Mmetụta nke Vidio Bụ́ The Bible—Its Power in Your Life
N’ịza ajụjụ ndị na-esonụ, kwuo mmetụta sitere n’obi i nwere banyere ozi dị na vidio a. (1a) Gịnị nyeworo ọtụtụ nde mmadụ ike ịgbanwe ndụ ha ka ọ ka mma? (Hib. 4:12) (1b) Gịnị dị mkpa iji nweta ike a ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ mmadụ? (2) Olee akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha iji nyere ndị di na nwunye aka (a) imeziwanye nkwurịta okwu ha na (b) ịchịkwa iwe ha? (3) N’ụzọ dị aṅaa ka otú ndị Kraịst si ele alụmdi na nwunye anya si agbanwe ndụ ezinụlọ ịka mma? (Efe. 5:28, 29) (4) Olee otú Jehova Chineke siworo setịpụ ihe nlereanya zuru okè n’inye ụmụaka ihe atọ ha chọrọ bụ́ ndị dịkwa ha nile mkpa, oleekwa otú ndị mụrụ ụmụ taa pụrụ isi mee otu ihe ahụ? (Mak 1:9-11) (5) N’ihi gịnị ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji were aka ha na-akụziri ụmụ ha Bible, gịnịkwa na-egosi ịdị mkpa nke ime otú ahụ n’ụzọ chiri anya? (Deut. 6:6, 7) (6) Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ na-akpali mmasị? (7) E wezụga ọmụmụ Bible, gịnị ọzọ ka Okwu Chineke na-akpali ndị mụrụ ụmụ inye ụmụ ha? (8) Olee otú ndụmọdụ Bible pụrụ isi nyere ezinụlọ aka inweta ihe e ji ebi ndụ? (9) Mgbe e tinyere ha n’ọrụ, ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa na-enye aka ibelata nsogbu ahụ ike dị iche iche? (10) Olee otú ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke siworo metụta ndụ gị? (11) N’ihi gịnị ka ikiri vidio a pụrụ iji gbaa onye ị kpọtụụrụ n’ozi ume ịnakwere ọmụmụ Bible ebe obibi?