Rụzuo Ókèala Gị nke Ọma
1 N’ógbè ndị e bi ebi, site n’oge ruo n’oge anyị na-ezute obere ebe azụmahịa, dị ka nnukwu ụlọ ahịa, ụlọ nri, ma ọ bụ obere ụlọ ahịa. Ọ bụrụ na a ga-arụzu ebe ndị a n’otu oge ahụ a na-arụ n’ebe ndị ọzọ n’ókèala a, i kwesịrị ịga ha otú ahụ e si aga n’ebe ndị e bi ebi.
2 Ị pụrụ iji iche ihe n’ihu mmadụ dị mfe, nke dị nkenke eme ihe, ikekwe na-asị: “Enwere m ihe m ga-achọ igosi gị.” Ọ bụrụ na o yiri ka onye nwe ebe ahụ ji ọrụ n’aka n’oge ahụ, i nwere ike inyefe nanị traktị ma kwuo, sị: “M ga-abịa ọzọ mgbe ị na-ejighị ọrụ n’aka nke ukwuu. M ga-achọ ịmata ihe ị na-eche banyere nke a.”
3 Ọ dịghị mkpa inwe nchegbu banyere ịrụ ọrụ a. Otu onye nkwusa kọrọ, sị: “Atụrụ m anya inweta nzaghachi na-adịghị mma. Ma, n’ijuanya m, mmeghachi omume ha gosiri n’ozi Alaeze ahụ dị nnọọ iche na nke ahụ. Ha nwere nnọọ ezi àgwà na omume enyi, n’ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile, ha naara magazin.”
4 Otu nwanyị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-agba mgbere ala na ụlọ kpọbatara Ndịàmà n’ọfịs ya. Ọ naara magazin ma kwupụta mmasị n’inwe ọmụmụ Bible. E gosiri ya akwụkwọ Ihe Ọmụma, a malitekwara ọmụmụ ihe ozugbo ahụ, n’ebe ahụ n’ọfịs ya!
5 Ọrụ nke ịrụzu ókèala gị nke ọma na-agụnye ịkpọtụrụ ndị mmadụ na-achụ nta ego n’agbata obi. (Ọrụ 10:42) Mee atụmatụ ịga n’ọnụ ụzọ ndị a dị nnọọ ka e si aga n’ụlọ nke aka ndị mmadụ. Ọ bụghị nanị na nke a ga-eme ka a rụzuo ókèala gị n’ụzọ ka mma, kama a pụrụ iji ahụmahụ ọma dị iche iche kwụghachi gị ụgwọ ọrụ!