Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 1/1 p. 14-15
  • Ànyị Kwesịrị Ikpegara Jizọs Ekpere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ànyị Kwesịrị Ikpegara Jizọs Ekpere?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ÒNYE KA JIZỌS KỤZIIRI ANYỊ KA ANYỊ NA-EKPEGARA EKPERE?
  • ÒNYE KA NDỊ MBỤ SORO ỤZỌ JIZỌS KPEGAARA EKPERE?
  • Banyere Ekpere Chineke Na-anụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ì Kwesịrị Ikpegara Jisọs Ekpere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 1/1 p. 14-15

Ànyị Kwesịrị Ikpegara Jizọs Ekpere?

N’OGE na-adịbeghị anya, otu onye na-eme nchọpụta jụrụ ihe karịrị narị ndị na-eto eto asatọ si na chọọchị dị iche iche ajụjụ. Ihe o dere n’akwụkwọ o ji jụọ ha ajụjụ bụ: “Jizọs na-aza ekpere.” Ọ jụziri ha ma hà kwetara ihe ahụ o dere ka ọ̀ bụ na ha ekwetaghị. E kee ndị na-eto eto ahụ ụzọ iri, ụzọ isii n’ime ha sịrị na ha kwetasiri ike na Jizọs na-aza ekpere. Ma, otu n’ime ha kagburu Jizọs, dee ya “Chineke.”

Olee ihe gịnwa chere? Ọ̀ bụ Jizọs ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere ka ọ̀ bụ Chineke?a Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-ekpe ekpere, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị mata azịza ajụjụ a.

ÒNYE KA JIZỌS KỤZIIRI ANYỊ KA ANYỊ NA-EKPEGARA EKPERE?

Jizọs kụziiri anyị ma sikwa n’ekpere ya gosi anyị onye anyị kwesịrị ịna-ekpegara ekpere.

Ebe Jizọs na-ekpegara Nna ya ekpere[Foto dị na peeji nke 14, na nke 15]

Ebe Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere, ọ chọkwara ka mmadụ niile na-ekpegara Nna ya ekpere

IHE JIZỌS KỤZIRI: E nwere mgbe otu onye na-eso ụzọ Jizọs gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” Jizọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, ‘Nna.’” (Luk 11:1, 2) Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ gwakwara ndị na-ege ya ntị ka ha na-ekpe ekpere. Ọ sịrị ha: “Kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere.” Jizọs gwakwara ha ihe mere ka obi sie ha ike. Ọ sịrị ha: “Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.” (Matiu 6:6, 8) N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.” (Jọn 16:23) N’eziokwu, Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpegara Jehova Chineke, bụ́ Nna ya na Nna anyị, ekpere.—Jọn 20:17.

IHE EKPERE YA GOSIRI ANYỊ: Jizọs kpekwara ekpere otú ahụ ọ gwara ndị ọzọ ka ha si na-ekpe. O kpere ekpere, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe n’ụwa, ana m enye gị otutu n’ihu ọha.” (Luk 10:21) N’oge ọzọ Jizọs kpere ekpere, o “leliri anya n’eluigwe wee sị: ‘Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m.’” (Jọn 11:41) Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, o kpere ekpere, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” (Luk 23:46) Ebe Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe bụ́ “Onyenwe eluigwe na ụwa” ekpere, ọ chọkwara ka mmadụ niile na-ekpegara Nna ya ekpere. (Matiu 11:25; 26:41, 42; 1 Jọn 2:6) Ma, ndị mbụ soro ụzọ Jizọs hà ghọtara na ọ bụ Chineke ka e kwesịrị ikpegara ekpere?

ÒNYE KA NDỊ MBỤ SORO ỤZỌ JIZỌS KPEGAARA EKPERE?

Izu ole na ole Jizọs laghachichara n’eluigwe, ndị na-achọghị iji ntị anụ gbasara Jizọs yiri ndị na-eso ụzọ ya egwu ma kpagbuo ha. (Ọrụ Ndịozi 4:18) Ndị na-eso ụzọ Jizọs kpere ekpere ozugbo. Ma, ònye ka ha kpegaara ya? Baịbụl kwuru na “ha ji otu obi gwa Chineke” okwu n’ekpere, rịọ ya ka o nyere ha aka ‘n’aha ohu ya dị nsọ bụ́ Jizọs.’ (Ọrụ Ndịozi 4:24, 30) N’eziokwu, ndị na-eso ụzọ Jizọs kpere ekpere otú ọ gwara ha ka ha si na-ekpe ya. Ha kpegaara Chineke ekpere, ọ bụghị Jizọs.

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl onyeozi kwuru otú ya na Ndị Kraịst ibe ya si kpee ekpere. N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya, ọ sịrị: “Anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst oge niile mgbe anyị na-ekpe ekpere maka unu.” (Ndị Kọlọsi 1:3) Pọl degakwaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, gwa ha ka ha “na-ekele Chineke bụ́ Nna anyị mgbe niile maka ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (Ndị Efesọs 5:20) Ihe ndị a Pọl dere gosiri na ọ gbara ndị ọzọ ume ka ha na-ekpegara “Chineke bụ́ Nna anyị” ekpere “mgbe niile” maka ihe niile. Ma, o doro anya na ọ bụ n’aha Jizọs ka o kpere ekpere niile ahụ.—Ndị Kọlọsi 3:17.

Anyị ga-egosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya ma anyị na-ekpe ekpere otú ahụ o kwuru ka anyị si na-ekpe. Ọ bụ ihe Ndị Kraịst oge ochie mere. (Jọn 14:15) Ọ bụrụ na anyị ana-ekpegara naanị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ekpere, obi ga-esikwu anyị ike na ọ ga na-aza ekpere anyị otú obi siri otu ọbụ abụ ike. Ọbụ ọbụ ahụ kwuru n’Abụ Ọma 116:1, 2, sị: “Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ olu m . . . M ga-akpọku ya ụbọchị ndụ m niile.”b

a Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na Chineke na Jizọs ahaghị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe dị iche na Chineke na Jizọs, gụọ isi nke 4 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

b Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-anụ ekpere anyị, anyị ga-ejirịrị obi anyị niile na-eme ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere ekpere, gụọ isi nke 17 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Hà Kpegaara Jizọs Ekpere?

Baịbụl kwuru ugboro ole na ole ndị ezi omume ụfọdụ na Jizọs kwurịtara okwu mgbe Jizọs laghachicharala n’eluigwe. Baịbụl kwukwara na e nwere mgbe ndị ezi omume ụfọdụ na ndị mmụọ ozi kwurịtara okwu. (Ọrụ Ndịozi 9:4, 5, 10-16; 10:3, 4; Mkpughe 10:8, 9; 22:20) Ma, ọ̀ bụ ekpere ka ha kpegaara Jizọs na ndị mmụọ ozi ahụ bi n’eluigwe? Mba. N’oge niile ahụ, ọ bụ Jizọs na ndị mmụọ ozi ahụ bu ụzọ gwa ndị ahụ nọ n’ụwa okwu. Ọ bụ naanị Chineke ka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị na-efe Chineke na-ekpegara ekpere.—Ndị Filipaị 4:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya