Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke January 4 ruo April 19, 1999. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Jehova akpọpụtachaghị okwu nile e dere na Bible otu otu. (2 Tim. 3:16) [w97 6/15 p. 5 para. 3]
2. Nkwekọrịta ezinụlọ na ịzụlite ụmụaka n’ụzọ ime mmụọ dị kpam kpam n’ubu ndị nne na nna. (Ilu 22:6) [fy p. 85 para. 19]
3. N’ihi na ‘mmehie na-amakpu n’ọnụ ụzọ,’ ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ken ga-esi zere ime mmehie dị oké njọ. (Jen. 4:7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 6/15 p. 14 para. 11.]
4. Ka onye nọ n’afọ iri na ụma na-emewanye okenye, e kwesịrị inyekwu ya ohere ozugbo n’ụdị nhọrọ ntụrụndụ ọ na-achọ ime. [fy p. 73 para. 20]
5. Ọchịchọ ime ihe na-atọ Onye Okike anyị ụtọ bụ ihe mkpalị kasị mma iji na-ekwu eziokwu mgbe nile. (Ilu 6:17) [g97 3/8 p. 13 para. 4]
6. Iji mee ka ‘okwu nile nke ọnụ anyị na ntụgharị uche nke obi anyị bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Jehova’ n’ekpere, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịdị na-ekwu okwu na-ada oké ụda dị ka o kwere mee. (Abụ Ọma 19:14) [w97 7/1 p. 29 para. 4-5]
7. Ihe e nyere n’iwu, ụkpụrụ, na iwu Jehova ndị e hotara na Jenesis 26:5 na-ezo aka n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 7/1 p. 10 para. 8.]
8. Mgbe Jisọs kwuru, sị “okwukwe gị azọpụtawo gị,” dị ka e dekọrọ na Luk 8:48, o bu n’uche na ọ dị nwanyị ahụ na-arịa ọrịa mkpa ikwupụta okwukwe ya na Jisọs dị ka Mesaịa tupu a gwọọ ya. [w97 7/1 p. 4 para. 2-4]
9. Jenesis 11:1 bụ otu n’ime ọtụtụ akụkụ Bible na-eji okwu bụ “ụwa” eme ihe n’izo aka n’ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha, ma ọ bụ n’ọha mmadụ. [g97 1/8 p. 29 para. 3]
10. Ọ bụrụgodị na o nweghị ihe gositụrụ na Daịna kwenyere, ikpe ka matụkwara ya maka imebi ọnọdụ amaghị nwoke ya. (Jen. 34:1, 2) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w85 12/15 p. 31 para. 4.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Gịnị ka Setan nyere echiche ya site n’ikwu ihe ahụ e dere na Jenesis 3:1-5? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 7/15 p. 5 para. 1.]
12. Ná Mkpughe 19:15, gịnị ka “mma agha dị nkọ” nke na-esi n’ọnụ Jisọs pụta na-anọchite anya ya? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 5/15 p. 4 para. 5.]
13. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na Mosis kwuru kpọmkwem ụbọchị n’ihe metụtara Iju Mmiri nke ụbọchị Noa na-emesi ike? [g97 2/8 p. 24 para. 4]
14. Olee otú Abraham si “kpọkuo aha Jehova”? (Jen. 12:8) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89-IB 7/1 p. 20 para. 9.]
15. Site n’okwu ndị gbara ya gburugburu, gịnị ka Jehova bu n’uche mgbe ọ gwara Pọl, sị: “Amara m ezuworo gị”? (2 Kọr. 12:9) [w97 6/1 p. 25 para. 3]
16. Gịnị ka ihe àmà na-egosi na ọ bụ ya kpaliri nwunye Lọt ile anya n’azụ, nke mere ka ọ ghọọ ogidi nnu? (Jen. 19:26) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 4/15 p. 18 para. 10.]
17. Olee otú ndị Kraịst si ele ịzụ ihe ndị e zuru ezu anya? (Ọpụ. 22:1; Jer. 17:11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92-IB 6/15 p. 30 para. 3; p. 31 para. 1, 6-7.]
18. Dị ka Jenesis 33:18 si kwuo, olee otú Jekọb si gosipụta na ya enweghị mmasị n’iso ndị Kenean na-akpakọrịta? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95-IB 9/15 p. 21 para. 4.]
19. Olee ụzọ omume Josef a kọwara na Jenesis 37:13 si yie nke Jisọs? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 4/1 p. 29 para. 12.]
20. Gịnị bụ ihe dị iche n’etiti Chineke na ụmụ mmadụ n’ihe banyere iwe iwe? [g97 6/8 p. 22 para. 2-3]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. _________________________ ebumnobi ndị ọzọ n’enweghị _________________________ kpatara ya na ikpe ha ikpe bụ otu ihe ahụ. [w97 5/15 p. 26 para. 5]
22. Ọ bụ _________________________ dere akwụkwọ Jenesis n’ọzara Saịnaị na _________________________. [w83 7/15 p. 24 para. 2]
23. Ihe atụ nke Rehoboam na Ilaị pụrụ inyere ndị nne na nna aka ịghọta ihe ndị na-esi n’ịgabiga ókè _________________________ ma ọ bụ _________________________ n’ịzụ ụmụaka apụta. [fy p. 80-81 para. 9-13]
24. Inweta _________________________ bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ịzụlite _________________________ ndị Chineke. [w97 8/1 p. 4 para. 5]
25. Ịgba àmà ihe ọjọọ bụ ngosipụta nke ịhụnanya ndị Kraịst nke ụkpụrụ nduzi e nwere n’ebe _________________________ nọ, n’ebe _________________________ nọ, na n’ebe _________________________ nọ. [w97 8/15 p. 30 para. 2]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Ịdọ aka ná ntị (siri ike; dị nro; ziri ezi) bụ ihe àmà nke ịhụnanya nne ma ọ bụ nna maka nwa ya. (Hib. 12:6, 11) [fy-IB p. 72 para. 18]
27. Ọ bụ ezie na Bible ekwughị kpọmkwem ogologo oge Noa tinyere n’iwu ụgbọ ahụ, ihe ndekọ ahụ na-enye ohere maka ihe owuwu were afọ (100; 50 ma ọ bụ 60; 120). (Jen. 5:32; 7:6) [g97-IB 2/8 p. 25 para. 1]
28. Na Jọn 8:32, nnwere onwe Jisọs bu n’uche bụ nnwere onwe pụọ (n’ịchịisi ndị Rom; na nkwenkwe ụgha; ná mmehie na ọnwụ). [w97-IB 2/1 p. 5 para. 1]
29. Ná mmezu ikpeazụ nke Jenesis 22:18, mkpụrụ ahụ na-ezo aka n’ebe (Aịsak; ụmụ Israel; Jisọs na 144,000) nọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 2/1 p. 14 para. 8.]
30. Ọ bụ (irube isi n’Iwu Mosis; ikwere n’ezie na Chineke dị nakwa egwu ziri ezi nke ịkpasu ya iwe; egwu nke ịnata ntaramahụhụ) nyeere Josef aka inwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide ọnwụnwa nke gaara eme ka o tinye aka n’omume rụrụ arụ. (Jen. 39:9) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w81 8/15 p. 7 para. 2.]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ilu 5:3, 4; 15:22; 20:11; Efe. 5:19; 2 Tim. 3:16
31. Ọ dị oké mkpa ka ndị nne na nna jide n’aka na ụmụ ha kweere site n’obi ha dum n’ịdị mkpa nke ibi ndụ omume ọma na nke dị ọcha. [fy p. 67 para. 8]
32. Izu nzuzo dị oké mkpa n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma iji mee ka ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe. [fy p. 65 para. 4]
33. Isi ihe na-akpata ịbụ abụ n’ụzọ ka mma ná nzukọ ọgbakọ bụ inwe ọdịdị obi ziri ezi. [w97 2/1 p. 27 para. 3]
34. Ịghọta ozizi nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ ihe dị mkpa maka ndụ ebighị ebi. [w97 8/15 p. 6 para. 5]
35. Iji zere ọnwụnwa nke omume rụrụ arụ, anyị aghaghị ịmata na ọ dị njọ nakwa na ọ na-arụpụta mbibi na ihe ndị dị ilu. [fy p. 93 para. 9]