Bụrụ Onye Dị Nsọ n’Omume Gị Nile
1. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị dị nsọ n’omume anyị nile?
1 Dị ka ndị ohu nke Chineke dị nsọ, bụ́ Jehova, anyị na-agbalị ịbụ ndị dị nsọ n’omume anyị nile. (1 Pita 1:15, 16) Nke a pụtara na anyị ga-agbalị itinye ụkpụrụ Jehova n’ọrụ n’akụkụ nile nke ndụ anyị. Mgbakọ distrikti nke afọ a ga-enye anyị ohere pụrụ iche igosipụta omume dị nsọ.
2. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta omume ọma n’ebe e nyere anyị ụlọ nakwa na họtel?
2 N’ebe E Nyere Anyị Ụlọ Nakwa na Họtel: Manịja otu họtel nke ndị bịara mgbakọ nọrọ na ya n’afọ gara aga, kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova bụ nnọọ ndị ezi mmadụ. . . . Ọ bụ ndị dị ka unu ka anyị chọrọ.” Irube isi n’ihe ncheta ndị na-esonụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe aha ọma: (1) Mgbe ị nọ na họtel, enwetala ọnụ ụlọ karịrị ole ị ga-eji mee ihe n’ezie, etinyekwala ihe karịrị mmadụ ole a chọrọ n’ọnụ ụlọ i nwetara. (2) Ọ bụrụ na ị chọghịzi iji ọnụ ụlọ e nyere gị mee ihe, gwa ndị nwe họtel ahụ ozugbo. (3) Esila nri n’ọnụ ụlọ ndị a na-adịghị esi nri na ha. (4) Gosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ n’ụzọ i si emeso ndị ọrụ họtel, karịsịa n’oge ọtụtụ ndị na-abịa ka e nye ha ụlọ nakwa n’oge ha na-ala ala.—Gal. 5:22, 23.
3. Olee otú omume Ndịàmà na-eto eto pụrụ isi kpalie mmasị nke ndị ọzọ?
3 Àgwà ọma anyị pụrụ ịgba àmà n’ụzọ dị irè. N’afọ gara aga, otu Onyeàmà na-eto eto ji olu ọma rịọ odeakwụkwọ họtel ka o nye ya akwụkwọ na mkpịsị akwụkwọ ma mesịa kelee ya. Nke a metụrụ odeakwụkwọ ahụ n’ahụ́, a nụkwara mgbe o kwuru, sị: “O siri nnọọ ike ịhụ ndị na-eto eto nwere olu ọma otú a.” Otú ọ dị, e nwewo ebe ole na ole a hụrụ ka ụmụaka na-enweghị onye na-elebara ha anya na-egwu mmiri, na-egwuri egwu na steepụ, na-ekwu okwu n’olu dara ụda, ma na-agbagharị na paseji. Ndị mụrụ ụmụ ekwesịghị ịhapụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe masịrị ha kama ha kwesịrị ịdị na-elebara ha anya iji hụ na omume ha na-ewetara Jehova otuto.—Ilu 29:15.
4. Olee ndị kwesịrị ịnọ n’ụlọ obibi dị n’ala mgbakọ?
4 N’ọtụtụ ebe a na-enwe mgbakọ, a na-enye ndị mmadụ ụlọ n’ala mgbakọ, ma ọ́ bụghị n’ihe owuwu ndị na-agaghị adịte aka ọ bụrụ n’ụlọ obibi, bụ́ ndị e wuru maka nzube ahụ. Biko buru n’uche na nzukọ a agaghị enwe ike iwu ụlọ obibi maka ndị nile na-abịa mgbakọ. Ọ bụ nanị ndị Ngalaba Ụlọ Obibi kwadoro kwesịrị ihi n’ala mgbakọ. Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe ọzọ, i kwesịrị ikwenyere Ngalaba Ụlọ Obibi ma nọrọ ebe e nyere gị ụlọ.
5. Olee otú anyị pụrụ isi chebara ndị ọzọ echiche mgbe anyị na-eri nri n’ụlọ nri?
5 N’ụlọ Nri: Otu onye na-eke nri n’otu ụlọ nri dịdebere otu ebe a na-enwe mgbakọ, kwuru, sị: “Ndịàmà dị iche. Ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù.” Àgwà ọma na-agụnye ịghara ikwu okwu na ịchị ọchị n’olu dara ụda, bụ́ nke pụrụ ịkpasu ndị ọzọ na-eri nri iwe. Ọbụna mgbe anyị na-eri nri ma na-aṅụ ihe, anyị kwesịrị ime ihe nile iji nye Chineke otuto.—1 Kọr. 10:31.
6, 7. Gịnị ka omume ọma na-agụnye n’ala mgbakọ?
6 Ná Mgbakọ: Omume ọma anyị kwesịrị ịpụta ìhè karịsịa n’ala mgbakọ. Biko, gbasoo ntụziaka ndị atendantị, ma n’ebe ndọba ụgbọala ma n’ụlọ mgbakọ. (Hib. 13:17) Ezinụlọ kwesịrị ịnọdụ ala otu ebe kama ịhapụ ụmụ ha, gụnyere ndị nọ n’afọ iri na ụma, isoro ndị ọzọ na-eto eto nọdụ. E kwesịghị ịkwụnye ngwá ọ bụla e ji etinye ihe na teepu n’ebe a na-akwụnye ihe n’eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị e ji eme ihe n’ala mgbakọ, a pụkwara iji ha mee ihe nanị n’ụzọ na-agaghị adọpụ uche ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ị chọọ ise foto, i kwesịghị iji ọkụ foto mee ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na ị chọọ ise foto mgbe ihe omume na-aga n’ihu, i kwesịrị ịnọ n’oche gị see ya iji zere ịdọpụ uche ndị ọzọ na-ege ntị. Akpọbatala ndị na-ese foto n’ala mgbakọ maka ise foto. E kwesịrị ịgbanyụlata ígwè ozi bụ́ pager na fon ndị a na-eji agagharị agagharị ka ha ghara ịdọpụ uche ndị mmadụ. Ọ bụrụ na ị hụ ihe ọghọm n’ala mgbakọ, biko mee ka onye atendantị ma ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n’Ebe Ịnara Ọgwụ mara. A na-enwe ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru n’ala mgbakọ.
7 N’oge gara aga, ụfọdụ ndị azọwo ụzọ́ iji nweta akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara. E kwesịghị ịgba ọsọ ma ọ bụ ịkwa aka, iji nweta akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara. Kwụrụ n’ahịrị n’ụzọ dị n’usoro. A na-eme mgbalị iji hụ na ndị bịara mgbakọ nwetara akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara.—1 Kọr. 14:40.
8. Olee otú omume anyị na-eme n’ala mgbakọ si ewetara Chineke otuto?
8 Omume anyị na-eme ka anyị pụọ iche n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ na-ewetakwara Chineke anyị otuto. (1 Pita 2:12) N’ala mgbakọ, ọha na eze ga-ahụ omume Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, kpebisie ike ịbụ onye dị nsọ n’omume gị nile.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Gosipụta Omume Dị Nsọ
◼ Debe iwu họtel nile
◼ Na-elebara ụmụaka anya nke ọma
◼ Na-echebara ndị ọzọ echiche
◼ Anọla n’ụlọ obibi dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe ọzọ
◼ Na-eme ihe n’usoro mgbe ị na-anata akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara