Jiri Oge Gị Na-eme Ihe Bara Uru Mgbe Ị Nọ n’Ozi
N’afọ ije ozi 2014, anyị ji ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ijeri awa abụọ jee ozi ọma. Ihe a gosiri na anyị ji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi. (Ọma 110:3; 1 Kọr. 15:58) Ebe ọ bụ na “oge fọdụrụ dị ntakịrị,” ànyị nwere ike iwepụtakwu oge na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?—1 Kọr. 7:29.
E nwere ụzọ dị iche iche anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị na-eji oge anyị eme ihe bara uru n’ozi, o nwere mgbe ụfọdụ ọ ga-adị mma ka anyị hapụ ụdị ozi anyị bu n’obi ịga, gawa ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị nọ ozi ọma ihe dị ka otu awa agaa ma anyị anaghị ahụ onye anyị ga-ezi ozi ọma, ànyị nwere ike ịhapụ ụdị ozi ahụ gawa ụdị ọzọ ka anyị nwee ike ịhụ ndị anyị ga-ezi ozi ọma? Otú ihe si dịrị n’otu ebe nwere ike ịdị iche n’otú o si dịrị n’ebe ọzọ. Ma, ihe ndị anyị ga-ekwu ugbu a nwere ike inyere anyị aka iji oge anyị na-eme ihe bara uru ka anyị wee ghara ‘ịna-eti ikuku ọkpọ.’—1 Kọr. 9:26.
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị nkwusa na-aga ozi ụlọ n’ụlọ n’ụtụtụ. Ma, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-aga ọrụ n’ụtụtụ, ọ́ gaghị adị mma ka anyị gaa ozi ụlọ n’ụlọ ná mgbede, mgbe ndị mmadụ nọ n’ụlọ na-ezu ike? Anyị nwere ike iji ụtụtụ gaa ozi ọma n’okporo ámá ma ọ bụ n’ahịa.
Ebe Ndị Mmadụ Na-anọkarị: E nwere ike idosa akwụkwọ anyị n’elu tebụl ma ọ bụ n’ihe a na-akwagharị akwagharị n’ebe ndị na-ekwo ekwo. (Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Julaị 2013, peeji nke 5.) Ọ bụrụ na a chọpụta na ebe ahụ anaghịzi ekwo ekwo, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ nwere ike ikpebi ka a gafee n’ebe ọzọ na-ekwo ekwo.
Nletaghachi na Ịmụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl: Anyị chọpụta na anyị anaghị enweta ndị mmadụ ma anyị gaa ụdị ozi ọma ụfọdụ n’ihi oge anyị ji aga ya, ànyị nwere ike ịhazigharị ihe ụfọdụ ma jiri oge ahụ na-aga nletaghachi ma ọ bụ na-aga amụrụ ndị mmadụ Baịbụl? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-enweta ndị mmadụ ma anyị gaa ozi ụlọ n’ụlọ n’ụtụtụ Satọdee, ànyị nwere ike ịga mụọrọ ndị mmadụ Baịbụl n’ehihie ma ọ bụ ná mgbede? E kewe nletaghachi, e nwere ike ịgwa ndị nkwusa ndị ha na-amụrụ ihe nọ n’otu mpaghara ka ha rụọ. Ọ ga-eme ka ha nwee ike ịmụkwuru ọtụtụ ndị Baịbụl.
Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịgụrụ awa mgbe ọ bụla anyị gara ozi ọma, obi ga-aka adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enweta ndị mmadụ, ziekwa ha ozi ọma. Anyị chọpụta na e nwere ụdị ozi ọma ọ na-abụ anyị gaa anyị agaghị enweta ndị mmadụ n’ihi oge anyị ji aga ya, anyị nwere ike ịhapụgodị ụdị nke ahụ gawa ụdị ọzọ. Kpee ekpere ka Jehova, bụ́ “Onye nwe owuwe ihe ubi,” nyere gị aka ka i jiri oge gị na-eme ihe bara uru ma ị gaa ozi ọma.—Mat. 9:38.