Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/01 p. 3
  • Mgbakọ—Oge Ịṅụrị Ọṅụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbakọ—Oge Ịṅụrị Ọṅụ!
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-akpọkọta Ndị Ya, Bụ́ Ndị Obi Dị Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ị̀ Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 9/01 p. 3

Mgbakọ—Oge Ịṅụrị Ọṅụ!

1 Mgbakọ Ndịàmà Jehova bụ oge ịṅụrị oké ọṅụ. Eri ihe karịrị otu narị afọ, mgbakọ ndị a atụnyewo ụtụ ná mmụba nke nọworo na-ewere ọnọdụ ná nzukọ anyị. Bido ná mmalite ndị dị nta, anyị ahụwo ngọzi bara ụba nke Jehova n’ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ. Ná mgbakọ mbụ anyị nwere n’oge a, na Chicago, Illinois, na 1893, e mere ngụkọta nke mmadụ 70 n’ime mmadụ 360 g̣aranụ baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova. Ngụkọta nke mmadụ 9,454,055 g̣ara usoro Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” e nwere n’afọ a gara aga n’ụwa nile, e mekwara mmadụ 129,367 baptism. Lee ihe magburu onwe ya na-akpata ịṅụrị ọṅụ ọ bụ!

2 Eri oge Bible, mgbakọta nke ndị Chineke abụrụwo ụzọ dị ịrịba ama nke isi na-enye ntụziaka sitere n’aka Jehova. N’oge Ezra na Nehemaịa, ìgwè mmadụ gere ntị n’ọgụgụ nke Iwu ahụ “site n’ìhè ụtụtụ ruo etiti ehihie.” (Neh. 8:2, 3) N’ihi ịghọta Iwu ahụ nke ọma karị n’oge ahụ, ndị ahụ nwere “oké ọṅụ.” (Neh. 8:8, 12) Anyị onwe anyị kwa na-aṅụrị ọṅụ na mgbakọ na-enye anyị ohere mara mma iji nweta ezi ntụziaka na nri ime mmụọ “n’oge ya” site n’aka Jehova, site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Mat. 24:45) Ebe Jisọs kwuru na ọ bụ “okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta” ka mmadụ ga-eji dị ndụ, mgbakọ dị oké mkpa maka ahụ ike ime mmụọ anyị.—Mat. 4:4.

3 Mgbalị Nile A Na-eme Iji Gaa Kwesịrị Ya: Anyị nile kwesịrị ime ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ anyị ịgazu ụbọchị nile nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke afọ a. Anyị kwesịrị ime atụmatụ ịbịarute n’oge kwa ụbọchị na ịnọgide ruo mgbe anyị sooro kwuo “Amen!” n’ekpere mmechi. Iji mezuo nke a ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị hazigharịa ihe omume anyị. Inweta ikike ịhapụ ọrụ n’ebe anyị na-arụ ọrụ iji gaa mgbakọ pụrụ isitụ ike. Ọ dị mkpa ka anyị mee ihe doro anya, ọ bụghị iwere ihe otú o si dapụta. Ọ bụrụ na ụlọ obibi na /ma ọ bụ usoro ime njem dị anyị mkpa, anyị kwesịrị ime ndokwa n’oge. Mgbalị ọ bụla ọ dị mkpa ka anyị mee ga-abụ ihe kwesịrị ya!

4 Ndị Jehova adịghị agụkọ ngọzi ndị a na-enweta n’ịga mgbakọ n’ego. Rịba ama ihe atụ nke ụfọdụ ndị kpebisiri ike ịga Mgbakọ Mba Nile nke Ime Ihe Chineke Na-achọ e nwere na 1958 na New York City. Otu nwanna nwoke mechiri ụlọ ọrụ ihe owuwu ya ruo izu abụọ iji nye aka n’afọ ofufo na iji gaa mgbakọ ahụ. Otu nwanna nwoke na Virgin Islands rere ala dị hekta abụọ ka ezinụlọ ya dum dị mmadụ isii nwee ike ịga. Otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ rere ntakịrị ụgbọ mmiri ha nwere injin ka ha wee nwee ike ịkpọrọ ụmụ ha atọ dị malite n’ọnwa abụọ ruo afọ asaa gaa mgbakọ ahụ. A gwara ụmụnna nwoke atọ bụ́ ụmụnne, ndị si California, na ọ bụrụ na ha ahapụ ọrụ ha, ndị ọzọ ga-anọchi ha tupu ha alọta. Otú ọ dị, nke ahụ egbochighị ha ịga mgbakọ ahụ a na-apụghị ichezọ echezọ.

5 Jehova Na-enye Ụgwọ Ọrụ Maka Ezi Mgbalị Anyị: Jehova na-ahụ ma na-agọzi mgbalị nke ndị ya. (Hib. 6:10) Dị ka ihe atụ, ná Mgbakọ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke e nwere na 1950, ndị garanụ nụrụ okwu ahụ dị ịrịba ama bụ́ “Usoro Ihe Ọhụrụ Dị Iche Iche.” Nwanna Frederick Franz kpaliri ma kpasuo mmasị mmadụ nile site n’ịjụ, sị: “Obi ọ̀ ga-adị ndị bịara mgbakọ mba nile a ụtọ ịmata na n’ebe a, n’abalị a, n’etiti anyị, e nwere ọtụtụ ndị gaje ịbụ ndị isi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?” Ihe karịrị afọ 50 ka nke ahụ gasịrị, anyị ka na-aṅụrị ọṅụ ná nghọta a e mere ka o dokwuo anya nke Abụ Ọma 45:16.

6 Mgbe ha gasịrị mgbakọ distrikti nke afọ gara aga, otu onyeisi ezinụlọ nwere ekele dere ihe na-esonụ, sị: “Ụmụnna, unu amaghị otú mgbakọ a siworo zọọ anyị. Ezinụlọ anyị kwagara n’obodo ukwu n’ihi ọrụ, ka o sina dị, ọnọdụ ime mmụọ anyị malitere ịma jijiji. . . . Anyị leghaara ibu ọrụ anyị dị ka ndị Kraịst anya. Anyị kwụsịrị ọbụna ịga nzukọ na ikere òkè n’ozi kpam kpam. . . . Mgbakọ a enyewo anyị ume ọhụrụ, anyị amaliteghachiwokwa isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na ịhazi ihe iji mezuo nke a.”

7 Jehova na-enye anyị nri ime mmụọ dị anyị mkpa. Ọ na-akpọ oriri mara abụba ná mgbakọ anyị. Ekele anyị nwere maka ndokwa a kwesịrị ime ka anyị nwee ike ikwu ihe Kọniliọs kwuru mgbe Pita onyeozi gara leta ya: “Ugbu a anyị onwe anyị nile nọ n’ebe a n’ihu Chineke, ịnụ ihe nile nke Onyenwe anyị nyeworo gị n’iwu.” (Ọrụ 10:33) Ka anyị mee ya ihe mgbaru ọsọ anyị ‘ịnọ n’ihu Chineke’ ná nnọkọ ọ bụla nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke afọ a ma ṅụrịa ọṅụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya