Baịbụl—Ike Ọ Na-akpa ná Ndụ Gị
Baịbụl enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịgbanwe ndụ ọjọọ ha na-ebi. Olee ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl ọ ga-abụ anyị mee, ha enyere anyị aka imeri nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndụ taa? O doro anya na obi ga-atọ gị ụtọ ịmata azịza ajụjụ a ma i kirie fim isiokwu ya bụ The Bible—Its Power in Your Life (Baịbụl—Ike Ọ Na-akpa ná Ndụ Gị). Fim a bụ fim nke abụọ dị n’ime diiviidi bụ́ The Bible—A Book of Fact and Prophecy. I kirichaa fim ahụ, lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a a jụrụ n’okpuru ebe a.
(1) Gịnị mere anyị ji kwuo na Baịbụl abụghị akwụkwọ e dere naanị ka ọ tọọ ụtọ ọgụgụ? (Hib. 4:12) (2) Ọ bụrụ na Baịbụl nwere ike inyere mmadụ aka ịgbanwe ndụ ọjọọ ya, gịnịzi mere nsogbu ji zuo ụmụ mmadụ ahụ́? (3) Gịnị bụ isiokwu Baịbụl? (4) Olee amaokwu Baịbụl e kwuru okwu ha na fim ahụ, bụ́ ndị nwere ike inyere di na nwunye aka (a) iwepụtakwu oge na-ekwurịta okwu na (b) ịna-ejide onwe ha ma ibe ha kpasuo ha iwe? (5) Gịnị mere otú Onye Kraịst si ele alụmdi na nwunye anya ga-eji eme ka ezinụlọ ya na-adị n’udo? (Efe. 5:28, 29) (6) Olee otú Jehova si gosi ndị nne na nna ihe nlereanya kacha mma ha ga-eso? (Mak 1:9-11) (7) Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ ha na-atọ ụtọ? (8) E wezụga ịkụziri ụmụ ha Baịbụl, olee ihe ọzọ Baịbụl chọrọ ka ndị nne na nna na-emere ụmụ ha? (9) Olee otú ndụmọdụ dị na Baịbụl nwere ike isi nyere ezinụlọ aka inweta ihe ha ji ebi ndụ? (10) Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ịdị ọcha, ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụ oké mmanya, bụ́ ndị ọ ga-abụ e mee ha, ha emee ka mmadụ ghara ịna-arịa oké ọrịa? (11) Olee nkwa Chineke kwere na Baịbụl, bụ́ ndị na-eme ka obi sie anyị ike? (Job 33:25; Ọma 145:16) (12) Olee otú ihe ị mụtara na Baịbụl sirila mee ka otú i si ebi ndụ ka mma? (13) Olee otú i nwere ike isi jiri fim a nyere ndị ọzọ aka?