Mee Ka Okwu Chineke Na-akpa Ike n’Ahụ́ Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma
Ọ bụrụ na mmadụ anabata anyị ma anyị gaa ozi ọma, anyị kwesịrị ịgụrụ ya Baịbụl ka o nwee ike ịkpa ike n’ahụ́ ya. Ọ bụ ihe a ka e kwuru ná mgbakọ pụrụ iche anyị gara n’afọ gara aga. Ná mgbakọ ahụ, onye nlekọta sekit kwuru okwu isiokwu ya bụ́ “Mee Ka Okwu Chineke Na-akpa Ike n’Ahụ́ Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma.” Ị̀ ka chetara isi ihe ndị e kwuru n’okwu ahụ?
Gịnị mere Okwu Jehova ji akpa ike karịa okwu nke anyị?—2 Tim. 3:16, 17.
Olee otú Baịbụl si eru ndị mmadụ n’obi, na-eme ka ha lewe ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ka ha ghara ikwere ihe na-abụghị eziokwu, nakwa ka ha na-akpa àgwà ọma?—Gụọ Ụlọ Nche Jun 15, 2012, p. 27, para. 7.
Anyị gụọrọ onye anyị na-ezi ozi ọma Baịbụl, olee otú anyị ga-esi kọwaa ya ka onye ahụ nwee ike ịna-akwanyere ya ùgwù?—Gụọ akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 148, para. 3-4 na Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Mach 2013, p. 6, para. 8.
Anyị gụọ Baịbụl, gịnị mere anyị kwesịrị iji kọwaa ya nke ọma? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?—Ọrụ 17:2, 3; gụọ akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 154, para. 4 ruo p. 156, para. 5.