Mkpebi Anyị—Ịgbaso Ụzọ Ndụ nke Jehova
1 Otu ihe pụtara ìhè ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” bụ mkpebi ahụ a nakweere mgbe e kwuru okwu mmechi. O ji nkwupụta okwu bụ́: “Anyị . . . ji obi anyị dum kweta na ụzọ Chineke bụ ụzọ ndụ kasị mma” wee malite. Cheta ụfọdụ n’ime isi ihe ndị dị ná mkpebi ahụ ndị anyị zara “Ee!” na ya.
2 Ọ bụ mkpebi anyị ịnọgide na-adị ọcha n’ihu Jehova, n’enweghị ntụpọ site n’ụwa. Anyị ga-anọgide na-edebe uche Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị. N’iji Okwu ya, bụ́ Bible, emere ihe nduzi anyị, anyị agaghị echigharị gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe, si otú a na-akwado na ụzọ ndụ nke Chineke dị mma nke ukwuu karịa ụzọ nke ụwa.
3 Ụwa n’ozuzu ya na-eleghara ụzọ ndụ nke Chineke anya ma na-enweta ihe ndị na-esi na ya apụta. (Jer. 10:23) N’ihi ya, anyị aghaghị ịnọgide bụrụ ndị Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova, na-ezi ihe, bụ́ onye sịrị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsa. 30:21) Ụzọ ndụ nke Jehova, dị ka a kọwapụtara ya n’ime Akwụkwọ Nsọ, dị elu karị n’ụzọ nile. Iji gbasoo ụzọ ahụ, ọ dị mkpa na anyị jiri ihe nile Jehova na-ezi anyị na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu.
4 Usoro Izi Ihe Ka Elu nke Jehova: Jehova na-akụziri anyị ihe bụ nzube nke ndụ n’ezie na ụzọ isi jiri ndụ anyị mee ihe kasị mma. Ọ na-akụziri anyị ụzọ isi meziwanye ndụ anyị n’uche, n’ụzọ omume, na n’ụzọ ime mmụọ. Ọ na-akụziri anyị ụzọ anyị na ụmụnna anyị, ezinụlọ anyị, na mmadụ ibe anyị ga-esi dịrị n’udo. Ọ na-eme nke a site n’akwụkwọ ya, bụ́ Bible, nakwa site ná nzukọ ya.
5 Nzukọ ọgbakọ anyị dị oké mkpa n’akụkụ a. Ka anyị na-ejechi anya ma na-ekere òkè ná nzukọ ise nile, anyị na-enweta ọzụzụ sara mbara dị ka ndị ozi nke ozi ọma ahụ na mmụta zuru ezu n’ibi ndụ ndị Kraịst. (2 Tim. 3:16, 17) Onye Nkụzi Ukwu anyị na-enyekwa ọzụzụ n’ụzọ ọchịchị Chineke site ná mgbakọ dị iche iche. Nzube anyị kwesịrị ịbụ ka anyị ghara ịhapụ otu nzukọ ma ọ bụ nnọkọ mgbe ọ bụla ma ọ bụrụ na ahụ ike na ọnọdụ anyị nyere anyị ohere ije.
6 Ka anyị jiri ịdị uchu nọgide na-agbaso ụzọ ndụ nke Chineke n’ụbọchị ndị na-abịa, iji nye Jehova otuto na maka abamuru ebighị ebi anyị!—Aịsa. 48:17.