Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1997
Ntụziaka
N’ime afọ 1997, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
AKWỤKWỌ ỌMỤMỤ IHE: Bible, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ [uw-IB], Ụlọ Nche [w-IB], Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi [kl-IB] na Akwukwọm nke Akukọ Bible [my-IB] ga-abụ ebe ndị a ga-esi na-enye ihe omume.
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata wee malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, mgbe ahụ, e wee gaa n’ihu n’usoro nke a [Abụ ndị dị n’akụkụ sitere n’akwụkwọ abụ nke 1966.]:
IHE OMUME NKE 1: minit 15. Onye kwesịrị ime nke a bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ ga-adaberekwa n’akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ ma ọ bụ Ụlọ Nche. Mgbe ọ dabeere n’Ụlọ Nche, a ga-eme ihe omume a dị ka okwu izi ihe ga-ewe minit 15 n’enweghị ajụjụ ọnụ; mgbe ọ dabeere n’akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, a ga-eme ya dị ka okwu izi ihe dị minit 10 ruo 12, nke ajụjụ ọnụ minit 3 ruo 5 ga-esochi, na-eji ajụjụ ndị e depụtara n’akwụkwọ ahụ na-eme ihe. Nzube ya kwesịrị ịbụ, ọ bụghị nanị ikwuzu ihe mmụta ahụ, kamakwa ịdọrọ uche gaa n’abamuru nke ihe mmụta ahụ a na-atụle, na-eme ka ihe ndị ga-akachasị nyere ọgbakọ aka pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu ahụ e gosipụtara mee ihe. A na-agba mmadụ nile ume ibu ụzọ jiri nlezianya mee nkwadebe, nke ga-eme ka ndị na-ege ntị wee rite uru zuru ezu n’ihe mmụta nke a.
Ụmụnna ndị e kenyere okwu nke a kwesịrị iji nlezianya ghara ịgabiga oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ma ọ bụ ọ bụrụ na ọkà okwu ahụ arịọ maka ya.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: minit 6. Onye ga-eme nke a kwesịrị ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, bụ́ onye ga-atụle isiokwu ahụ n’ụzọ dị irè ikwekọ ná mkpa ọgbakọ. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ọgụgụ ahụ e kenyere ka a gụọ. A pụrụ ịgụnye ntụleghachi metụtara ihe nile nke isi Bible ndị e kenyere bụ́ nke ga-ewe sekọnd 30 ruo 60. Otú ọ dị, nzube bụ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere na ụzọ ihe mmụta ahụ si baara anyị uru. Mgbe ahụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwa ndị mmụta ka ha gaa na klas ha dị iche iche.
IHE OMUME NKE 2: minit 5. Nke a bụ ọgụgụ Bible nke ebe e kenyere ka a gụọ, bụ́ nke nwanna nwoke ga-agụ. Otú a ka ọ ga-adị n’ụlọ akwụkwọ nke mbụ na ìgwè ndị ọzọkwa. Ọgụgụ ihe ahụ na-adịkarị nkenke nke na ọ na-enye onye mmụta ahụ ohere ikwu okwu nkọwa dị mkpirikpi ná mmalite na mmechi okwu ya. A pụrụ ịgụnye ihe omume nke akụkọ ihe mere eme, nghọta nke okwu amụma ma ọ bụ ozizi, na ụzọ a pụrụ isi jiri ụkpụrụ mee ihe. E kwesịrị ịgụ amaokwu nile ahụ e kenyere n’enweghị nkwụsịtụ. Otú ọ dị, n’ebe amaokwu ndị a gaje ịgụ na-adịghị n’usoro, onye mmụta ahụ pụrụ ịkpọ amaokwu ebe ọgụgụ ihe ahụ na-aga n’ihu.
IHE OMUME NKE 3: minit 5. A ga-ekenye nwanna nwanyị nke a. Isiokwu nke okwu a ga-adabere n’Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọnọdụ okwu ahụ pụrụ ịbụ nletaghachi ma ọ bụ ọmụmụ Bible ebe obibi, ndị na-eme ya nwekwara ike ịnọdụ ala ma ọ bụ iguzo ọtọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta ahụ si enyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’isiokwu ahụ na ịghọta ya, na n’ụzọ e si jiri akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ mee ihe. Onye mmụta e kenyere okwu a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye otu onye inyeaka, ma a pụrụ iji onye inyeaka ọzọ mee ihe. Onye mmụta ahụ pụrụ ikpebi ma onye nwe ụlọ ọ̀ ga-agụ paragraf ụfọdụ n’akwụkwọ ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị agụ. Ọ bụghị ọnọdụ okwu ahụ kama iji ihe mmụta ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè kwesịrị ka e were ya n’ihe kasị mkpa.
IHE OMUME NKE 4: minit 5. Nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ka a ga-ekenye nke a. Ọ ga-adabere n’Akwukwọm nke Akukọ Bible. Mgbe e kenyere ya nwanna nwoke, nke a kwesịrị ịbụ okwu a ga-agwa ndị dum na-ege ntị. Ọ ga-akachasị mma ma nwanna nwoke ahụ kwadebe okwu ya ahụ na-eburu ndị na-ege ntị n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze n’uche, ka o wee bụrụ okwu nwere nnọọ ihe mmụta, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru n’ezie. Mgbe e kenyere nwanna nwanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya dị ka e nyere ntụziaka maka Ihe Omume nke 3.
NDỤMỌDỤ NA OKWU NDỊ ỌZỌ: Mgbe ihe omume onye mmụta nke ọ bụla gasịrị, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ ga-enye ndụmọdụ pụtara ìhè, ọ dịkarịghị mkpa na a ga-esocha usoro ndụmọdụ e depụtara ná mpempe akwụkwọ Ndụmọdụ Okwu. Kama, o kwesịrị ilekwasị anya n’akụkụ nile ahụ nke dị mkpa ka onye mmụta ahụ meziwanye. Ọ bụrụ na onye mmụta nwere nanị akara “N,” o wee bụrụ na ọ dịghị ọdịdị okwu ọzọ nke a kanyere akara “Ọ” ma ọ bụ “R,” mgbe ahụ onye ndụmọdụ kwesịrị ịka akara gburugburu n’ime igbe ahụ ebe a na-akanye akara “N,” “Ọ,” ma ọ bụ “R,” n’ọdịdị okwu ọzọ nke onye mmụta ahụ kwesịrị ịrụ ọrụ na ya. Ọ ga-agwa onye mmụta ahụ banyere nke a n’uhuruchi ahụ, denyekwa ọdịdị okwu nke a ná mpempe akwụkwọ Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (S-89-IB) nke ọ ga-enye onye mmụta ahụ n’oge ọzọ. O kwesịrị ka ndị ahụ nwere ihe omume nọrọ n’ebe ihu n’ime ụlọ nzukọ ahụ. Nke a ga-eme ka a ghara ịgabiga oge ma nyere onye nlekọta ụlọ akwụkwọ aka ilekwasị onye mmụta nke ọ bụla anya wee na-enye ndụmọdụ. Dị ka oge kwere mee mgbe e kwusiri okwu ndụmọdụ dị mkpa, onye ndụmọdụ ahụ pụrụ ikwu okwu n’isi ihe ndị nwere ihe ọmụma ma baa uru nke ndị mmụta ahụ na-ekwughị. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-elezi anya ka ọ ghara iji ihe karịrị minit abụọ ná ngụkọta mee ihe maka ndụmọdụ na okwu ncheta ọ bụla dị mkpirikpi mgbe onye mmụta ọ bụla kwusịrị okwu. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa inye nwanna na-eme isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible ndụmọdụ, a pụrụ inye nke a n’abụghị n’ihu ọha.
ỊKWADEBE IHE OMUME: Tupu ọ malite ịkwadebe ihe omume e kenyere ya, onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ nke ọma n’ebe kọwara ọdịdị okwu nke ọ ga-arụ ọrụ na ya. Ndị mmụta e kenyere Ihe Omume nke 2 pụrụ ịhọrọ isiokwu nke kwekọrọ n’akụkụ Bible nke a gaje ịgụ. A ga-ewulite ihe omume ndị ọzọ n’ikwekọ n’isiokwu ndị e depụtara n’usoro ihe omume nke e bipụtaworo.
IDEBE OGE: Onye ọ bụla ekwesịghị ịgafe oge, ndụmọdụ na okwu ọ bụla ọzọ nke onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke 2 ruo 4 mgbe oge zuru. Onye ahụ e kenyere inye ihe àmà nkwụsị kwesịrị ime otú a ozugbo oge zuru. Mgbe ụmụnna ndị na-eme Ihe Omume nke 1 na isi ihe ndị sitere na Bible riri oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ n’abụghị n’ihu ọha. Mmadụ nile kwesịrị ilezi anya idebe oge. Ihe omume ahụ dum: minit 45, n’agụnyeghị abụ na ekpere.
NTỤLEGHACHI ODIDE: Site n’oge ruo n’oge a ga na-eme ntụleghachi odide. Ná nkwadebe, tụleghachi ihe mmụta dum ahụ e depụtara, gụzuokwa usoro ọgụgụ Bible ahụ. Nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’oge ntụleghachi nke a ga-ewe minit 25. A ga-eji oge fọdụrụ wee tụlee ajụjụ na azịza nile ahụ. Onye mmụta ọ bụla ga-akanye akara n’akwụkwọ nke ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-esoro ndị na-ege ntị tụlee azịza nye ajụjụ ntụleghachi nile, ma tinye uche karịsịa ná ndị sikarịsịrị ike, na-enyere mmadụ nile aka ịghọta azịza ndị ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na n’ihi ihe ụfọdụ, ọnọdụ ndị e nwere n’ọgbakọ emee ka ọ dị mkpa, a pụrụ ime ntụleghachi odide ahụ n’izu nke so nke ahụ e gosiri n’usoro ihe omume.
ỌGBAKỌ NDỊ BURU IBU: Ọgbakọ ndị nwere ndị mmụta 50 ma ọ bụ karịa, bụ́ ndị denyere aha n’ụlọ akwụkwọ, pụrụ ime ndokwa maka ìgwè ndị mmụta ọzọ ime ihe omume e kenyere ha n’ihu ndị ndụmọdụ ọzọ. N’ezie, ndị a na-emebeghị baptism, bụ́ ndị na-adị ndụ nke na-ekwekọ n’ụkpụrụ nile nke ndị Kraịst, pụkwara idenye aha ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, na-enwetakwa ihe omume.
NDỊ NA-ABỊAGHỊ: Ndị nile nọ n’ọgbakọ pụrụ igosi obi ekele maka ụlọ akwụkwọ nke a site n’ime mgbalị ịbịa nnọkọ nke izu nile, site n’ịkwadebe ihe omume ha nke ọma, na site n’ikere òkè n’oge ajụjụ. E nwere olileanya na ndị mmụta nile ga-eji ihe omume ha kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na onye mmụta abịaghị mgbe e nyere ya ihe omume, onye nke wepụtara onwe ya pụrụ ime ihe omume ahụ, na-enye nkọwa ọ bụla nke o chere na o ruru eru inye n’ime mkpirikpi oge ahụ. Ma ọ bụ, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ pụrụ imezu ihe mmụta ahụ, na-eme ka ndị na-ege ntị na-ekere òkè kwesịrị ekwesị.
USORO IHE OMUME
Jan. 6 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 1 ruo 5
Abụ nke 85 (44)
Nke 1: w89 6/15 p. 30-31 (e wezụga igbe)
Nke 2: Zekaraịa 2:1-13
Nke 3: E Meghị Mmadụ Ịnwụ Anwụ (kl p. 53 para. 1–3)
Nke 4: Rut na Naomi (my akụkọ nke 51)
Jan. 13 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 6 ruo 9
Abụ nke 215 (117)
Nke 1: Jisọs Nwere Mkpịsị Ugodi nke Ọnwụ na Hedis (uw p. 73-77 para. 8-15)
Nke 2: Zekaraịa 7:1-14
Nke 3: Nkata Arụrụala (kl p. 55-56 para. 4-7)
Nke 4: Gideon na Narị Ndị Ikom Atọ Ya (my akụkọ nke 52)
Jan. 20 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 10 ruo 14
Abụ nke 98 (91)
Nke 1: w89 6/15 p. 31 (igbe)
Nke 2: Zekaraịa 12:1-14
Nke 3: Ụzọ Setan Si Jiri Nkata Ya Gaa n’Ihu (kl p. 56-58 para. 8-12)
Nke 4: Nkwa Jefta Kwere (my akụkọ nke 53)
Jan. 27 Ọgụgụ Bible: Malakaị 1 ruo 4
Abụ nke 118 (99)
Nke 1: w89 7/1 p. 30-31
Nke 2: Malakaị 1:6-14
Nke 3: Ụzọ Mmehie na Ọnwụ Si Gbasaa (kl p. 58-59 para. 13-15)
Nke 4: Nwoke nke Kachasị Ike (my akụkọ nke 54)
Feb. 3 Ọgụgụ Bible: Matiu 1 ruo 3
Abụ nke 132 (70)
Nke 1: w89 7/15 p. 24-25 para. 1
Nke 2: Matiu 2:1-15
Nke 3: Lezie Anya Maka Ụzọ Aghụghọ Setan (kl p. 59-60 para. 16-18)
Nke 4: Nwatakiri nke Na-efe Chineke (my akụkọ nke 55)
Feb. 10 Ọgụgụ Bible: Matiu 4 na 5
Abụ nke 36 (14)
Nke 1: Nwee Mmasị n’Alaeze Na-adịgide Adịgide nke Chineke (uw p. 78-81 para. 1-9)
Nke 2: Matiu 4:1-17
Nke 3: Nwee Okwukwe ma Dị Njikere Maka Mmegide (kl p. 60-61 para. 19-21)
Nke 4: Sọl—Eze Mbụ nke Israel (my akụkọ nke 56)
Feb. 17 Ọgụgụ Bible: Matiu 6 na 7
Abụ nke 222 (119)
Nke 1: Ihe Alaeze Chineke Ga-emezu (uw p. 81-82 para. 10-12)
Nke 2: Matiu 7:1-14
Nke 3: Ụzọ Chineke Isi Zọpụta Ihe A Kpọrọ Mmadụ (kl p. 62-63 para. 1-5)
Nke 4: Chineke Ahọpụta Devid (my akụkọ nke 57)
Feb. 24 Ọgụgụ Bible: Matiu 8 na 9
Abụ nke 162 (89)
Nke 1: Ihe Alaeze ahụ Mezuworo (uw p. 83-86 para. 13-15)
Nke 2: Matiu 8:1-17
Nke 3: Ihe Mere Mesaịa ahụ Ga-eji Nwụọ (kl p. 63-65 para. 6-11)
Nke 4: Devid na Golaiat (my akụkọ nke 58)
March 3 Ọgụgụ Bible: Matiu 10 na 11
Abụ nke 172 (92)
Nke 1: Otú Anyị Si Ebu Ụzọ Achọ Alaeze Ahụ (uw p. 87-89 para. 1-6)
Nke 2: Matiu 11:1-15
Nke 3: Ụzọ E Si Kwụọ Ụgwọ Ihe Mgbapụta Ahụ (kl p. 65-68 para. 12-16)
Nke 4: Ihe Mere Devid Aghaghị Ịgbalaga (my-IB akụkọ nke 59)
Mar. 10 Ọgụgụ Bible: Matiu 12 na 13
Abụ nke 133 (68)
Nke 1: Gbasoo Ihe Nlereanya Ndị Na-eso Ụzọ Oge Gboo (uw-IB p. 90-91 para. 7-9)
Nke 2: Matiu 12:22-37
Nke 3: Ihe Mgbapụta Kraịst na Gị (kl p. 68-69 para. 17-20)
Nke 4: Abigail na Devid (my akụkọ nke 60)
Mar. 17 Ọgụgụ Bible: Matiu 14 na 15
Abụ nke 129 (66)
Nke 1: Debe Alaeze ahụ n’Ọkwá Mbụ ná Ndụ Gị (uw p. 91-94 para. 10-15)
Nke 2: Matiu 14:1-22
Nke 3: Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ? (kl p. 70-71 para. 1-5)
Nke 4: E Chie Devid Eze (my akụkọ nke 61)
Mar. 24 Ọgụgụ Bible: Matiu 16 na 17
Abụ nke 151 (25)
Nke 1: Ihe Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere Baptism Jọn Mere (uw p. 95-96 para. 1-5)
Nke 2: Matiu 17:14-27
Nke 3: Mmalite Zuru Okè na Ịma Aka Obi Ọjọọ (kl p. 72-73 para. 6-10)
Nke 4: Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid (my-IB akụkọ nke 62)
Mar. 31 Ọgụgụ Bible: Matiu 18 na 19
Abụ nke 97 (50)
Nke 1: Gịnị Bụ Baptism Ịba n’Ọnwụ? (uw p. 97-98 para. 6-8)
Nke 2: Matiu 19:16-30
Nke 3: Ezi Ihe Iseokwu Ndị ahụ na Ụzọ Jehova Isi Dozie Ha (kl p. 74-76 para. 11-15)
Nke 4: Solomon Eze Maara Ihe (my akụkọ nke 63)
Apr. 7 Ọgụgụ Bible: Matiu 20 na 21
Abụ nke 107 (57)
Nke 1: Gịnị Ka Ọ Pụtara Bụ́ Ime Baptism “Baa n’Aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ”? (uw p. 98 para. 9)
Nke 2: Matiu 20:1-16
Nke 3: Ihe Nkwere Chineke Kwere Ka Mmebi Iwu Dịrị Nwapụtaworo (kl p. 76-77 para. 16-19)
Nke 4: Solomon Ewuo Ụlọ Nsọ (my akụkọ nke 64)
Apr. 14 Ọgụgụ Bible: Matiu 22 na 23
Abụ nke 56 (33)
Nke 1: Ịrụzu Ihe Baptism Anyị Pụtara (uw p. 99-102 para. 10-14)
Nke 2: Matiu 23:1-15
Nke 3: N’akụkụ Ònye Ka I Guzo? (kl p. 78-79 para. 20-23)
Nke 4: E Kewaa Alaeze Ahụ (my akụkọ nke 65)
Apr. 21 Ọgụgụ Bible: Matiu 24 na 25
Abụ nke 193 (103)
Nke 1: Ịmata Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ (uw p. 103-104 para. 1-4)
Nke 2: Matiu 24:32-44
Nke 3: Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? (kl p. 80-81 para. 1-6)
Nke 4: Jezebel—Ajọ Eze Nwanyị (my akụkọ nke 66)
Apr. 28 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Zekaraịa 1 ruo Matiu 25
Abụ nke 6 (4)
May 5 Ọgụgụ Bible: Matiu 26
Abụ nke 14 (6)
Nke 1: Gịnị Ka A Chọrọ Iji Lanarị Oké Mkpagbu Ahụ? (uw p. 105 para. 5)
Nke 2: Matiu 26:31-35, 69-75
Nke 3: Ihe Ịlaghachi n’Ájá Pụtara n’Ezie (kl p. 82-83 para. 7-10)
Nke 4: Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi (my akụkọ nke 67)
May 12 Ọgụgụ Bible: Matiu 27 na 28
Abụ nke 102 (53)
Nke 1: w89 7/15 p. 25 para. 2-6
Nke 2: Matiu 27:11-26
Nke 3: Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ? (kl p. 83-84 para. 11-14)
Nke 4: Ụmụntakịrị Abụọ Ndị Dịghachiri Ndụ (my akụkọ nke 68)
May 19 Ọgụgụ Bible: Mak 1 na 2
Abụ nke 180 (100)
Nke 1: w89 10/15 p. 30
Nke 2: Mak 1:12-28
Nke 3: A Ga-akpọlite Ndị Nile Nọ ná Ncheta Jehova n’Ọnwụ (kl p. 85-87 para. 15-18)
Nke 4: Nwa Agbọghọ Enyere Otu Dike Aka (my akụkọ nke 69)
May 26 Ọgụgụ Bible: Mak 3 na 4
Abụ nke 46 (20)
Nke 1: Ihe Mere Oké Ìgwè Mmadụ Ga-eji Lanarị Oké Mkpagbu Ahụ (uw p. 106-107 para. 6-8)
Nke 2: Mak 3:1-15
Nke 3: Mbilite n’Ọnwụ Gaa n’Ebee? (kl p. 88-89 para. 19-22)
Nke 4: Jona na Azụ̀ Ukwu Ahụ (my akụkọ nke 70)
June 2 Ọgụgụ Bible: Mak 5 na 6
Abụ nke 220 (19)
Nke 1: Ihe Mere na Anyị Ji Paradaịs Ime Mmụọ Anyị Akpọrọ Ihe (uw p. 107-109 para. 9-13)
Nke 2: Mak 5:21-24, 35-43
Nke 3: Alaeze Chineke na Nzube Ya (kl p. 90-91 para. 1-5)
Nke 4: Chineke Kwere Nkwa Paradaịs (my akụkọ nke 71)
June 9 Ọgụgụ Bible: Mak 7 na 8
Abụ nke 207 (112)
Nke 1: Gịnị Mere Ndị Nketa Alaeze Ji Dị Nnọọ Ole na Ole n’Ụwa Taa? (uw p. 110-112 para. 1-7)
Nke 2: Mak 7:24-37
Nke 3: Alaeze Chineke Bụ Ọchịchị (kl p. 91-92 para. 6-7)
Nke 4: Chineke Enyere Eze Hezekaịa Aka (my akụkọ nke 72)
June 16 Ọgụgụ Bible: Mak 9 na 10
Abụ nke 11 (12)
Nke 1: Ụmụ Ime Mmụọ—Hà Si Aṅaa Amata? (uw p. 112-113 para. 8-10)
Nke 2: Mak 9:14-29
Nke 3: Otú Anyị Si Mata na Alaeze Chineke Bụ Ezie (kl p. 92-93 para. 8-11)
Nke 4: Eze Ọma Ikpeazụ nke Israel (my akụkọ nke 73)
June 23 Ọgụgụ Bible: Mak 11 na 12
Abụ nke 87 (47)
Nke 1: Gịnị Ka Ememe Ncheta ahụ Pụtara? (uw p. 114-116 para. 11-14)
Nke 2: Mak 11:12-25
Nke 3: Ihe Mere Alaeze Chineke Ji Bụrụ Nanị Olileanya Ihe A Kpọrọ Mmadụ Nwere (kl p. 94-95 para. 12-13)
Nke 4: Nwoke nke Egwu Na-adịghị Atụ (my akụkọ nke 74)
June 30 Ọgụgụ Bible: Mak 13 na 14
Abụ nke 38 (65)
Nke 1: Ịmata Nzukọ Jehova A Na-ahụ Anya (uw p. 117-118 para. 1-3)
Nke 2: Mak 14:12-26
Nke 3: Ihe Mere Jisọs Amaliteghị Ịchị Isi Ozugbo Ọ Rịgosịrị n’Eluigwe (kl p. 95-96 para. 14-15)
Nke 4: Ụmụ Okorobịa Anọ n’Ime Babilọn (my akụkọ nke 75)
July 7 Ọgụgụ Bible: Mak 15 na 16
Abụ nke 187 (93)
Nke 1: w89 10/15 p. 31
Nke 2: Mak 15:16-32
Nke 3: Olee Mgbe Oge nke Mba Ọzọ Malitere ma Gwụsịa? (kl p. 96-97 para. 16-18)
Nke 4: A Lara Jerusalem n’Iyi (my akụkọ nke 76)
July 14 Ọgụgụ Bible: Luk 1
Abụ nke 212 (110)
Nke 1: w89 11/15 p. 24 para. 1-8
Nke 2: Luk 1:5-17
Nke 3: Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ! (kl p. 98-99 para. 1-4)
Nke 4: Ha Akpọghị Isiala (my akụkọ nke 77)
July 21 Ọgụgụ Bible: Luk 2 na 3
Abụ nke 89 (49)
Nke 1: Nzukọ Chineke Bụ nke Ọchịchị Chineke (uw p. 118-120 para. 4-7)
Nke 2: Luk 2:1-14
Nke 3: Gịnị Bụ Akụkụ Ụfọdụ nke Mgbe Ikpeazụ Ahụ? (kl p. 99-103 para. 5-7)
Nke 4: Ihe Aka Dere n’Elu Mgbidi (my akụkọ nke 78)
July 28 Ọgụgụ Bible: Luk 4 na 5
Abụ nke 92 (51)
Nke 1: Ibu Ọrụ Akwụkwọ Nsọ nke Ndị Na-edu Ndú (uw p. 120-122 para. 8-12)
Nke 2: Luk 4:31-44
Nke 3: E Buru Omume Rụrụ Arụ nke Ụmụ Mmadụ n’Amụma Maka Mgbe Ikpeazụ (kl p. 103-104 para. 8-12)
Nke 4: Daniel n’Ime Olulu Ọdụm (my akụkọ nke 79)
Aug. 4 Ọgụgụ Bible: Luk 6 na 7
Abụ nke 213 (36)
Nke 1: Ịtụle Ekele Anyị Nwere Maka Nzukọ Chineke (uw p. 123-124 para. 13-14)
Nke 2: Luk 6:37-49
Nke 3: Akụkụ Abụọ Pụrụ Iche nke Mgbe Ikpeazụ Ahụ (kl p. 105 para. 13-14)
Nke 4: Ndị nke Chineke Ahapụ Babilọn (my akụkọ nke 80)
Aug. 11 Ọgụgụ Bible: Luk 8 na 9
Abụ nke 67 (38)
Nke 1: N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nụrụ Ndụmọdụ? (uw p. 125-127 para. 1-4)
Nke 2: Luk 9:23-36
Nke 3: Jiri Ihe Àmà nke na Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ Mee Ihe (kl p. 106-107 para. 15-17)
Nke 4: Ichekwube Enyemaka Chineke (my akụkọ nke 81)
Aug. 18 Ọgụgụ Bible: Luk 10 na 11
Abụ nke 34 (8)
Nke 1: Ihe Atụ Ọma nke Ndị Naara Ndụmọdụ (uw p. 127-128 para. 5-6)
Nke 2: Luk 11:37-51
Nke 3: Ndị Ajọ Mmụọ Dị! (kl p. 108 para. 1-3)
Nke 4: Mọdekai na Esta (my akụkọ nke 82)
Aug. 25 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Matiu 26 ruo Luk 11
Abụ nke 160 (88)
Sept. 1 Ọgụgụ Bible: Luk 12 na 13
Abụ nke 163 (94)
Nke 1: Zụlite Àgwà Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa (uw p. 128-130 para. 7-11)
Nke 2: Luk 13:1-17
Nke 3: Ndị Ajọ Mmụọ Ozi Na-adọnyere Setan Úkwù (kl p. 109 para. 4-5)
Nke 4: Mgbidi Jerusalem (my akụkọ nke 83)
Sept. 8 Ọgụgụ Bible: Luk 14 ruo 16
Abụ nke 124 (75)
Nke 1: Ajụla Ịdọ Aka ná Ntị Jehova (uw p. 130-131 para. 12-14)
Nke 2: Luk 14:1-14
Nke 3: Jụ Ụdị Ime Mgbaasị Nile (kl p. 111 para. 6-8)
Nke 4: Mmụọ Ozi Eleta Meri (my akụkọ nke 84)
Sept. 15 Ọgụgụ Bible: Luk 17 na 18
Abụ nke 200 (108)
Nke 1: E Ji Ịhụnanya Amata Ezi Ndị Kraịst (uw p. 132-133 para. 1-5)
Nke 2: Luk 17:22-37
Nke 3: Ihe Mere Bible Ji Akagbu Ime Mgbaasị (kl p. 112-113 para. 9-11)
Nke 4: A Mụrụ Jisọs n’Ụlọ Anụ (my akụkọ nke 85)
Sept. 22 Ọgụgụ Bible: Luk 19 na 20
Abụ nke 145 (115)
Nke 1: Ihe A Ga-eme Mgbe Nsogbu Dapụtara (uw p. 134 para. 6-9)
Nke 2: Luk 19:11-27
Nke 3: Bible Na-ekpughe Otú Ndị Ajọ Mmụọ Si Arụ Ọrụ (kl p. 113-114 para. 12-13)
Nke 4: Ndị Ikom Otu Kpakpando Dutere (my akụkọ nke 86)
Sept. 29 Ọgụgụ Bible: Luk 21 na 22
Abụ nke 86 (45)
Nke 1: Na-edozi Nsogbu n’Ụzọ Akwụkwọ Nsọ (uw p. 135-136 para. 10-13)
Nke 2: Luk 22:24-38
Nke 3: Ụzọ Isi Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ (kl p. 114-115 para. 14-15)
Nke 4: Nwata Bụ́ Jisọs Nọ n’Ụlọ Nsọ (my akụkọ nke 87)
Oct. 6 Ọgụgụ Bible: Luk 23 na 24
Abụ nke 88 (42)
Nke 1: w89 11/15 p. 24 para. 9–p. 25
Nke 2: Luk 23:32-49
Nke 3: Ụzọ Isi Wusiwanye Okwukwe Gị Ike (kl p. 115-116 para. 16-17)
Nke 4: Jọn Emee Jisọs Baptism (my akụkọ nke 88)
Oct. 13 Ọgụgụ Bible: Jọn 1 ruo 3
Abụ nke 31 (10)
Nke 1: w90 3/15 p. 24-25 para. 1
Nke 2: Jọn 1:19-34
Nke 3: Nọgide n’Agha Gị Megide Ndị Ajọ Mmụọ (kl p. 116-117 para. 18-20)
Nke 4: Jisọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha (my akụkọ nke 89)
Oct. 20 Ọgụgụ Bible: Jọn 4 na 5
Abụ nke 35 (15)
Nke 1: Chọọ Ụzọ Isi ‘Gbasapụ’ n’Ịhụnanya (uw p. 137-138 para. 14-17)
Nke 2: Jọn 4:39-54
Nke 3: Ịdị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke Na-eweta Obi Ụtọ (kl p. 118-119 para. 1-4)
Nke 4: Jisọs na Nwanyị n’Olulu Mmiri (my akụkọ nke 90)
Oct. 27 Ọgụgụ Bible: Jọn 6 na 7
Abụ nke 150 (83)
Nke 1: Nwee Nsọpụrụ Chineke n’Ụlọ (uw p. 139 para. 1-2)
Nke 2: Jọn 6:52-71
Nke 3: Ịkwụwa Aka Ọtọ Na-arụpụta Obi Ụtọ (kl p. 119-120 para. 5-6)
Nke 4: Jisọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu (my-IB akụkọ nke 91)
Nov. 3 Ọgụgụ Bible: Jọn 8 na 9
Abụ nke 48 (28)
Nke 1: Ihe Bible Na-ekwu Banyere Alụmdi na Nwunye, Ịgba Alụkwaghịm, na Nkewa (uw p. 140 para. 3)
Nke 2: Jọn 9:18-34
Nke 3: Mmesapụ Aka Na-eweta Obi Ụtọ (kl p. 120 para. 7-8)
Nke 4: Jisọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ (my akụkọ nke 92)
Nov. 10 Ọgụgụ Bible: Jọn 10 na 11
Abụ nke 117 (75)
Nke 1: Ihe Ndị Bụ Isi n’Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma (uw p. 140-141 para. 4-5)
Nke 2: Jọn 10:22-39
Nke 3: Chee Ikike Echiche Gị Nche ma Zere Ihe Ọjọọ (kl p. 121 para. 9-10)
Nke 4: Jisọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri (my akụkọ nke 93)
Nov. 17 Ọgụgụ Bible: Jọn 12 na 13
Abụ nke 158 (85)
Nke 1: Mezuo Òkè Gị ná Ndokwa Ezinụlọ nke Chineke (uw p. 142-143 para. 6-10)
Nke 2: Jọn 12:1-16
Nke 3: Ikwesị Ntụkwasị Obi Nye Onye Òtù Ọlụlụ Na-eweta Obi Ụtọ n’Alụmdi na Nwunye (kl p. 122-123 para. 11-13)
Nke 4: Jisọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya (my akụkọ nke 94)
Nov. 24 Ọgụgụ Bible: Jọn 14 ruo 16
Abụ nke 63 (32)
Nke 1: Kwee Ka Bible Bụrụ Isi Iyi nke Ndụmọdụ Gị (uw p. 144 para. 11-13)
Nke 2: Jọn 16:1-16
Nke 3: Abụla Akụkụ nke Ụwa (kl p. 123-125 para. 14-15)
Nke 4: Ụzọ Jisọs Si Ezi Ihe (my akụkọ nke 95)
Dec. 1 Ọgụgụ Bible: Jọn 17 na 18
Abụ nke 114 (61)
Nke 1: Ihe Mere Anyị Ji Enwe Mmasị n’Iwu Mosis (uw p. 146-147 para. 1-4)
Nke 2: Jọn 18:1-14
Nke 3: Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Adịghị Agba Krismas Ma Ọ Bụ Eme Ememe Ụbọchị Ọmụmụ (kl p. 126 para. 16-17)
Nke 4: Jisọs Agwọọ Ndị Ọrịa (my akụkọ nke 96)
Dec. 8 Ọgụgụ Bible: Jọn 19 ruo 21
Abụ nke 138 (71)
Nke 1: w90 3/15 p. 25 para. 2-7
Nke 2: Jọn 19:25-37
Nke 3: Nọgide Na-eme Eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (kl p. 127 para. 18)
Nke 4: Jisọs Abịa Dị Ka Eze (my akụkọ nke 97)
Dec. 15 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 1 ruo 3
Abụ nke 41 (22)
Nke 1: w90 5/15 p. 24-26 para. 1 (e wezụga igbe)
Nke 2: Ọrụ 1:1-14
Nke 3: Otú Ụkpụrụ Bible Si Aba Uru n’Ọrụ na Ntụrụndụ (kl p. 127-128 para. 19-20)
Nke 4: N’elu Ugwu Olive (my akụkọ nke 98)
Dec. 22 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 4 ruo 6
Abụ nke 113 (62)
Nke 1: Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nsọ Mere na Anyị Anọghị n’Okpuru Iwu Mosis (uw p. 147-148 para. 5-6)
Nke 2: Ọrụ 5:27-42
Nke 3: Gosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ na Ọbara (kl p. 128-129 para. 21-23)
Nke 4: N’ime Ụlọ Ụlọ Elu (my akụkọ nke 99)
Dec. 29 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Luk 12 ruo Ọrụ 6
Abụ nke 144 (78)