Ụzọ Isi Jiri Akwụkwọ Bible Na-akụzi Malite Iduzi Ọmụmụ Bible
Obi ga-adị ọtụtụ n’ime anyị ụtọ iduzi ọmụmụ Bible ma ọ bụrụhaala na anyị enwee ike ịmalite ya amalite. Akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? pụrụ inyere anyị aka. E dere okwu mmalite dị na peeji nke 3-7 n’ụzọ ị ga-esi nwee ike iji akwụkwọ a mee ka onye nwe ụlọ nwee mmasị iso gị nwee mkparịta ụka dabeere na Bible. Ọ ga-adịrị ọbụna ndị na-enwechaghị ahụmahụ n’ozi ubi mfe iji ya malitere ndị mmadụ ọmụmụ ihe.
◼ Ị pụrụ isi otú a nwalee iji ihe e dere na peeji nke 3 malite ya:
Mgbe i kwuchara otu n’ime ihe ndị a kọrọ n’akụkọ ụwa ma ọ bụ otu nsogbu ka na-enye ndị bi n’ókèala unu nsogbu n’obi, jụọ onye nwe ụlọ ajụjụ ndị ahụ e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo na peeji nke 3, ma gwa ya ka ọ zaa ha. Ya zasịa ha, ị sapeta peeji nke 4-5.
◼ Ma ọ bụkwanụ ị pụrụ iji ihe ndị e dere na peeji nke 4-5 malite ya:
Ị pụrụ ikwu, sị, “Ọ́ gaghị amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na mgbanwe ndị e gosiri n’ihe osise a ewere ọnọdụ n’eziokwu?” Ma ọ bụ, ị pụrụ ịjụ, sị, “N’ime nkwa nile e depụtara ebe a, olee nke ị ga-achọ ịhụ mmezu ya?” Gee ya ntị nke ọma mgbe ọ na-aza ya.
Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosi mmasị pụrụ iche n’otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ, gosi ya ihe Bible na-akụzi banyere nke ahụ site n’ịtụle paragraf ndị kwuru banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ime akwụkwọ ahụ. (Lee igbe dị na peeji a nke ihe ntinye a.) Tụleenụ paragraf ndị ahụ otú unu ga-esi atụle ya ma ọ bụrụ na ọ bụ ọmụmụ Bible ka ị na-eduziri ya. Ị pụrụ iguzo kpọmkwem n’ọnụ ụzọ onye nwe ụlọ mee ya n’ime minit ise ruo iri n’oge mbụ gị na ya kwurịtara.
◼ Ụzọ ọzọ a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible n’akwụkwọ a bụ iji ihe e dere na peeji nke 6 jụpụta onye nwe ụlọ echiche ya:
Gosi onye nwe ụlọ ajụjụ ndị dị n’ebe ala peeji ahụ, ma jụọ ya, sị, “Ọ̀ dịtụla nke ị jụtụrụla n’ime ajụjụ ndị a?” Ọ bụrụ na o nwee mmasị n’otu n’ime ajụjụ ndị ahụ, sapeta paragraf ndị zara ajụjụ ahụ n’ime akwụkwọ ahụ. (Lee igbe dị na peeji a nke ihe ntinye a.) Ka gị na ya na-atụle ihe e dere na paragraf ahụ, ọ bụ ọmụmụ Bible ka ị na-eduzi.
◼ E nwere ike iji ihe e dere na peeji nke 7 gosi mmadụ otú e si eduzi ọmụmụ Bible:
Gụpụta ahịrịokwu atọ ndị mbụ dị na peeji ahụ, ị gụpụtachaa ha, sapeta isi nke 3, ma jiri paragraf nke 1-3 gosi ya otú e si amụ ya. Mee ndokwa ịlọghachi ka unu wee zaa ajụjụ ndị ahụ dị na paragraf nke 3.
◼ Otú e si eme ndokwa maka ịlọghachi:
Ná ngwụsị nke ọmụmụ ihe mbụ ahụ, mee ndokwa ịhụ na unu gara n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ. Ị pụrụ ikwu, sị: “Nanị n’ime minit ole na ole a, anyị amụtala ihe Bible na-akụzi banyere otu isiokwu dị mkpa. N’oge ọzọ, anyị nwere ike ịtụle banyere [jụọ otu ajụjụ unu ga-atụle n’oge ọzọ]. Ị̀ ga-achọ ka m bịa n’otu oge a n’izu ọzọ?”
Ka anyị na-abịarukwu oge Jehova kara aka nso, Ọ na-anọgide na-akwadebe anyị maka ọrụ anyị ji n’aka. (Mat. 28:19, 20; 2 Tim. 3:17) Ka anyị jiri ngwá ọrụ a magburu onwe ya mee ihe nke ọma n’ịmalite ọmụmụ Bible.
Igbe dị na peeji nke 3]
Ebe Ndị A Tụlere Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Ndị Dị na Peeji nke 4-5
◻ Mkpughe 21:4 (p. 27-28, para. 1-3)
◻ Aịsaịa 33:24; 35:5, 6 (p. 36, para. 22)
◻ Jọn 5:28, 29 (p. 72-73, para. 17-19)
◻ Abụ Ọma 72:16 (p. 34, para. 19)
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dị na Peeji nke 6
◻ N’ihi gịnị ka anyị ji ata ahụhụ? (p. 108-109, para. 6-8)
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nagide nchegbu nke ndụ? (p. 184-185, para. 1-3)
◻ Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ ezinụlọ anyị bụrụ nke na-enye obi ụtọ karị? (p. 142-143, para. 20)
◻ Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? (p. 58-59, para. 5-6)
◻ Ànyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ? (p. 72-73, para. 17-19)
◻ Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya maka ọdịnihu? (p. 25, para. 17)