Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 9/15 p. 28-31
  • Nsụgharị Bible nke Gbanwere Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsụgharị Bible nke Gbanwere Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Nsụgharị Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ?
  • Jefet Ọ̀ Nọ n’Ụlọikwuu Shem?
  • Ndị Na-eso Ụzọ Ndị Juu na Ndị Na-atụ Egwu Chineke
  • Septuagint Nyere Aka Idozi Ụzọ
  • Septuagint Atụfuo Ikike Ya nke ‘Isite n’Ike Mmụọ Nsọ’
  • “Septuagint”—Ọ Bara Uru n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị Kraịst Oge Gboo n’Oge A Na-asụ Asụsụ Grik n’Ọtụtụ Ebe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọ̀ Dị Mkpa Ka Ị Mụọ Hibru na Grik?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gịnị Mere E Ji Nwee Baịbụl Dị Iche Iche?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 9/15 p. 28-31

Nsụgharị Bible nke Gbanwere Ụwa

Mgbe onye amụma Chineke bụ́ Mosis malitere ide Bible n’ihe karịrị afọ 3,500 gara aga, nanị otu mba dị nta pụrụ ịgụ ya. (Deuterọnọmi 7:7) Ọ dị otú ahụ n’ihi na Akwụkwọ Nsọ dị nanị n’asụsụ Hibru mbụ nke mba ahụ. Otú ọ dị, nke ahụ ga-agbanwe ka oge na-aga.

MGBASA nke ozi Bible na mmetụta ọma o nwere ruo ọtụtụ narị afọ bụ n’ụzọ dị ukwuu ihe nsụgharị mbụ ya—Septuagint—rụpụtara. N’ihi gịnị ka e ji mepụta ya? À pụkwara ikwu n’ụzọ ziri ezi na nke a bụ Bible nke gbanwere ụwa?

Ọ̀ Bụ Nsụgharị Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ?

Mgbe a dọrọsịịrị ha n’agha laa Babilọn na narị afọ nke asaa na nke isii T.O.A., ọtụtụ ndị Juu alọtaghị n’ala Israel na Juda oge ochie. Hibru ghọrọ asụsụ nke abụọ nye ndị Juu a mụrụ ná ndọrọ n’agha. Ka ọ na-erule narị afọ nke atọ T.O.A., e nwere ógbè ndị Juu n’Alexandria, Egypt—ebe bụ́ isi nke ọdịbendị Alaeze Ukwu Gris. Ndị Juu ahụ hụrụ uru nke ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ gaa na Grik, nke bụ asụsụ ala ha mgbe ahụ.

Ruo oge ahụ, e dekọwo ozi Bible sitere n’ike mmụọ nsọ n’asụsụ Hibru, na-enwe akụkụ ndị dị nta e dere n’Aramaic ya na ya yiri nnọọ. Ikwu Okwu Chineke n’asụsụ dị iche ọ̀ ga-ebelata mmetụta dị ike nke ya isite n’ike mmụọ nsọ Chineke, ikekwe ọbụna na-eduga ná nkọwahie? Ndị Juu, bụ́ ndị e nyefeworo Okwu a sitere n’ike mmụọ nsọ, hà pụrụ itinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke imerụ ozi ahụ site ná nsụgharị?—Abụ Ọma 147:19, 20; Ndị Rom 3:1, 2.

Okwu ndị a chọrọ nlezianya kpatara ụjọ. Ma, nchegbu na ndị Juu agaghịzi aghọta Okwu Chineke mesịrị karịa echiche ndị ọzọ. E mere mkpebi imepụta nsụgharị Grik nke Torah—akwụkwọ ise mbụ nke Bible, bụ́ ndị Mosis dere. Usoro nsụgharị ahụ kpọmkwem bụ nke akụkọ mgbe ochie kpuchiri. Dị ka Letter of Aristeas si kwuo, onye ọchịchị Ijipt bụ́ Ptolemy nke Abụọ (285-246 T.O.A.) chọrọ otu Pentateuch (ma ọ bụ, Torah) nke a sụgharịrị gaa na Grik maka ọ́bá akwụkwọ eze ya. O nyere ndị ọkà mmụta Juu 72 ọrụ, bụ́ ndị si Israel bịa n’Ijipt ma mezuo nsụgharị ahụ n’ụbọchị 72. A gụziiri ndị Juu nsụgharị a, bụ́ ndị kwuru na ọ mara mma, ziekwa ezi. Nnu e tinyetụrụ n’akụkọ a mesịrị zọrọ na e debere onye nsụgharị nke ọ bụla n’ọnụ ụlọ dị iche, ma nsụgharị ha yiri ibe ha, ọ dịghị ọbụna otu mkpụrụ akwụkwọ dị iche. N’ihi ọdịnala banyere ndị nsụgharị 72, nsụgharị Bible Grik a bịara bụrụ nke a maara dị ka Septuagint, nke dabeere n’okwu Latin nke pụtara “Iri Asaa.”

Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ọkà mmụta nke oge a kwere na Letter of Aristeas bụ ihe odide apọkrịfa. Ha kwekwara na ọ bụghị Ptolemy nke Abụọ, kama ọ bụ ndị ndú nke ndị Juu nọ n’Alexandria kwuru ka e mee nsụgharị ahụ. Ma ihe odide nke onye ọkà ihe ọmụma Alexandria bụ́ onye Juu bụ́ Philo na onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus nakwa Talmud gosipụtachara nkwenkwe e nwere n’etiti ndị Juu nke narị afọ mbụ bụ́ na Septuagint sitere n’ike mmụọ nsọ dịkwa ka Akwụkwọ Nsọ ndị mbụ. Obi abụọ adịghị ya na ọdịnala ndị dị otú ahụ sitere ná mgbalị e mere ime ka ndị Juu nakwere Septuagint n’ụwa nile.

Ọ bụ ezie na nsụgharị mbụ ya gụnyere nanị akwụkwọ ise nke Mosis, aha ahụ bụ́ Septuagint na-ezozi aka n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum a sụgharịrị gaa na Grik. A sụgharịrị akwụkwọ ndị fọdụrụ ruo otu narị afọ ọzọ ma ọ bụ ihe yiri ya. Kama ịbụ mgbalị e mekọrọ ọnụ, mmepụta nke Septuagint dum bụ nrụzu e mere ná mkpirisi ná mkpirisi. Ndị nsụgharị ahụ nwere ikike na ihe ọmụma dịgasị iche nke asụsụ Hibru. A sụgharịrị ihe ka ọtụtụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ n’ụzọ nkịtị, mgbe ụfọdụ na-eme otú ahụ gabiga ókè, ebe nsụgharị ndị ọzọ na-adịghị nnọọ otú ahụ. E nwere ole na ole ndị nwere ma nsụgharị dị ogologo ma nke dị mkpụmkpụ. Ka ọ na-erule ngwụsị nke narị afọ nke abụọ T.O.A., a pụrụ ịgụ akwụkwọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik. N’agbanyeghị ihe ndị dịgasị iche ọ rụpụtara, mmetụta e nwere maka ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik gabigara nnọọ ihe ndị nsụgharị ahụ pụrụ ịtụworị anya ya.

Jefet Ọ̀ Nọ n’Ụlọikwuu Shem?

N’ikwu banyere Septuagint, Talmud hotara Jenesis 9:27: “Ka . . . Jefet . . . biri n’ụlọikwuu nile nke Shem.” (Megillah 9b, Talmud nke Babilọn) Talmud ji ụzọ ihe atụ na-egosi na site n’ịma mma nke asụsụ Grik nke Septuagint, Jefet (nna Jevan, bụ́ onye ndị Gris sitere n’agbụrụ ya) biri n’ụlọikwuu Shem (nna nna nke mba Israel). Otú ọ dị, a pụkwara ikwu na site na Septuagint, Shem biri n’ụlọikwuu Jefet. N’ụzọ dị aṅaa?

Mgbe mmeri ndị Alexander Onye Ukwu meriri gasịrị, ná ngwụsị nke narị afọ nke anọ T.O.A., e mere mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ ịgbasapụ asụsụ na ọdịbendị ndị Gris n’ala nile ndị ahụ e meriri emeri. A kpọrọ ụkpụrụ ime ihe a Ime Ka A Nakwere Ọdịbendị Ndị Gris. Ndị Juu nwere mmetụta nke ịbụ ndị nọ ná mwakpo mgbe dum n’ụzọ ọdịbendị. Ọ bụrụ na ọdịbendị na nkà ihe ọmụma ndị Gris adịgide, okpukpe ndị Juu ga-abụ nke e mebiri. Gịnị pụrụ ịkwụsị mgbasa nke mwakpo a?

Banyere otu ihe pụrụ ịbụ ebumnobi ndị Juu n’ịsụgharị Septuagint, onye Juu bụ́ onye nsụgharị Bible bụ́ Max Margolis na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekwere na ọ bụ ndị Juu tụpụtara echiche ahụ, ọ ghaghị inweworị ebumnobi ọzọ, ya bụ, ime ka Iwu ndị Juu ruo ndị Jentaịl aka na ime ka ụwa kweta na ndị Juu nwere ọdịbendị nke mara amamihe ndị Hellas [Gris] aka.” Ime ka Akwụkwọ Nsọ Hibru ruo ndị na-asụ Grik aka pụziri ịbụ ụdị nke ma ịzọ onwe onye ma imeghachi mwakpo.

Ụkpụrụ ime ihe Alexander nke Ime Ka A Nakwere Ọdịbendị Ndị Gris emewo Grik asụsụ mba nile nke ụwa. Ọbụna mgbe ndị Rom weghaara alaeze ya, asụsụ Grik a na-asụ n’oge ahụ (ma ọ bụ, Koine) bụgidere asụsụ nzụrịta ahịa na nke nkwurịta okwu n’etiti mba na mba. Ma nke a ò sitere ná mgbalị a ma ụma mee ma ò mere n’onwe ya, nsụgharị Septuagint nke Akwụkwọ Nsọ Hibru bara ngwa ngwa n’ebe obibi na n’obi ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu bụ́ ndị na-amabughị Chineke na Iwu ndị Juu. Ihe ndị ọ rụpụtara na-eju anya.

Ndị Na-eso Ụzọ Ndị Juu na Ndị Na-atụ Egwu Chineke

Ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., Philo pụrụ ide na “ịma mma na ùgwù nke ime iwu Mosis bụ nke a na-akwanyere ùgwù ọ bụghị nanị n’etiti ndị Juu, kamakwa n’etiti mba nile ndị ọzọ.” Banyere ndị Juu na-ebighị na Palestine na narị afọ mbụ, onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Joseph Klausner na-asị: “Ọ rara ahụ ikweta na ọtụtụ nde ndị Juu a nile bụ ndị si nanị n’obere Palestine. Mmadụ apụghị ịgọpụ na mmụba a dị ukwuu gụnyekwara ma ndị ikom ma ndị inyom na-eso ụzọ ndị Juu n’ọnụ ọgụgụ buru ibu.”

Otú ọ dị, isi ihe ndị a na-akpali akpali emeghị ka a matachaa ihe nile. Onye edemede bụ́ Shaye J. D. Cohen, bụ́ prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme nke ndị Juu, na-ekwu, sị: “A tọghatara ọtụtụ ndị Jentaịl, ma ndị ikom ma ndị inyom, gaa n’okpukpe ndị Juu na narị afọ ndị ikpeazụ T.O.A. nakwa na narị afọ abụọ mbụ O.A. Otú ọ dị, ọbụna ndị ka ọtụtụ bụ ndị Jentaịl nabatara akụkụ ụfọdụ nke okpukpe ndị Juu ma ghara ichegharị gaa na ya.” Ma Klausner ma Cohen na-ezo aka ná ndị a na-echegharịghị dị ka ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ okwu nke na-apụtakarị n’ihe odide ndị Gris nke oge ahụ.

Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti onye na-eso ụzọ ndị Juu na onye na-atụ egwu Chineke? Ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ ndị a tọghatara n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị e weere dị ka ndị Juu n’echiche nile n’ihi na ha nakweere Chineke nke Israel (na-ajụ chi ndị ọzọ nile), bie úgwù, ma sonyere mba Israel. N’ụzọ dị iche, Cohen na-ekwu banyere ndị na-atụ egwu Chineke, sị: “Ọ bụ ezie na ndị Jentaịl a na-eme ọtụtụ ihe omume ndị Juu ma sọpụrụ Chineke ndị Juu n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, ha ewereghị onwe ha dị ka ndị Juu, ndị ọzọ eleghịkwa ha anya dị ka ndị Juu.” Klausner na-akọwa ha dị ka “ndị nọ n’etiti,” n’ihi na ha nakweere okpukpe ndị Juu, ma “mee otu akụkụ nke omenala ya, ma . . . ghara ịghọ ndị Juu kpam kpam.”

Ikekwe ụfọdụ ghọrọ ndị nwere mmasị n’ebe Chineke nọ n’ihi nkwurịta okwu ha so ndị Juu ndị nọ n’ọrụ ozi ala ọzọ nwee ma ọ bụ site n’ịhụ otú ha si dị iche n’omume, n’omenala, nakwa n’akparamagwa. Ma, Septuagint bụ ngwá ọrụ bụ́ isi na-enyere ndị a na-atụ egwu Chineke aka ịmụta banyere Jehova Chineke. Ọ bụ ezie na ọ dịghị otú a ga-esi mata ihe bụ kpọmkwem ọnụ ọgụgụ nke ndị na-atụ egwu Chineke na narị afọ mbụ, obi abụọ adịghị ya na Septuagint gbasara ihe ọmụma ụfọdụ banyere Chineke n’Alaeze Ukwu Rom dum. E jikwa Septuagint na-atọ ntọala dị mkpa.

Septuagint Nyere Aka Idozi Ụzọ

Septuagint keere òkè n’ụzọ pụtara ìhè n’ịgbasa ozi nke Iso Ụzọ Kraịst. Ọtụtụ ndị Juu na-asụ Grik so ná ndị nọ ná nguzobe nke ọgbakọ ndị Kraịst na Pentikọst 33 O.A. Ndị na-eso ụzọ ndị Juu sokwa n’etiti ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst ná mmalite ahụ. (Ọrụ 2:5-11; 6:1-6; 8:26-38) Ebe ọ bụ na e zubere ka ihe odide ndị sitere n’ike mmụọ nsọ nke ndị ozi Jisọs na nke ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ ruo ọtụtụ ndị aka ruo ókè o kwere mee, e deturu ha n’asụsụ Grik.a Ya mere, ọtụtụ nhota ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị na-apụta n’Akwụkwọ Nsọ Grik dabeere na Septuagint.

Ndị ọzọ ma e wezụga ndị Juu anụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ndị Juu dị njikere ịnakwere ozi Alaeze ahụ. Onye Jentaịl bụ́ Kọniliọs bụ “onye na-asọpụrụ Chineke, onye ya na ezinụlọ ya nile na-atụkwa egwu Chineke, onye na-arụ ọtụtụ ọrụ ebere nye ndị Juu, na-ekpekwara Chineke ekpere mgbe nile.” Na 36 O.A., Kọniliọs, ezinụlọ ya, na ndị ọzọ gbakọtara n’ụlọ ya bụ ndị Jentaịl mbụ e mere baptism dị ka ụmụazụ Kraịst. (Ọrụ 10:1, 2, 24, 44-48; tụlee Luk 7:2-10.) Mgbe Pọl onyeozi mere njem n’Asia Minor na Gris dum, o kwusaara ọtụtụ ndị Jentaịl ozi ọma bụ́ ndị na-atụbu egwu Chineke nakwa “ndị Grik ndị na-atụ egwu Chineke.” (Ọrụ 13:16, 26; 17:4) N’ihi gịnị ka Kọniliọs na ndị Jentaịl ọzọ ahụ ji dị njikere ịnakwere ozi ọma ahụ? Septuagint enyewo aka idozi ụzọ. Otu ọkà mmụta na-atụ aro na Septuagint “bụ akwụkwọ dị nnọọ mkpa nke na e wezụga ya ma Krisendọm ma ọdịbendị ebe ọdịda anyanwụ ga-abụ ihe a na-apụghị ịghọta aghọta.”

Septuagint Atụfuo Ikike Ya nke ‘Isite n’Ike Mmụọ Nsọ’

Ojiji sara mbara e ji Septuagint mee ihe mesịrị kpata ọgba aghara n’etiti ndị Juu. Dị ka ihe atụ, ná nkwurịta okwu ha na ndị Kraịst, ndị Juu zọọrọ na Septuagint bụ nsụgharị a sụgharịhiere asụgharịhie. Ka ọ na-erule narị afọ nke abụọ O.A., ndị Juu ajụwo nsụgharị ahụ kpam kpam bụ́ nke ha toburu na o sitere n’ike mmụọ nsọ. Ndị rabaị jụrụ akụkọ mgbe ochie nke ndị nsụgharị 72 ahụ, na-ekwu, sị: “N’otu oge ndị okenye ise dere Torah nye Eze Ptolemy n’asụsụ Grik, ụbọchị ahụ bụkwa nke rụrụ arụ nye Israel dị ka ụbọchị ahụ e mere nwa ehi ọlaedo ahụ, ebe ọ bụ na a pụghị ịsụgharị Torah n’ụzọ ziri ezi.” Iji mee ka e kweresie echiche ndị rabaị ike, ndị rabaị nyere iwu ka e mee nsụgharị ọhụrụ gaa na Grik. Otu onye na-eso ụzọ ndị Juu aha ya bụ Aquila, bụ́ onye na-eso ụzọ onye rabaị bụ́ Akiba, sụgharịrị ya na narị afọ nke abụọ O.A.

Ndị Juu kwụsịrị iji Septuagint eme ihe, kama ọ ghọrọ “Agba Ochie” bụ́ isi nke Chọọchị Katọlik na-apụta apụta ruo mgbe Vulgate Latin nke Jerome nọchiri ya. Ọ bụ ezie na nsụgharị ọ bụla apụghị ịnọchi anya nke mbụ ahụ, Septuagint rụrụ ọrụ dị mkpa n’ịgbasa ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Alaeze ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst. N’ezie, Septuagint bụ nsụgharị Bible nke gbanwere ụwa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A pụrụ ibuwo ụzọ dee Oziọma Matiu n’asụsụ Hibru, na-enwe nsụgharị e dere na Grik mgbe e mesịrị.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ọtụtụ ndị Pọl meere nkwusa ghọtara “Septuagint”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Site n’aka Israel Antiquities Authority

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya