Ị̀ Na-eji Mpempe Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Maka Nzukọ Ọgbakọ Eme Ihe?
Otu ụbọchị, otu nwata nwoke dị afọ 11 hụrụ mpempe akwụkwọ e ji kpọsaa okwu ihu ọha a ga-ekwu, nke isiokwu ya bụ banyere hel. O mesịrị kọwaa, sị: “Nke a kpaliri mmasị m nke ukwuu, ebe ọ bụ na o yiri ka m na-emekarị ihe na-ezighị ezi. Nke a na-emekwa ka m na-echegbukarị onwe m banyere ịga na hel nke na-ere ọkụ mgbe m nwụrụ.” Nwata nwoke ahụ gara gere okwu ihu ọha ahụ. E mere ya baptizim ihe dị ka otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, bụ́ mgbe a mụụrụla ya Bible ruo ọtụtụ ugboro. Otú ahụ ka Karl Klein, bụ́ onye mesịrị jee ozi ọtụtụ afọ dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, si malite ozi ya dị ka Onye Kraịst. Ihe mere ihe a nile ji malitedị amalite bụ mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù maka nzukọ ọgbakọ ahụ ọ hụrụ.
Mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù a ka nọgidere bụrụ ngwá ọrụ dị irè e ji agba àmà taa. Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtawo na ha inye ya mmadụ bụ ụzọ magburu onwe ya isi kọwaa onwe ha ma malite mkparịta ụka. Ndị nne na nna pụrụ ime ka ụmụaka ha na-ekere òkè n’ozi site n’ịgwa ha ka ha nye ya onye ha bịara n’ụlọ ya izi ozi ọma. Ndị nkwusa bụ́ ndị na-eji akwụkwọ ozi agba àmà pụrụ iji ya mee ka a mara banyere nzukọ ọgbakọ site n’itinyekọta ya na akwụkwọ ozi ha na-ede. N’eziokwu, inye ndị ị na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù bụkwa ụzọ dị mfe isi kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ ọgbakọ anyị.
N’ihu mpempe akwụkwọ a, a kọwara nke ọ bụla n’ime nzukọ ọgbakọ n’ụzọ dị nkenke. Ebe ọ bụ na e deghị adres Ụlọ Nzukọ Alaeze na oge ndị e ji enwe nzukọ na ya, ọ ga-adị mkpa ka i dee ha mgbe ọ bụla ị na-enye ya mmadụ. E nwere ebe ị ga-ede ha ma ọ bụrụ na ị chọrọ. Ị̀ na-eji mpempe akwụkwọ a eme ihe nke ọma n’ozi gị?