Ị̀ Ga-amalitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl n’Ọnwa Ọktoba?
1. Olee akwụkwọ anyị ga-enyefe n’ọnwa Ọktoba?
1 Anyị ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa Ọktoba. Anyị gaghachi na nke onye gosiri mmasị, ọ ga-adị mma ka anyị nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? ma gbalịa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Olee otú anyị ga-esi mee ya ma anyị gaa nletaghachi?
2. Olee otú anyị nwere ike isi jiri traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? malitere onye naara magazin ọmụmụ Baịbụl mgbe anyị gara nletaghachi na nke ya?
2 Otú E Si Eji Traktị Ahụ Amalite Ọmụmụ Baịbụl: Anyị nwere ike ịsị: “Magazin ndị ahụ m nyere gị na-agba mmadụ niile ume ka ha mụọ Baịbụl, n’agbanyeghị obodo ha si ma ọ bụ okpukpe ha na-ekpe. [Nye onye ahụ traktị ahụ bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, gosikwa ya ajụjụ ndị dị n’ihu ya.] Ajụjụ ndị a bụ ụfọdụ ajụjụ na-agbagwoju ndị mmadụ anya, ma Baịbụl zara ha n’ụzọ doro anya. Ò nwere nke ọ bụla n’ime ha ị jụtụrụla?” Onye nwe ụlọ gwa gị ajụjụ ndị nke ọ jụtụrụla, gị na ya tụlee ebe a zara otu n’ime ha na traktị ahụ, gụọkwa otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ. Kọwaziere ya na ihe a bụ otu n’ime ajụjụ ndị Baịbụl zara. Nyezie ya otu akwụkwọ Bible Na-akụzi, gosikwa ya ebe e depụtara isiokwu ndị dị n’ime ya. Unu nwere ike ịtụle paragraf mbụ dị n’isiokwu ọ ga-ahọrọ. Ma ọ bụ i nwere ike ịsapeta paragraf kọwakwuru ajụjụ ahụ unu tụlere na traktị ahụ. Lee ebe ndị a kọwakwuru ajụjụ ndị dị na traktị ahụ:
● Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị n’ezie? (p. 9-11, para. 6-10)
● Ọ̀ dị mgbe agha na ahụhụ ga-akwụsị? (p. 12, para. 12-13)
● Olee ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? (p. 59-60, para. 7-8)
● Ọ̀ dị olileanya ndị nwụrụ anwụ nwere? (p. 71, para. 13-15)
● Olee otú m ga-esi kpee ekpere Chineke anụ ya? (p. 166-167, para. 5-8)
● Olee otú m ga-esi nwee obi ụtọ ná ndụ? (p. 9, para. 4-5)
3. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime ma anyị nye mmadụ traktị ahụ?
3 Ná nletaghachi mbụ ahụ ị gara, ọ bụrụ na ohere adịghị iji akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi onye ahụ otú e si enwe ọmụmụ Baịbụl, i nwere ike ime ndokwa ịbịa n’oge ọzọ ka gị na ya nwekwuo mkparịta ụka. Ọ bụrụkwa na ị chọpụta na onye ahụ enwechaghị mmasị ka gị na ya bido ịmụ Baịbụl, i nwere ike ikpebi ka gị na ya tụlekwuo ajụjụ ndị ọzọ dị na traktị ahụ n’oge ndị ọzọ ị ga-abịa nletaghachi na nke ya, tupu ị gwawa ya banyere akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ka anyị jiri traktị a mara mma malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ọnwa Ọktoba ma nyere ndị nwere ezi obi aka ‘ịmara eziokwu ahụ.’—Jọn 8:31, 32.