Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/15 p. 6-8
  • Ụwa—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dịrị n’Ebe A?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dịrị n’Ebe A?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
  • A Kwụsịtụrụ Nzube Chineke, A Gbanweghị Ya
  • Ò Nwere Mgbe A Ga-ebibi Ụwa Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ndụ Nwere Nzube Dị Ebube
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke?
    Teta!—1999
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/15 p. 6-8

Ụwa—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dịrị n’Ebe A?

E nwere otu ajụjụ i kwesịrị ịtụle: Ọ̀ bụ Onye Okike nwere ọgụgụ isi nke nwere nzube maka ụwa na mmadụ ndị nọ n’ime ya, kere mbara ụwa anyị mara mma? Idozi okwu ahụ n’ụzọ ga-eju gị afọ pụrụ inyere gị aka ịhụ ihe ọdịnihu mbara ụwa anyị ga-abụ.

ỌTỤTỤ ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ ndị mụrụ ihe banyere eluigwe na ala na ụwa anyị nke ọma a hụwo ihe àmà nke na-egosi ịdị adị nke Onye Okike, na Chineke na-akwado ya. Tụlee okwu sitere n’ọnụ otu onye nanị:

Prọfesọ Paul Davies na-ede n’akwụkwọ bụ́ The Mind of God, sị: “Ịdị adị nke eluigwe na ala dị n’usoro, nwere njikọ, nke nwere ihe owuwu ndị kwụsiri ike, a haziri ahazi, nke gbara gharịị, chọrọ iwu na ọnọdụ ndị pụrụ nnọọ iche.”

Mgbe o kwusịrị banyere “ndabakọ” ole na ole nke ndị ọkà mmụta nnyocha mbara igwe na ndị ọzọ rịbaworo ama, Prọfesọ Davies gbakwụnyere, sị: “N’ịchịkọta ha ọnụ, ha na-enye ihe àmà na-akpali akpali na ndụ dị ka anyị maara ya na-adabere nnọọ ná mmetụta dị ngwa n’ọdịdị nke iwu physics, na n’ụfọdụ ihe ndị yiri ka ọ bụ ihe ọghọm ndị bịara na mberede ná ngụkọ bụ́ ezie nke ndị mmadụ họrọwooro maka ịdị arọ nke ụmụ irighiri ihe dị iche iche, ikike mmetụta, na ihe ndị ọzọ. . . . O zuru ezu ịsị na, ọ bụrụ na anyị pụrụ ime òkè Chineke, ma họrọ ngụkọ maka ọ̀tụ̀tụ̀ nke e mere na mberede site n’ịpịgharị usoro bọtịn dị iche iche, anyị ga-achọpụta na ọ fọdụrụ nke nta ka ọ bụrụ na nhazi bọtịn nile ga-eme ka eluigwe na ala bụrụ ebe a na-apụghị ibi ebi. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ na-eyi ka a ga-asị na a ghaghị ịpịgharị bọtịn dị iche iche ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ziri nnọọ ezi ma ọ bụrụ na eluigwe na ala ga-adị n’ụdị nke na ndụ ga-aga nke ọma na ya. . . . Eziokwu bụ́ na ọbụna mgbanwe dị nta n’otú ihe dị pụrụ ime ka eluigwe na ala bụrụ nke a na-agaghị ahụ anya, bụ n’ezie eziokwu dị mkpa nke ukwuu.”

Ihe ọ pụtara nye ọtụtụ ndị bụ na ọ bụ Onye Okike nwere nzube kere ụwa anyị, tinyere akụkụ ndị ọzọ nke eluigwe na ala. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ọ dị anyị mkpa ịchọpụta ihe mere o ji meedị ụwa. Ọ dịkwa anyị mkpa ịchọpụta, ma ọ bụrụ na anyị pụrụ, ihe bụ nzube ya maka ụwa. N’ihe banyere nke a, ihe a na-adịghị ahụkebe na-adapụta. N’agbanyeghị ekweghị na Chineke nke na-ewu ewu n’ebe nile, ọnụ ọgụgụ dị ịtụnanya nke ụmụ mmadụ ka kwenyesiri ike n’Onye Okike nke nwere ọgụgụ isi. Ihe ka ọtụtụ na chọọchị Krisendọm na-ekwu nanị n’ọnụ banyere Chineke pụrụ ime ihe nile na Onye Okike nke eluigwe na ala anyị. Ma, nke ọ bụla n’ime okpukpe ndị a adịghị ekwukebe n’obi ike na nkwenye siri ike banyere ọdịnihu ụwa ná nzube Chineke.

Gịnị Ka Bible Na-ekwu?

Ọ bụ ihe ezi izu dị na ya ilegara isi iyi nke ihe ọmụma anya bụ́ nke a nakweere n’ebe nile dị ka ihe si n’aka Onye Okike. Isi iyi ahụ bụ Bible. Otu n’ime okwu ya kasị mfe ma kasị doo anya banyere ọdịnihu nke ụwa anyị dị n’Eklisiastis 1:4. Anyị na-agụ: “Otu ọgbọ na-agabiga, ọgbọ ọzọ abịakwa: ma ụwa na-anọgidesi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (King James Version) Bible kapịrị okwu ọnụ n’ịkọwa ihe mere Jehova Chineke ji kee ụwa. Ọ na-egosikwa na o dotere ya n’ọnọdụ ziri nnọọ ezi n’eluigwe na ala nakwa n’agbata ya na anyanwụ anyị iji kwado ndụ dị n’ime ya. Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile nyere onye amụma oge ochie ahụ bụ́ Aịsaịa ike mmụọ nsọ ide, sị: “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya: Mụ onwe m bụ Jehova; ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị.”—Aịsaịa 45:18.

Ma gịnị banyere mmepụta mmadụ na-emepụta ụzọ ọ ga-esi mebie ndụ nile n’ụwa? N’amamihe ya na-enweghị atụ, Chineke na-ekwu na ya ga-eme ihe tupu ihe a kpọrọ mmadụ enwee ike imebi ndụ nile na mbara ụwa anyị. Rịba nkwa nke a na-emesi obi ike dị n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe ama: “Mba nile wee wee iwe, iwe Gị wee bịa, ya na oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na inye ndị ohu Gị, bụ́ ndị amụma, na ndị nsọ, na ndị na-atụ egwu aha Gị, ndị nta na ndị ukwu, ụgwọ ọrụ ha; na imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:18.

Jehova na-ekpughere anyị ihe bụ nzube mbụ ya n’ike ụwa, ọla a dị na mbara igwe, dị ka otu onye na-aga na mbara igwe na-agba ụwa gburugburu si kọwaa ya. Chineke zubere ya ịbụ paradaịs zuru ụwa ọnụ, nke ụmụ mmadụ bi ná ntụsara ahụ—ndị nwoke na ndị nwanyị—ha nile na-ebi n’udo na n’ịdị n’otu. Ọ haziri imejupụta mbara ụwa nke nta nke nta site n’ikwe ka mmadụ abụọ mbụ ahụ mụọ ụmụ. Maka ihe ụtọ na ọṅụ nke di na nwunye mbụ ahụ, Jehova emewo ka otu akụkụ dị nta nke ụwa bụrụ paradaịs. Ka ọmụmụ nke ezinụlọ mmadụ ga-aga n’ihu n’ọtụtụ afọ na n’ọtụtụ narị afọ, a ga-eji nke nta nke nta gbasapụ ogige Iden ahụ ruo mgbe e mezuru Jenesis 1:28: “Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.”

Ka anyị na-ahụ ugbu a ọnọdụ ọjọọ nke ụwa na ndị bi n’ime ya, ọ̀ pụtara na nzube mbụ nke Chineke akụwo afọ n’ala? Ka ọ̀ gbanwewo nzube ya ma kpebie na n’ihi ajọ omume nke ihe a kpọrọ mmadụ, na ya ga-ahapụ ka e bibie mbara ụwa kpam kpam ma malite ọzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya? Ee e, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ dịghị nke ọ bụla n’ọnọdụ ndị a bụ eziokwu. Bible na-agwa anyị na ihe ọ bụla Jehova zubere ga-emesịrịrị were ọnọdụ, na onye ọ bụla ma ọ bụ ọbụna ihe omume nke a na-atụghị anya ya apụghị ịgbagha ihe ọ bụla o kpebiri. Ọ na-emesi anyị obi ike, sị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.

A Kwụsịtụrụ Nzube Chineke, A Gbanweghị Ya

N’ihi nnupụisi nke Adam na Iv na nchụpụ a chụpụrụ ha site n’ogige Iden, o doro anya na a ga-emezu nzube Chineke maka ụwa paradaịs ma ha anọghị ya. Otú ọ dị, Jehova gosiri n’ebe ahụ na ụfọdụ n’ime ụmụ ha ga-emezu iwu mbụ ya. N’ezie, nke a ga-ewe oge, ọbụna ọtụtụ narị afọ, ma e nweghị ihe na-egosi oge ole ọ gaara ewe imezu iwu mbụ ahụ ma ọ bụrụgodị na ma Adam ma Iv nọgidere na-ebi ndụ n’izu okè. Eziokwu bụ na ka ọ na-erule njedebe nke Ọchịchị Narị Afọ Iri Jisọs Kraịst—nke jiri ihe nta karịa otu puku afọ site ugbu a—ọnọdụ Paradaịs Iden ga-agbasaru ụwa nile, mbara Ụwa ga-ejupụtakwa n’ụmụ udo na obi ụtọ ndị sitere ná mmadụ abụọ mbụ ahụ. N’ezie, a ga-ewepụ ike Jehova dị ka Onye Nzube na-apụghị ịda ada n’ụta ruo mgbe ebighị ebi!

Mgbe ahụ a ga-emezu amụma ndị na-akpali akpali ndị Chineke mere ka e dee n’ike mmụọ nsọ n’ogologo oge gara aga. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Aịsaịa 11:6-9 ga-emezu n’ụzọ dị ebube: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha. Nne ehi na anụ ọhịa bear ga-atakọkwa nri; ụmụ ha ga-amakpukọ: ọdụm ga-atakwa okporo ọka dị ka ehi. Nwa na-aṅụ ara ga-egwurikwa egwu n’elu ọnụ ajụala nọ, ọ bụkwa anya ubí ka nwa e mere ka [ọ] hapụ ara ga-atụkwasị aka ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”

Ahụ esighị ike na nrịanrịa ndị na-egbu mmadụ ga-abụ ihe gara aga, dị ka ọnwụ n’onwe ya. È nwere ihe ọ bụla pụrụ ido anya karịa okwu ndị a dị mfe a na-achọta n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible? “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

N’ezie, anyị pụrụ imesi onwe anyị obi ike—mbara Ụwa anyị mara mma ga-adịgide. Ka ọ bụrụ ihe ùgwù gị ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ a, ya na omume ya nile na-emebi ụwa. Ụwa ọhụrụ dị ọcha nke Chineke ga-eme dị nso ugbu a. Ọtụtụ ndị a hụrụ n’anya ga-ebilite n’ọnwụ site n’ọrụ ebube nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ee, ụwa anyị ga-adịgide, anyị pụrụ isokwa ya dịgide ma nụ ụtọ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya