Jiri Oge Gị Mee Ihe n’Ụzọ Bara Uru
1 Mmadụ nile nwere oge hà nhata maka iji mee ihe kwa izu. Nke anyị ji agbasa ozi ọma kasị baa uru n’ihi na ọ bụ oge e ji rụọ ọrụ ịzọpụta ndụ. (Rom 1:16) Anyị na-egosipụta ekele anyị nwere maka nke a site n’ịkwadebe nke ọma maka ije ozi e mere atụmatụ ya, na-abịarute ná nzukọ maka ije ozi n’oge, na-agakwa n’ókèala ozugbo. Ọ ga-aka mma anyị ịnọ na-eme nkwusa kama ịnọ na-echere. Ebe Jehova kụziwooro anyị na “ihe ọ bụla nwere oge,” ọ dị anyị mkpa iji oge anyị wepụtaworo maka ozi mee ihe n’ụzọ bara uru n’ezie.—Ekli. 3:1.
2 Jiri Oge Gị Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya: Anyị na-enweta ọtụtụ ngọzi mgbe anyị na-agbasosi usoro ihe omume na-enye ohere maka ikerechi òkè anya n’ozi ubi, ike. Dị ka o kwesịrị ịdị, ezi ihe ndị anyị na-arụpụta n’ozi na oge anyị ji jee ozi kwesịrị ịha nhata. Site n’imetụ mgbanwe n’ihe omume anyị, ànyị pụrụ itinyekwu oge n’ozi ubi? Dị ka ihe atụ, mgbe e jesịrị nkesa magazin na Saturday, ànyị pụrụ iwepụtakwu oge ụfọdụ iji gaa nletaghachi ole na ole? Ọ bụrụ na anyị nọrọ n’ozi ubi ruo oge ụfọdụ na Sunday, ànyị pụrụ ijikwa oge ụfọdụ gaa nletaghachi ma ọ bụ duzie ọmụmụ Bible? Ọ̀ ga-ekwe omume iji ịgba àmà okporo ámá kwado ọrụ ụlọ n’ụlọ anyị? Site n’ụzọ ndị a ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ, anyị nwere ike ịmụba ozi anyị.
3 Mgbe anyị na-aga ozi, anyị pụrụ igbu oge dị oké ọnụ ahịa ma ọ bụrụ na anyị elezighị anya. Otú ọ dị, mgbe ihu igwe na-adịghị mma, ọ pụrụ ịdị mma ịba na ndo ma ọ bụ n’ụlọ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe anyị pụrụ iji oge ahụ mee nkwusa ma ọ bụ kụziere ndị ọzọ eziokwu ahụ. Ànyị pụrụ ịba n’ụlọ otu onye nwere mmasị ma ọ bụ na nke otu n’ime ndị anyị na-amụrụ Bible?
4 N’afọ ndị na-adịbeghị anya o siwanyewo ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Iji mee ihe banyere ọnọdụ a, ọtụtụ ndị nkwusa na-agba àmà site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’oge dị iche n’ụbọchị. Gịnị ma ị nwalee ịgba àmà n’uhuruchi?
5 Ọ ka mma ma ọ bụrụ na anyị na ibe anyị adịghị akpa nkata mgbe anyị na-arụ ọrụ okporo ámá. Kama nke ahụ, kwụrụnụ iche iche ma na-ejekwuru ndị mmadụ iji soro ha malite inwe mkparịta ụka. N’ụzọ dị otú a a ga-eji oge mee ihe bara uru karị, a ga-enwetakwa ọṅụ ka ukwuu n’ọrụ ahụ.
6 Jiri Ohere Ndị Dapụtaranụ Gbaa Àmà: Mgbe otu onye nwe ụlọ kwuru na ya enweghị mmasị, otu Onyeàmà jụrụ ya ma ọ̀ dị onye ọzọ nọ n’ụlọ ya na ya pụrụ ikwurịta okwu. Nke a dugara n’isoro nwoke nwe ụlọ ahụ nwee mkparịta ụka, bụ́ onye na-arịa ọrịa eri ọtụtụ afọ ma na-edinakarị n’àkwà. Olileanya dị n’Okwu Chineke mere ka o nweghachi mmasị n’ịdị ndụ. N’oge na-adịghị anya o si n’àkwà bilie, na-eje nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, sorokwa ndị ọzọ na-ekerịta olileanya ọhụrụ ya!
7 Otu nwanna nwanyị nọ n’afọ iri na ụma tinyere aro ahụ bụ́ ka e kere òkè n’ozi ubi tupu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ amalite, n’ọrụ. N’ọnụ ụzọ mbụ ọ gara, ọ hụrụ otu nwa agbọghọ dị afọ 13, bụ́ onye gere ntị nke ọma ma nata akwụkwọ. N’echi ya n’ụlọ akwụkwọ, nwanna nwanyị ahụ na-eto eto hụrụ nwa agbọghọ ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwara ya ka ya na ya na-amụ Bible, nwa agbọghọ ahụ kwetakwara.
8 Mee Ka Ọ Bụrụ Oge E Ji Rụpụta Ihe: Ikerechi òkè anya n’ozi ubi na-enyere anyị aka ịzụlite nkà anyị n’iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ. Ị̀ pụrụ imeziwanye ikike i nwere ịmalite mkparịta ụka n’ọnụ ụzọ site n’iji okwu mmalite dị irè karị eme ihe? Ị̀ pụrụ ịghọ onye ozizi nwere nkà karị mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ iji oge i ji eje ozi mee ihe bara uru ma rụpụtakwuo ihe n’ozi gị.—1 Tim. 4:16.
9 Ebe ọ bụ na “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ,” anyị kwesịrị imikpu onwe anyị n’ọrụ ndị Kraịst. (1 Kọr. 7:29) Iwepụta oge maka ọrụ ime nkwusa kwesịrị ịbụ ihe mbụ n’usoro ihe omume anyị. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè dị mma n’ozi ahụ. Oge bụ ihe onwunwe magburu onwe ya Jehova nyeworo anyị. Jiri ya mee ihe mgbe nile n’ụzọ amamihe dị na ya nakwa n’ụzọ bara uru.
Igbe dị na peeji nke 4]
Tụlee Aro Ndị A:
◼ Bịa nzukọ maka ije ozi n’oge.
◼ Ruo ókè ezi uche dị na ya, mee ka ígwè ndị na-agba àmà dị obere.
◼ Zere igbu oge mgbe a na-aga n’ókèala.
◼ Rụọ ókèala mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nọ n’ụlọ.
◼ Rụọ ọrụ nanị gị mgbe ụfọdụ ma ọ bụrụ na ọ dịghị ize ndụ ime otú ahụ.
◼ Gaa nletaghachi ndị kasị dịrị nso n’ókèala a gara ụlọ n’ụlọ.
◼ Nọgide na-eje ozi mgbe ndị ọzọ so n’ígwè gị na-apụtaghị ebe ha nọ ngwa ngwa.
◼ Jiri nkwụsịtụ e mere n’ihi ihu igwe na-adịghị mma mee ihe bara uru.
◼ Mgbe ọ bụla o kwere mee, na-adabere n’ọnọdụ e nwere, nọfee otu awa.