuru ọdachi, ndị ọchịchị mmadụ na-erijughị afọ kpataworo n’ụzọ bụ isi. Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji nwee olileanya ná mmalite narị afọ nke 20? (b) Gịnị mere olileanya ha maka ọdịnihu?

4 Eziokwu dị na ya bụ na ajọ akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ nọgidere na-emeghachi—ọ gwụla na ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu ma na-ebibi ihe karị. Narị afọ nke 20 a bụ ihe nnwapụta nke ahụ. Ihe a kpọrọ mmadụ hà amụtawo ihe site n’ihie ụzọ ndị gara aga ma zere ha? Ná mmalite narị afọ a, ọtụtụ nwere okwukwe n’ọdịnihu ka mma n’ihi na e nwewo nnọọ ogologo oge nke udo na n’ihi ọganihu ndị e nwere n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe, sayensị, na agụmakwụkwọ. Ná mmalite afọ ndị 1900, otu onye prọfesọ mahadum sịrị na, e kwenyere na agha enwekwaghị ike ịda n’ihi na “ndị mmadụ emepewo anya nke ukwuu.” Onye bụbu praịm minista Britain kwuru banyere echiche ndị mmadụ nwere laa azụ n’oge ahụ, sị: “Ihe nile ga na-aka mma na-aga n’ihu. Nke a bụ ụwa a mụnyere m n’ime ya.” Ma o kwuziri: “Na mberede, n’atụghị anya ya, otu ụtụtụ na 1914 ihe nile bịara ná njedebe.”

5 N’agbanyeghị okwukwe n’ọdịnihu ka mma nke juru ebe nile n’oge ahụ, narị afọ ọhụrụ ahụ ka na-amalite amalite mgbe ọdachi kasị njọ metụworonụ bụ́ nke mmadụ kpatara—Agha Ụwa Mbụ—rikpuru ụwa. Dị ka ihe atụ nke ọdịdị ya, tụlee ihe weere ọnọdụ na 1916 n’otu ọgụ mgbe usuu ndị agha Britain wakporo ihu agha ndị Germany na nso Osimiri Somme dị na France. Nanị n’ime hour ole na ole, mmadụ 20,000 nwụnahụrụ ndị Britain, e gbukwara ọtụtụ n’akụkụ ndị Germany. Afọ anọ nke igbu mmadụ tara isi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị soja iri na ọtụtụ ndị nkịtị. Ọnụ ọgụgụ ndị France dalatara nwa mgbe n’ihi ọtụtụ ndị ikom nwụrụnụ. E bibiri ọnọdụ akụ̀ na ụba, na-eduje n’Oké Ndakpọ nke afọ ndị 1930. Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị jiworo kwuo na ụbọchị ahụ Agha Ụwa Mbụ malitere bụ ụbọchị ụwa gbara ara!

6. Ndụ ọ̀ kara mma mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị?

6 Nke a ọ̀ bụ ọdịnihu ọgbọ ahụ lere anya ya? Ee e, ọ bụtụghị ya. Olileanya ha kụrụ afọ n’ala; ihe ahụ dum edujeghịkwa n’ihe ka mma. Nanị afọ 21 mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ma ọ bụ na 1939, ọdachi ka njọ mmadụ kpatara malitere—Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ tara isi ihe dị ka nde 50 nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka. Ịtụ bọmbụ n’ìgwè gwepịasịrị ọtụtụ obodo. N’Agha Ụwa Mbụ, e gburu puku ụfọdụ nke ndị soja n’otu ọgụ n’ime hour ole na ole nanị, ebe n’Agha Ụwa nke Abụọ, nanị bọmbụ atọm abụọ gburu ihe karịrị mmadụ 100,000 n’ime sekọnd ole na ole nanị. Ihe ọtụtụ mmadụ lere anya dị ka nke ka dị njọ bụ ogbugbu nke ọtụtụ nde mmadụ n’usoro n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi.

7. Gịnị bụ eziokwu banyere narị afọ nke a nile?

7 Ọtụtụ akwụkwọ na-ekwu na ọ bụrụ na anyị agụnye agha n’etiti mba na mba, ọgụ ime obodo, na ọnwụ ndị gọọmenti wetawooro ụmụ amaala ha, ndị e gburu na narị afọ a ga-eru ihe dị ka nde 200. Ọbụna otu akwụkwọ tinyere ọnụ ọgụgụ ahụ ịbụ nde 360. Cheedị banyere ihe ụjọ ha dum—ihe mgbu, anya mmiri, ịta ikekere ezé, na ndụ ndị a lara n’iyi! Tụkwasị na nke a, ná nkezi, ihe dị ka mmadụ 40,000, karịsịa ụmụaka, na-anwụ kwa ụbọchị site n’ihe ndị ịda ogbenye na-akpata. A na-egbu okpukpu atọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ kwa ụbọchị site n’isikwopụ afọ ime. Ọzọkwa, ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ dara ogbenye nke ukwuu nke na ha apụghị inweta nri ndị a chọrọ iji rụọ ọrụ a na-arụ n’ụbọchị. Ọnọdụ ndị a nile bụ ihe àmà nke ihe e bu ụzọ kwuo n’amụma Bible na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe a.—2 Timoti 3:1-5, 13; Matiu 24:3-12; Luk 21:10, 11; Mkpughe 6:3-8.

E Nweghị Ihe Ngwọta Sitere n’Aka Mmadụ

8. Gịnị mere ndị ndú bụ́ mmadụ ji na-enweghị ike ịgwọta nsogbu ụwa?

8 Ka narị afọ nke 20 a na-eru ná ngwụsị ya, anyị pụrụ ịgbakwụnye ahụmahụ ya na nke narị afọ ndị gara aga. Gịnịkwa ka akụkọ ihe mere eme ahụ na-ekwu? Ọ na-agwa anyị na ndị ndú bụ́ mmadụ agwọtatụbeghị nsogbu ndị bụ isi nke ụwa, na ha adịghị agwọ ha ugbu a, nakwa na ha agaghị agwọ ha n’ọdịnihu. O doro anya na ọ karịrị ike ha iweta ụdị ọdịnihu anyị chọrọ, n’agbanyeghị otú ha pụrụ inweru nzube ọma. Ụfọdụ ndị nọkwa n’ọchịchị enweghị nzube ọma; ha na-achọ ọkwá na ike maka otuto efu nke ha na inweta ihe onwunwe, ọ bụghị maka ọdịmma nke ndị ọzọ.

9. N’ihi gịnị ka e ji nwee ihe mere a ga-eji nwee obi abụọ na sayensị nwere azịza nye nsogbu nile nke mmadụ?

9 Sayensị ò nwere azịza ya? O nweghị ya ma anyị tụlee ihe gaworo aga. Ndị ọkà mmụta sayensị nke gọọmenti emefuwo ego, oge, na mgbalị ndị dị ukwuu n’imepụta ngwá agha mmiri ọgwụ, nke usoro ndụ, na ụdị ndị ọzọ bụ́ ndị na-ebibi ihe nke ukwuu. Mba dị iche iche, gụnyere ndị ọ na-esiri ike inweta ha, na-emefu ihe karịrị ijeri dollar 700 kwa afọ ná ngwá agha! Ọzọkwa, ‘ọganihu na nkà mmụta sayensị’ bụ ya so kpata ọgwụ ndị tụnyeworo ụtụ n’imetọ ikuku, ala, mmiri, na nri.

10. Gịnị mere ọbụna agụmakwụkwọ enweghị ike iweta ọdịnihu ka mma?

10 Ànyị pụrụ ile anya na ebe agụmakwụkwọ ndị dị n’ụwa ga-enye aka iwulite ọdịnihu ka mma site n’ịkụzi ụkpụrụ omume ndị dị elu, ichebara ndị ọzọ echiche, na ịhụnanya ndị agbata obi? Mba. Kama nke ahụ, ha na-elekwasị anya n’ọrụ, n’ịkpata ego. Ha na-ewulite ajọ mmụọ ịma aka, ọ bụghị nke imekọ ihe ọnụ; ụlọ akwụkwọ adịghịkwa akụzi omume ọma. Kama nke ahụ, ọtụtụ n’ime ha na-anakwere ime mgbaratụ, nke kpataworo ajọ mmụba nke ntụrụ ime n’oge afọ iri na ụma na ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ.

11. Olee otú ihe ndekọ ụlọ ọrụ achụmnta ego si eweta obi abụọ banyere ọdịnihu?

11 À ga-akwali agadaga ụlọ ọrụ achụmnta ego ndị e nwere n’ụwa na mberede ilekọta mbara ụwa anyị nke ọma na igosi ịhụnanya maka ndị ọzọ site n’imepụta ihe ndị ga-aba ezigbo uru, ọ bụghịkwa nanị maka uru ahịa? O yighị ka ọ ga-eme. Hà ga-akwụsị imepụta ihe omume telivishọn ndị jupụtara n’ime ihe ike na omume rụrụ arụ na-eso emerụ uche ndị mmadụ, karịsịa ndị na-eto eto? Ihe ndị mere eme n’oge na-adịbeghị anya gara aga adịghị agba ume ma ọlị n’ihi na, n’akụkụ ka ukwuu, TV aghọwo olulu mmiri ọjọọ nke omume rụrụ arụ na ime ihe ike.

12. Gịnị bụ ọnọdụ mmadụ n’ihe metụtara ọrịa na ọnwụ?

12 Ọzọkwa, n’agbanyeghị otú ndị dọkịta nweruru obi eziokwu, ha apụghị imeri ọrịa na ọnwụ. Dị ka ihe atụ, ná ngwụsị Agha Ụwa Mbụ, ha enweghị ike ịkwụsị oké ahụ ọkụ Spain; gburugburu ụwa, ọ tara isi ihe dị ka nde mmadụ 20. Taa, ọrịa obi, ọrịa cancer, na nrịanrịa ndị ọzọ na-eweta ọnwụ juru eju. Ndị ọrụ ahụ ike enwebeghịkwa ike imeri ihe otiti oge a bụ́ AIDS. N’ụzọ megidere nke ahụ, otu akụkọ òtù U.N nke a kọsara na November 1997 kwubiri na ọ̀tụ̀tụ̀ nke nje virus AIDS ji agbasa ji okpukpu abụọ karịa atụmatụ ndị bu ụzọ. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ nde anwụwo site na ya. N’ime otu afọ na-adịbeghị anya, nde atọ ọzọ butere ya.

Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Ọdịnihu Anya

13, 14. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ọdịnihu anya? (b) Gịnị mere na ụmụ mmadụ apụghị iweta ọdịnihu ka mma?

13 Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova kwere na ihe a kpọrọ mmadụ nwere ọdịnihu dị mma, nke kachasị mma! Ma ha adịghị atụ anya ọdịnihu ahụ ka mma ịbịa site ná mgbalị ụmụ mmadụ. Kama nke ahụ, ha na-elegara Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, anya. Ọ maara ihe ọdịnihu ga-adị ka ya, ọ ga-abụkwa nke dị ebube! Ọ makwaara na ụmụ mmadụ apụghị iweta ọdịnihu dị otú ahụ. Ebe ọ bụ Chineke kere ha, ọ maara ihe ha ga-emeli karịa nnọọ onye ọ bụla ọzọ. N’Okwu ya, ọ na-agwa anyị hoo haa na o kenyeghị ụmụ mmadụ ikike ịchị onwe ha nke ọma n’enweghị nduzi Chineke. Ogologo oge nke Chineke kwere ka ịchịisi mmadụ na-adabereghị n’ebe ọ nọ dịrị egosipụtawo enweghị ikike ahụ n’ụzọ obi abụọ ọ bụla na-adịghị na ya. Otu onye dere akwụkwọ kwetara, sị: “Uche mmadụ anwalewo ngwakọta ọbụbụeze nile ndị kwere omume, n’enweghịkwa isi.”

14 Na Jeremaịa 10:23, anyị na-agụ okwu nke onye amụma ahụ e nyere ike mmụọ nsọ, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Ọzọ, Abụ Ọma 146:3 na-asị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” N’ezie, n’ihi na a mụrụ anyị n’ezughị okè, dị ka Ndị Rom 5:12 na-egosi, Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị gharakwa ịtụkwasị onwe anyị obi. Jeremaịa 17:9 na-asị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile.” N’ihi ya, Ilu 28:26 na-ekwu, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu: ma onye na-eje ije n’amamihe, onye ahụ ka a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”

15. Olee ebe anyị pụrụ ịchọta amamihe iduzi anyị?

15 Olee ebe anyị pụrụ ịchọta amamihe a? “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ: ihe ọmụma nke Onye Nsọ bụkwa nghọta.” (Ilu 9:10) Nanị Jehova nwere amamihe nke pụrụ iduzi anyị gabiga oge ndị a dị egwu. O meghewokwara anyị ụzọ isi nweta amamihe ya site n’Akwụkwọ Nsọ, nke o mere ka e dee maka nduzi anyị.—Ilu 2:1-9; 3:1-6; 2 Timoti 3:16, 17.

Ọdịnihu nke Ịchịisi Mmadụ

16. Ònye kpebiworo ọdịnihu?

16 Mgbe ahụ, gịnị ka Okwu Chineke na-agwa anyị banyere ọdịnihu? Ọ na-agwa anyị na ọdịnihu n’ezie agaghị eyi ihe ụmụ mmadụ meworo n’oge gara aga. Ya mere echiche Patrick Henry ezighị ezi. Ọ bụghị ụmụ mmadụ ga-ekpebi ọdịnihu nke ụwa a na nke ndị bi n’elu ya, kama ọ bụ Jehova Chineke. A gaje ime uche ya n’elu ụwa, ọ bụghị uche ụmụ mmadụ ma ọ bụ mba dị iche iche nke ụwa a. “Ọtụtụ echiche dị n’obi mmadụ; ma ndụmọdụ Jehova, nke ahụ ga-eguzosi ike.”—Ilu 19:21.

17, 18. Gịnị bụ uche Chineke maka oge anyị?

17 Gịnị bụ uche Chineke maka oge anyị? O zubewo iweta usoro ihe a na-eme ihe ike, nke omume rụrụ arụ, ná njedebe. A ga-eji ịchịisi nke Chineke ga-eguzobe dochie ọtụtụ narị afọ nke ajọ ịchịisi mmadụ n’isi nso. Amụma dị na Daniel 2:44 na-asị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [nọ taa], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie [n’eluigwe], nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighi ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Alaeze ahụ ga-ewepụkwa ajọ mmetụta nke Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ ihe ụmụ mmadụ na-apụghị ime ma ọlị. Ịchịisi ya n’ụwa a ga-akwụsị ruo ebighị ebi.—Ndị Rom 16:20; 2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19.

18 Rịba ama na ọchịchị eluigwe ahụ ga-etipịasị ụdị nile nke ịchịisi mmadụ. A gaghị ahapụrụ ụmụ mmadụ ọchịchị nke ụwa a. N’eluigwe, ndị mejupụtara Alaeze Chineke ga-achịkwa ihe nile na-eme n’ụwa maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 5:10; 20:4-6) N’elu ụwa, ndị mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-eme ihe kwekọrọ n’okwu ntụzi nke Alaeze Chineke. Nke a bụ ịchịisi ahụ Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya mgbe ọ sịrị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.

19, 20. (a) Olee otú Bible si akọwa ndokwa Alaeze ahụ? (b) Gịnị ka ịchịisi ya ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ?

19 Ndịàmà Jehova na-etinye okwukwe ha n’Alaeze Chineke. Ọ bụ “eluigwe ọhụrụ” nke Pita onyeozi dere banyere ya, sị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) “Ụwa ọhụrụ” ahụ bụ ọha ụmụ mmadụ ọhụrụ nke eluigwe ọhụrụ ahụ, bụ́ Alaeze Chineke, ga-achị. Nke a bụ ndokwa Chineke kpugheere Jọn onyeozi n’ọhụụ, bụ́ onye dere, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; . . . [Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:1, 4.

20 Rịba ama na ụwa ọhụrụ ahụ ga-abụ nke ezi omume. Otu ihe Chineke ga-eme, agha Amagedọn, ga-ewepụworị ihe ajọ omume nile. (Mkpughe 16:14, 16) Amụma dị n’Ilu 2:21, 22 kwuru ya otú a: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” Abụ Ọma 37:9 na-ekwekwa nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” Ọ́ gaghị amasị gị ibi n’ụwa ọhụrụ dị otú ahụ?

Nwee Okwukwe ná Nkwa Jehova

21. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee okwukwe ná nkwa Jehova?

21 Ànyị pụrụ inwe okwukwe ná nkwa Jehova? Gee ntị n’ihe ọ na-ekwu site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa: “Chetanụ ihe mbụ nile site na mgbe ebighị ebi gara aga: n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.” Akụkụ ikpeazụ nke amaokwu nke 11 na-asị: “Ekwuwo m, M ga-emekwa ka o mee; ezubewo m, M ga-emekwa ya.” (Aịsaịa 46:9-11) Ee, anyị pụrụ inwe okwukwe na Jehova na nkwa ya nile dị nnọọ ka a ga-asị na nkwa ndị ahụ emezuworị. Bible si otú a ekwu ya: “Okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.”—Ndị Hibru 11:1.

22. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova ga-emezu nkwa ya nile?

22 Ndị dị umeala n’obi na-egosipụta okwukwe dị otú ahụ n’ihi na ha maara na Chineke ga-emezu nkwa ya nile. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 37:29, anyị na-agụ, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Ànyị pụrụ ikwere nke a? Ee, n’ihi na Ndị Hibru 6:18 na-asị: “Chineke [apụghị] ikwu okwu ụgha.” Ọ̀ bụ Chineke nwe ụwa, nke na ọ pụrụ inye ya ndị dị umeala n’obi? Mkpughe 4:11 na-ekwupụta, sị: “Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” N’ihi ya, Abụ Ọma 24:1 na-asị: “Jehova nwe ụwa na ùjú ya.” Jehova kere ụwa, nwere ya, ma na-enye ya ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Iji nye aka iwulite obi ike anyị na nke a, isiokwu na-esonụ ga-egosi otú Jehova siworo mezuoro ndị ya nkwa ya n’oge ndị gara aga nakwa n’oge anyị na ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike zuru ezu na ọ ga-eme otú ahụ n’ọdịnihu.

Isi Ihe Maka Ntụleghachi

◻ Gịnị meworo olileanya ụmụ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme dum?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eji elegara ụmụ mmadụ anya maka ọdịnihu ka mma?

◻ Gịnị bụ uche Chineke banyere ọdịnihu?

◻ Gịnị mere anyị ji nwee obi ike na Chineke ga-emezu nkwa ya nile?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla . . . nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Bọmbụ: Foto U.S. National Archives; ụmụaka agụụ na-agụgbu: WHO/OXFAM; ndị gbara ọsọ ndụ: UN PHOTO 186763/J. Isaac; Mussolini na Hitler: Foto U.S. National Archives

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya