Na-akpali Mmasị Ndị Mmadụ Mgbe Ị Na-ewegara Ha Magazin
1. Olee otú anyị pụrụ isi na-akpali mmasị ndị mmadụ mgbe anyị na-ewegara ha magazin?
1 Ọtụtụ ndị anyị na-ezute n’ozi na-anabata anyị, na-ejikwa obi ụtọ anara akwụkwọ anyị ma ha adịghị ekwe ka anyị na-eduziri ha ọmụmụ Bible mgbe nile. Otu ụzọ anyị pụrụ isi na-akpali mmasị ha bụ site n’iwegara ha magazin mgbe nile. Mgbe i nyere mmadụ magazin, dee aha na adres onye ahụ, ụbọchị i nyere ya magazin ahụ, magazin nke i nyere ya, na akụkụ Akwụkwọ Nsọ unu tụlere, nakwa ihe ọ bụla ị chọpụtara pụrụ igosi na onye ahụ nwere mmasị. Mgbe ọ bụla magazin ọhụrụ bịara, chọpụta isiokwu ga-amasị ndị ị na-ewegara magazin ma jiri isiokwu ndị a nyefee ha magazin ahụ. (1 Kọr. 9:19-23) Ka oge na-aga, otu ihe ha gụtara n’akwụkwọ anyị pụrụ ịkpali mmasị ha ma mee ka ha chọọ ịmụtakwu ihe.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị mmadụ chọọ Jehova ugbu a, oleekwa ihe ọzọ anyị pụrụ ime iji nyere ha aka?
2 Otú ọ dị, anyị na-aghọta na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agaghị aghọ ndị ohu Jehova nanị site n’ịgụ magazin anyị n’onwe ha. Ebe ọ bụ na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ chọọ Jehova ugbu a, gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ime iji nyere ha aka? (Zef. 2:2, 3; Mkpu. 14:6, 7) Anyị pụrụ ịkpali mmasị ha site n’ịgụ ma kọwaara ha otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị ji nlezianya họrọ, n’oge ọ bụla anyị wetaara ha magazin.
3. (a) Olee otú anyị pụrụ isi kwadebe mkparịta ụka ndị dabeere n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ? (b) Olee isiokwu ndị bi n’ókèala gị kasị enwe mmasị na ya?
3 Ịtụle Otu Akụkụ Akwụkwọ Nsọ: Chebara onye ị na-ewegara magazin mgbe nile echiche. Mgbe ọ bụla ị chọrọ iwegara ya magazin, chọta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ metụtara kpọmkwem mkpa ya bụ́ nke ị ga-agụ ma kọwaara ya. (Fil. 2:4) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na otu n’ime ndị ị na-ewegara magazin nwere onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ ya na nso nso a, ị pụrụ ịga nletaghachi na nke ya ugboro ugboro ma kọwaara ya ihe Bible kwuru banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ. Ị pụrụ iji ihe dị n’akwụkwọ Reasoning n’okpuru isiokwu ndị bụ́ “Death” (Ọnwụ) na “Resurrection” (Mbilite n’Ọnwụ) wee kwadebe okwu ndị a ga-adabere n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Ị pụkwara ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ site n’iso ya tụlee isiokwu ndị ọzọ yiri ha, dị ka otú a ga-esi kpochapụ ọrịa, ịka nká, na ọnwụ. Mkpa gị bụ ịchọta isiokwu ga-amasị onye ahụ ma jiri nke nta nke nta gosi ya ihe Bible na-ekwu banyere ya.
4. Gịnị mere o ji dị mkpa ime ka a ghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị ji na-eme ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya?
4 Mee Ka Ha Ghọta Ya: Ọ bụ ezie na ọ kasị mma ime ka mkparịta ụka dị otú ahụ dị mfe ma dị nkenke, e nwere ihe dị mkpa a chọrọ karịa ịgụ nanị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ a họọrọ. Setan emewo ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì n’ebe ozi ọma ahụ dị. (2 Kọr. 4:3, 4) Enyemaka dị ọbụna ndị maara Bible mkpa iji ghọta ya. (Ọrụ 8:30, 31) N’ihi ya, wepụta oge iji kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ma nye ihe atụ nke ga-eme ka a ghọta ya, dị nnọọ ka ị ga-esi mee ya ma ị na-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. (Ọrụ 17:3) Jide n’aka na onye ahụ hụrụ uru dị n’itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ ya.
5. Olee otú ị pụrụ isi malite iduziri onye ị na-ewegara magazin ọmụmụ Bible?
5 Ọ bụrụ na onye ahụ nwere mmasị n’ihe ọ na-amụta, jiri nke nta nke nta mee ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị ga na-agụ ma na-akọwara ya mgbe ọ bụla ị bịara ruo abụọ ma ọ bụ atọ. Chọọ ohere ị ga-eji webata broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ imesị malite iduziri onye ị na-ewegara magazin ọmụmụ Bible.