Ihe Mere Anyị Ji Hụ Òtù Ụmụnna Anyị Dum n’Anya
N’ime ụwa nke taa ịhụnanya na-adịghị n’ime ya, olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-egosipụta ịhụnanya siri ike n’ebe ụmụnna ime mmụọ anyị nọ? (1 Pita 2:17) Olee otú anyị pụrụ isi gosi ndị ọzọ na ezi òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ dị adị n’ezie? (Mat. 23:8) Ọ bụ site n’iji vidio bụ́ Our Whole Association of Brothers mee ihe. Ọ na-egosi ihe ndị mere anyị ji hụ ibe anyị n’anya. Lee ma ị ga-azali ajụjụ ndị a:
(1) Olee ihe omume atọ anyị na òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ na-emekọ ọnụ? (2) Olee otú ụmụnna anyị si egosipụta mkpebi siri ike ha meworo ime nkwusa (a) n’ọzara Alaska, (b) ná nnukwute ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị na Europe, nakwa (ch) n’oké ọhịa nke Peru? (3) Olee ngwa ọrụ dị irè karịsịa e ji agba àmà? (4) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na ime nkwusa bụ nnọọ ọrụ nkịtị? (5) Nye ihe atụ otú Ndịàmà Jehova siworo kasie ibe ha obi ma nyere ha aka n’oge nsogbu—ala ọma jijiji, ajọ ifufe, na agha obodo. (Lee ihe Takao kwuru na Teta! nke September 8, 1995, peeji nke 19, nakwa ihe Kotoyo kwuru na Teta! nke November 8, 1996, peeji nke 12.) (6) N’ụzọ dịgasị aṅaa bara uru ka anyị nile pụrụ isi gosipụta nnukwute akara ahụ e ji amata òtù ụmụnna Ndị Kraịst anyị? (Jọn 13:35) (7) Ruo n’ókè ha aṅaa ka anyị kwesịrị iji nzukọ ọgbakọ anyị kpọrọ ihe? (8) Olee otú inwe Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe a ga na-ezukọ si emetụta ndị na-enwebughị enwe? (9) Olee otú ụmụnna anyị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na Russia si lanarị n’ụzọ ime mmụọ mgbe a machibidoro ha iwu? (10) Ọbụna ugbu a, mgbalị dị aṅaa pụrụ iche ka ọtụtụ Ndịàmà na-eme iji gaa mgbakọ, n’ihi gịnịkwa? Olee otú nke a siworo gbaa gị ume? (11) Gịnị mere i ji kpebie iso ndị ọzọ na-efekọ ofufe n’ịdị n’otu, inyere ndị mmadụ aka n’oge mkpa, nakwa iji ikwesị ntụkwasị obi na-eme nkwusa mgbe ọ bụla na otú ọ bụla i nwere ike? (12) Gịnị mere ọ ga-eji dị mma inwe vidio a nke gị na igosi ya ọtụtụ ndị nwere mmasị ruo n’ókè i nwere ike?