Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” nke Ndịàmà Jehova nke 2003
1 Site n’ọnụ onye amụma ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Aịzaịa, Jehova nyere iwu, sị: “Ṅaanụ m ntị, unu ndị m; unukwa mba nke m, geenụ m ntị.” (Aịsa. 51:4) N’oge ikpeazụ a pụrụ iche nke na-esiwanye ike, ọ̀ bụ na anyị ekwenyeghị na ọ dị mkpa ịṅa ntị n’iwu Jehova ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ? Otu n’ime ụzọ ndị anyị si ‘aṅa Jehova ntị’ bụ irube isi n’iwu ya nke ịgbakọta maka ofufe. Lee ka anyị si atụ anya ohere ahụ pụrụ iche nke mgbakọ distrikti anyị na-eme kwa afọ na-enye anyị! Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova emewo ndokwa ọzọ ka e nwee ọtụtụ mgbakọ distrikti na Nigeria na 2003.
2 Dị ka e gosiri ná mbipụta Ụlọ Nche nke July 1, 2002, a ga-enwekwa mgbakọ mba nile ná mba ụfọdụ ndị a họọrọ, nke ndị ga-aga ha ga-esi gburugburu ụwa. E kenyere Nigeria ịga Ghana. Ebe ọ bụ na a ga-enwe mgbakọ mba nile ahụ ná mba ole na ole, ọ ga-abụ nanị ndị e kenyere ịga mgbakọ ndị ahụ ga-enwe ike ịga. Ma a ga-enwe ọnọdụ ga-eyi nke ahụ a ga-enwe ná mgbakọ mba nile ná mgbakọ distrikti nile. Ndị ozi ala ọzọ ga-abịa mgbakọ ụfọdụ, a ga-enwekwa ohere ịnụ ụfọdụ ahụmahụ ha. Olee ihe anyị pụrụ ime iji rite uru zuru ezu ná ndokwa a na-eme maka mgbakọ anyị?
3 Nọrọ Ya n’Ụbọchị Nile: Iji rite uru zuru ezu ná ntụziaka a na-enye site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, anyị kwesịrị ijide n’aka na anyị nọ ya n’usoro ihe omume ahụ dum. (Mat. 24:45) Ọ̀ dị mkpa ịrịọ onye were gị n’ọrụ ka o nye gị ohere ịhapụ ọrụ iji gazuo ụbọchị dum nke mgbakọ ahụ? Tupu Nehemaịa arịọ Eze Ataksakses ka o kwe ya gaa Jeruselem iji wughachi mgbidi ya, o “kpeere Chineke nke eluigwe ekpere.” (Neh. 2:4) N’otu aka ahụ, i kwesịrị ikpegara Jehova ekpere ka o nye gị obi ike iji rịọ onye were gị n’ọrụ ka o nye gị ohere ịhapụ ọrụ iji gazuo ụbọchị atọ dum nke mgbakọ ahụ. Gịnị ma ọ bụrụ na onye were gị n’ọrụ achọchaghị inye gị ohere ịhapụ ọrụ iji gaa? Ikekwe, ịkọwara ya na ntụziaka anyị na-anata ná mgbakọ anyị dị iche iche na-enyere anyị aka ịbụ ndị ọrụ na-eme ihe n’eziokwu, dị uchu, na ndị a pụrụ ịtụkwasị obi pụrụ ime ka o kwe ka ị gaa. Tụkwasị na nke a, ọ bụrụ na anyị nwere ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe, ọ ga-abụ ihe na-egosipụta ịhụnanya ịgwa ha atụmatụ ndị e mere banyere mgbakọ anyị ngwa ngwa o kwere mee.
4 Chekwaa Ego Maka Mgbakọ Ahụ: Tụkwasị ná ndokwa ndị ọzọ, UGBU A bụ oge ịmalite chekwawa ego maka mgbakọ distrikti ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe a ga-enwe mgbakọ. Ọzọkwa, ụfọdụ nwere ezinụlọ buru ibu. Ego dị ndị a, nakwa anyị nile mkpa maka inye onyinye, ịgba ụgbọ, iri ihe ná mgbakọ, na maka ihe ndị ọzọ pụrụ ịdapụta. Ọ dị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nwere ezinụlọ buru ibu mkpa ime atụmatụ tupu oge eruo na ichekwa ego ga-ezunụ ka ezinụlọ ha dum nwee ike ịga mgbakọ ahụ. Ihe dị irè a pụrụ ime bụ ibu ụzọ mee atụmatụ ego ole a ga-achọ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya iburu ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe n’uche mgbe ị na-eme atụmatụ gị. Jirizie ọnwa ole fọrọnụ malite ugbu a ruo mgbe unu ga-enwe mgbakọ distrikti unu kee ego ole e mere atụmatụ ya. Nke a bụ ego ole ọ ga-adị mkpa ka ị na-echekwa kwa ọnwa. Kwa ọnwa, mee ka ọ bụrụ iwu na ị ga-ebu ụzọ wepụ ego a iche dị ka ego mgbakọ. A pụrụ ịdị na-etinye nke a n’obere igbe ma ọ bụ n’envelopu. Otú ọ dị, a pụrụ ike ego ahụ a na-echekwa kwa ọnwa ụzọ anọ ma na-edebe ya iche kwa izu. Ihe dị mkpa bụ na i kwesịghị ichere ruo mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ka mgbakọ malite tupu ị malite ichekwawa ego maka njem a a na-eme kwa afọ.—Ilu 21:5.
5 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agbalị izitere ọgbakọ ọ bụla fọm Room Request ga-ezuru ha. Onye ọ bụla nke chọrọ inweta ebe obibi site ná ndokwa nke mgbakọ mere maka inweta ebe obibi kwesịrị idenye ihe nile a chọrọ na fọm ahụ n’ụzọ doro anya ma nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e dejupụtara fọm Room Request ọ bụla e zigara nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile n’ụzọ dị mma n’anya na nke ga-ekwe ọgụgụ. Biko hụ na i denyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye aha ụmụaka n’ihe ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ụfọdụ ọgbakọ depụtara nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka o sie ike ime ndokwa maka ebe obibi zuru ezu. Ọ bụrụ na unu chọrọ ohere karịrị nke e nyere na fọm ahụ, jirinụ mpempe akwụkwọ ọzọ dee ya. Ọ bụrụ na e dere aha ihe karịrị otu onye na fọm ahụ, biko dejupụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. E kwesịrị izipụ fọm ahụ n’ezi oge tupu oge mgbakọ eruo. BIKO, EZITERELA Society fọm Room Request ahụ. E kwesịrị iziga ya n’adres mgbakọ nke kwesịrị ekwesị nke e depụtara n’azụ fọm ahụ.
6 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha na-akwado Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a na-emezu ihe abụọ site n’ịṅa ntị ná ntụziaka a:
7 Ichekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ọnụ ala karị. Kama ego anyị ịgara ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dara ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị Ngalaba Ụlọ Obibi na-eme. A kọwara mmụọ a nke ichebara ndị ọzọ echiche na 1 Jọn 3:17, ọ bụkwa ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
8 Igosipụta nrubeisi nye ntụziaka ndị Society na-enye: Nke a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi ihe ndị na-echegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-ekwu, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’isu ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na anyị na-akwado ha n’ụzọ zuru ezu. Ebe ọ bụ na a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị maka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma isi na-akwado mgbalị ha. Ọ bụrụgodị na ihe na-amasị anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị nakwa ụwa si na-ahụ ya, na-akwalite mmụọ ịhụnanya, nke ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
9 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha maka mgbakọ, karịsịa ndokwa ndị metụtara ebe obibi. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ bụ́ ezi ihe nlereanya, ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche, bụ́kwa ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, ruru eru inweta enyemaka site ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ọ bụ ọgbakọ ebe ha na-aga nzukọ kwesịrị ime ndokwa ndị ọzọ maka ilekọta ndị nwere mkpa pụrụ iche, kama ibokwasị ndị nhazi mgbakọ ibu ọrụ a. Ndị okenye na ndị ọzọ, bụ́ ndị maara ọnọdụ onye ahụ, pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ́ na-esichaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’igbo mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jems 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
10 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta banyere ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye enyemaka ahụ dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu elu peeji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA PỤRỤ ICHE.” Ọ bụ nanị ndị nwere mkpa pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e dekwasịrị ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya iji hụ na e denyezuru ihe nile a chọrọ, na o ziri ezi, nakwa iji nwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eruo maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere dị n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezi oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezigaziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ kpọmkwem mara banyere ụlọ ahụ.
11 Ndị nwere mkpa pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma rịọ ka e nye ha ụlọ mgbe ha rutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
12 Ọtụtụ ndị egosipụtawo ekele maka ndokwa ndị a na-eme maka ụlọ obibi n’oge mgbakọ. Ị̀ so na-enwe ekele maka ọtụtụ ndokwa ndị e mere maka gị? Obi dị Society ụtọ inye ebe obibi ndị dị ntụsara ahụ, ndị aka pụrụ iru n’oge mgbakọ, na-enye anyị nile ohere itinye uche n’abamuru ime mmụọ nke mgbakọ ahụ na n’usoro ihe omume ya.
13 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla ịga mgbakọ kasị dịrị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa iji mee ndokwa maka oche, ụlọ, akwụkwọ, na ihe ndị ọzọ ga-ezunụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji gaa mgbakọ na-abụghị nke e kenyere unu ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
14 Jiri Ọchịchọ Obi Nye Onwe Gị Dị Ka Onye Ọrụ Afọ Ofufo: N’oge mgbakọ, ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo na-enye aka iji mee ka ngalaba dị iche iche na-aga nke ọma. Ndị atendantị nọ n’ụlọ mgbakọ na n’ebe a na-adọba ụgbọala na-enye nduzi maka ebe ịnọdụ ala ma na-eche ụgbọala anyị nche n’ehihie. Ngalaba Na-ahụ Maka Idebe Ihe Ọcha nwere ihe ùgwù nke ịhụ na anyị nọgidere na-enwe aha ọma anyị n’ihe banyere ịdị ọcha, na-eme ka ebe anyị na-anọ efe ofufe na-adị ọcha karịa mgbe anyị na-ejighị ya mee ihe. Ànyị pụrụ inyere ngalaba ndị a ma ọ bụ ndị ọzọ bụ́ ebe ndị pụrụ ịchọ nkwado anyị aka? Ị̀ ga-ewepụta onwe gị n’afọ ofufo iji soro ụmụnna gị jee ozi “n’otu ubu”?—Zef. 3:9.
15 Anyị Bụ Ihe A Na-ekiri Ekiri n’Ebe A Na-eme Ihe Ngosi: Ndị mmadụ hà na-ahụ ọdịiche dị n’etiti Ndịàmà Jehova na ndị nke ụwa a? Kpọmkwem! Lee ihe ụfọdụ ndị manịja họtel n’otu obodo kwuru: “Anyị na ndị na-aga mgbakọ na-emekọ ihe mgbe nile, ma unu bụ ndị kasị ekwenye ekwenye ma nwee obiọma.” “N’izu gara aga, anyị na ndị òtù okpukpe ọzọ mekọrọ ihe. Ọdịiche dị n’etiti unu na ha pụtara ìhè.” “Anyị maara na anyị pụrụ inwe obi ike na unu ga-enyere anyị aka nakwa na unu ga na-ekwenye ekwenye mgbe nile.” Ọ̀ bụ na ụdị okwu ndị a adịghị enyere anyị aka ịghọta otú “amamihe nke sitere n’elu” si enwe mmetụta dị mma n’àgwà anyị? (Jems 3:17) Ebe anyị bụ “ihe a na-ekiri ekiri n’ebe a na-eme ihe ngosi n’anya ụwa,” ka àgwà anyị na-egosipụta mgbe nile ùgwù na ịma mma nke Chineke anyị, bụ́ Jehova.—1 Kọr. 4:9.
16 Ebe ọ bụ na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe,” mgbakọ distrikti dị anyị mkpa iji nyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ime mmụọ. (1 Kọr. 7:31) Ime ndokwa iji gaa ụbọchị nile ga-achọ mgbalị, ma mgbalị ọ na-ewe kwesịrị ya. A kwadebewo Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” nke afọ a iji nyere anyị aka ịnọgidesi ike ka anyị na-echere mgbe a ga-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe n’isi ụwa Setan. Ka anyị ghara ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ịnata ntụziaka nke Jehova kwadebewooro anyị.—Aịsa. 51:4, 5.
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday
9:20 ụtụtụ - 4:40 uhuruchi
Saturday
9:00 ụtụtụ - 4:20 uhuruchi
Sunday
9:00 ụtụtụ - 3:20 uhuruchi