Igbe Ajụjụ
◼ È kwesịrị idenye oge a na-eji eduzi ọmụmụ Bible ezinụlọ n’akụkọ ozi a na-enye n’ọgbakọ?
Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst na-eduzi ọmụmụ Bible ezinụlọ, nke gụnyere ụmụ ha ndị a na-emebeghị baptizim, nne ma ọ bụ nna ahụ pụrụ ịgụrụ ihe na-agaghị akarị otu awa n’izu, otu nletaghachi n’izu, na otu ọmụmụ Bible n’ọnwa. Otú ahụ ka a ga-eme ya ọbụna ma ọ bụrụ na a na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ karịa otu awa, ma ọ bụ na-eduzi ya karịa otu ugboro n’izu, ma ọ bụkwanụ na-eduziri ya ụmụaka ahụ otu otu.—Lee akwụkwọ bụ́ Ozi Anyị, peeji nke 104, para. nke 2.
Ọ bụrụ na ndị nile nọ n’ezinụlọ ahụ bụ Ndịàmà e mere baptizim, mgbe ahụ, a gaghị edenye ma ọmụmụ ihe ahụ ma oge e ji duzie ya n’akụkọ ozi a na-enye n’ọgbakọ, (ọ gwụla ma e nwere nwa ka na-amụ akwụkwọ nke abụọ mgbe e mesịrị ya baptizim). Nke a bụ n’ihi na akụkọ ozi ubi nke ọgbakọ na-egosi n’ụzọ bụ́ isi ihe ndị a rụzuru n’ikwusa ozi ọma nakwa n’ịkụziri ndị na-abụghị ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ma bụrụ ndị e mere baptizim eziokwu Bible. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Otú ọ dị, nke a adịghị ebelata mkpa ọ dị iduzi ọmụmụ ihe dị otú ahụ mgbe nile.
Ọ bụ ibu ọrụ nke nne na nna bụ́ Ndị Kraịst iduziri ụmụ ha ọmụmụ ihe. Ndị chọrọ enyemaka n’ịmalite ma ọ bụ n’ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ ha kawanye mma pụrụ ịrịọ ndị okenye maka enyemaka. Ọ bụrụ na ọnọdụ emee ka o kwesị ekwesị ka onye nkwusa ọzọ duziere nwa nke ezinụlọ Ndị Kraịst, bụ́ onye a na-emebeghị baptizim, ọmụmụ ihe, e kwesịrị ime ka onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye nlekọta ozi ubi mara. Ọ bụrụ na a kwadoo ka e duzie ọmụmụ ihe dị otú ahụ, onye na-eduzi ya pụrụ idenye ọmụmụ ihe ahụ n’akụkọ ozi ya dị nnọọ ka o si edenye ọmụmụ Bible ọ bụla ọzọ.
Ịzụ ụmụ n’ụzọ nke Jehova na-ewe nnọọ oge na mgbalị karịa nke a na-edenye n’akụkọ ozi ubi. (Deut. 6:6-9; Ilu 22:6) E kwesịrị ịja ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst mma maka otú ha si ebu ibu ọrụ ha dị ukwuu nke ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Efe. 6:4.