Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-eleru Anya
1 Jehova Chineke na Kraịst Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya na-enweghị atụ n’ịchọpụta kpọmkwem ihe ndị na-akpa ndị mmadụ nakwa n’inyere ha aka. (2 Ihe 16:9; Mak 6:34) Mgbe anyị chọpụtara ihe ndị na-amasị ndị anyị na-ezute n’ozi na nchegbu ndị ha na-enwe, mgbe ahụ ka anyị ga-enwe ike ịgbanwe ụzọ anyị si ezi ozi ọma iji kwekọọ n’ọnọdụ ha.
2 Na-eleru Nnọọ Anya: Jizọs bụ onye na-eleru anya. (Mak 12:41-43; Luk 19:1-6) N’otu aka ahụ, mgbe anyị rutewere na nke onye nwe ụlọ ma hụ ihe okpukpe ndị e ji chọọ ụlọ mma, ihe odide a mapawara n’ụgbọala, ma ọ bụ ihe ụmụaka ji egwuri egwú ndị dị n’èzí, ha pụrụ ime ka anyị hụ ihe anyị ga-agbakwasị ụkwụ na ya wee gbaa àmà dị mma n’ozi ọma.
3 Otú ihu mmadụ na omume ya dị pụrụ ime ka ị ghọtatụ otú obi dị ya. (Ilu 15:13) Ikekwe, ọnwụ onye ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ na-agbawa obi emeela ka ọ chọọ nkasi obi. Ọ pụrụ inwe obi ụtọ ma anyị gụọrọ ya otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. (Ilu 16:24) Ọ̀ dị onye nwe ụlọ ngwa ngwa ịpụ apụ, ka ò ku nwa na-ebe ákwà? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịka mma ime ndokwa ịgaghachi n’oge ọzọ. Site n’ichebara onye ahụ echiche na ‘igosi ya mmetụta,’ anyị pụrụ ịkpali ya ige ntị mgbe anyị gaghachiri.—1 Pita 3:8.
4 Na-eme Ka Okwu Gị Kwekọọ n’Ihe Ị Chọpụtara: Pọl onyeozi chọpụtara na obodo Atens nwere ebe ịchụàjà ha raara “Nye Chi A Na-amaghị Ama.” Nke a metụtara ụzọ o si zie ha ozi ọma, n’ihi na o kwuru, sị: “Ihe unu na-enye nsọpụrụ Chineke n’amaghị ama, nke a ka m na-ekwusara unu.” Ụzọ akọ a Pọl si kwusaara ha ozi ọma kpaliri ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ ichebara ozi Alaeze ahụ echiche na ịghọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 17:23, 34.
5 N’otu aka ahụ, anyị ileru anya ga-enyere anyị aka ịchọpụta ihe ndị na-amasị mmadụ ma mee ka okwu anyị kwekọọ n’ihe ahụ anyị chọpụtara. Na-ajụ onye nwe ụlọ ajụjụ ndị pụrụ ime ka ọ gwa gị echiche ya. Chee echiche banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị pụrụ ịgụrụ ya iji kpalikwuo mmasị ya. (Ilu 20:5) Anyị ịdị na-eleru anya na ịdị na-egosi ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ ga-enyere anyị aka iji nkà na-ekwusara ha ozi ọma.