Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme n’Ụwa Nile Maka Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!”
Ndị Nkwusa Nọ n’Ọgbakọ Ọ Bụla Ga-ekesa Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Pụrụ Iche
1 Malite n’ọnwa May 2006, e bidoro kesawa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche iji mee ka ndị mmadụ mara banyere mgbakọ distrikti a ga-enwe n’ihe dị ka otu narị ala na iri ise na ise. A ga-ekesagide ya ruo mgbe mgbakọ distrikti nke afọ 2006 ga-agwụ n’ụwa nile. Ihe ndị ọzọ a na-eme ka ndị mmadụ mara banyere ha bụ mgbakọ distrikti pụrụ iche a ga-enwe na Germany, Czech Republic, na Poland n’ọnwa July nakwa n’izu mbụ nke ọnwa August 2006.
2 Ebe ọ bụ na anyị na-ebi ná ngwụsị nke oge ikpeazụ a, mgbakọ distrikti ahụ, bụ́ nke ga-eme ka nkwa Chineke kwere ịnapụta anyị n’ajọ usoro ihe a pụta ìhè, kwesịrị ịkpali ndị nwere ezi ọchịchọ obi ime ihe. Ihe a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ kwesịrị ịkpali ha iche echiche banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu. Iji nye ọtụtụ nde mmadụ ohere ịnụrụ ozi na-akasi obi ma na-enye olileanya, a na-agba ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke dị ihe karịrị iri puku itoolu na puku asatọ, n’ụwa nile ume ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi kpọsaa mgbakọ a a kpọrọ ha òkù ịbịa.
3 A ga-ezitere ọgbakọ nile akwụkwọ ịkpọ òkù ga-ezuru ha nke na onye nkwusa ọ bụla ga-enweta ihe ruru mkpụrụ 50. E nwere ike inye ndị ọsụ ụzọ nke ọ bụla fọrọnụ ka ha jiri gaa ozi. Ọgbakọ ọ bụla ga-amalite mkpọsa ahụ izu atọ tupu ụbọchị e kenyere ha ịga mgbakọ distrikti eruo. Nke a ga-eme ka ọgbakọ ahụ nwee ike ịgazu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ókèala ha nile, ma ọ bụrụkwarị na ha agaghị agazucha ya.
4 Anyị na-atụ aro ka e nyefee onye ọ bụla anyị nwetara n’ụlọ akwụkwọ ịkpọ òkù a, ma ọ bụrụ na o kwe mee. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ dị ndị a na-enwetaghị n’ụlọ, e nwere ike iji akọ kpafanyere ha otu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ọnụ ụzọ ha. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji kesachaa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ime izu atọ ahụ.
5 Obi siri anyị ike na mgbalị a a ga-eme iji kpọsaa Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” n’ụwa nile dị ka e kwuru n’isiokwu a, ga-agba ezigbo àmà. Ekpere anyị bụ ka Jehova gọzie unu nke ukwuu ná mgbalị unu ga-eme n’otu n’otu iji soro mee mkpọsa ahụ a ga-eme n’ụwa nile.