Ntụziaka Maka Ndị Na-eme Ihe Omume ná Nzukọ Ije Ozi
Malite n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a, anyị ga na-egbubilata ntụziaka anyị na-enye n’usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi. Ihe ndị a ga-akọwa n’isiokwu a ga-eme ka a ghọtakwuo ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Mee 2009, n’isiokwu bụ́ “Otú E Kwesiri Isi Akwadebe Nzukọ Ije Ozi.”
◼ Okwu: Ihe ọ pụtara bụ na onye e kenyere ya ga-ekwu ihe e dere n’ihe omume ya otú e si ekwu okwu ihu ọha. Ndị na-ege ntị agaghị etinye ọnụ na ya. Ihe ọkà okwu ga-elekwasị anya bụ ịkọwa ihe ga-akacha baara ọgbakọ uru.
◼ Ajụjụ na Azịza: A ga-eme ya otú e si eme Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ma a gaghị agụ paragraf ya agụ, ọ gwụkwala ma e kwuru ka e mee otú ahụ. Onye e kenyere ya ga-ekwu okwu dị nkenke iji malite ya, kwuokwa okwu dị nkenke ná mmechi, ọ ga-ajụkwa ajụjụ paragraf nke ọ bụla. Onye na-eduzi ya ekwesịghị ikwu oké okwu. Ọ bụrụ na oge dị, e nwere ike gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị ezigbo mkpa.
◼ Okwu Ndị Na-ege Ntị Ga-etinyetụ Ọnụ: A ga-ekwu ya ka okwu ihu ọha, ma onye na-eme ihe omume a ga-agwa ndị na-ege ntị ka ha tinyetụ ọnụ n’ebe ụfọdụ. Onye ahụ agaghị ekwu ya naanị ka okwu ihu ọha, ọ gaghịkwanụ abụ ajụjụ na azịza.
◼ Ihe Ngosi na Ajụjụ Ọnụ: Ọ bụrụ na e kwuru mee ihe ngosi, ọ pụtara na nwanna nwe ihe omume ahụ ka ọ dị n’aka ịhụ na e mere ihe ngosi; ọ bụghị iwu na ọ bụ yanwa ga-eme ihe ngosi ahụ. Ụmụnna ndị ọ ga-agwa ka ha meere ya ihe ngosi ahụ kwesịrị ịbụ ndị ruru eru na ndị e ji ama atụ n’ọgbakọ, o kwesịkwara ịgwa ha agwa n’oge ma o kwe mee. Ọ ga-akacha mma ka a ghara ịgwa ndị nkwusa ọhụrụ na ndị nkwusa na-amachaghị otú e si ezi ozi ọma ka ha mee ihe ngosi naanị ka ọ bụrụ na ha gbagotere n’ikpo okwu. Ma, e nwere ike iji ha mere ndị nwe ụlọ. Ndị nkwusa na-eme ihe ngosi kwesịrị ịhụ na ha agbanyereghị ndị na-ege ntị azụ. Ya bụrụ ajụjụ ọnụ, ndị a ga-agba ya agaghị anọ n’oche ha zaa ajụjụ a ga-ajụ ha, ha ga-agbagote n’ikpo okwu. E kwesịrị ịmụgharị ihe ngosi na ajụjụ ọnụ. Ya bụrụ na ọ dị mkpa ka nwanna nwe ihe omume a gbubilata oge ihe omume ya kwesịrị iwe, o kwesịrị igbubilata ihe yanwa ga-ekwu iji hụ na e mere ihe ngosi ma ọ bụ gbaa ajụjụ ọnụ. Tupu ohu na-eje ozi agwa onye nkwusa na ya ga-agba ya ajụjụ ọnụ ma ọ bụkwanụ gwa ya ka o meere ya ihe ngosi, o kwesịrị ịgwa onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ ma ọ bụ okenye ọzọ ndị ahụ ọ chọrọ iji eme ya.
Ọ bụrụ na e nwere ihe omume e nyere ntụziaka pụrụ iche maka ya, e kwesịrị ilezi anya mee ya otú ahụ e si kwuo ka e mee ya. Ọ bụrụ na e si otú a e kwuru na-eme ihe omume ndị dị ná Nzukọ Ije Ozi, ọ ga-eme ka ihe omume Nzukọ Ije Ozi gaa “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”—1 Kọr. 14:40.