Mbọ A Na-agbasi Ike n’Ụwa Dum Iji Kpọsaa Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!”
Ndị Nkwusa Ga-ekesa Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Pụrụ Iche Ọzọ
1 N’afọ gara aga, mkpọsa e mere n’ụwa dum iji kpọọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” ruru ndị nwere mmasị n’ahụ́. Ndị zara òkù ahụ pụrụ iche ji anya ha hụ ụdị oké oriri ime mmụọ Ndịàmà Jehova na-eri. Nke ahụ bụ nke mbụ ha na-abịa. (Aịsa. 65:13) Mkpakọrịta ha na òtù ụmụnna anyị nke dị n’otu nwere tọrọ ha ụtọ. (Ọma 133:1) Iji nyere ọtụtụ ndị o kwere mee aka ịga Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” anyị ga-ekesakwa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche n’ụwa dum ọzọ.
2 Ihe Ọ Rụpụtara n’Afọ Gara Aga: Dabere n’ozi ndị anyị natara n’akụkụ nile nke ụwa, mkpọsa a kpọsara Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” rụpụtara ihe magburu onwe ya. N’ọtụtụ ebe, ọhaneze nụrụ akụkọ ọma banyere anyị. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo, otu akwụkwọ akụkọ bipụtara akụkọ dị kọlụm isii banyere mkpọsa ahụ anyị mere. O kwuru, sị: “Iji gaa na nke onye ọ bụla tupu mgbakọ ha eruo, Ndịàmà na-abịa n’ike n’ike n’ógbè a. Ha na-anọkwu ogologo oge, jiri ụkwụ na-aga ebe dị anya karị, na-egbukwa okwu ha nkenke karịa ka ha na-emebu.” Nkesa a haziri ahazi anyị kesara akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ kpaliri mmasị otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi n’obodo ọzọ, nke mere ka ha kpọsaruo ya ala. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, akwụkwọ akụkọ atọ kọrọ banyere ọrụ anyị tupu e nwee mgbakọ ahụ. Otu onye nta akụkọ dere ọtụtụ isiokwu ruru peeji abụọ n’otu akwụkwọ akụkọ ná mbipụta nke ụbọchị Sunday. Ọ kọrọ nnọọ nke ọma banyere ihe ndị anyị kweere, òtù ụmụnna anyị, akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, na mgbakọ distrikti ahụ. Mgbe otu onye nkwusa na-enyefe akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’otu ọnụ ụzọ, ọ ka kpụ okwu n’ọnụ mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Ihe i kwuru bụ eziokwu. M ka nọ nnọọ na-agụ banyere ya n’akwụkwọ akụkọ!” Onye nwe ụlọ ọzọ kwuru n’olu dị elu, sị: “M ka nọ na-agụ banyere unu tupu gị awụchaa! Ihe ahụ i ji ọ̀ bụ akwụkwọ i ji akpọ mụnwa òkù?” Mgbe ahụ, o kwukwara, sị, “Ihe a Ndịàmà Jehova na-eme dị ezigbo mma.”
3 Ọtụtụ ndị nwere mmasị ji akwụkwọ e ji kpọọ ha òkù n’aka mgbe ha na-abịa n’ebe e nwere mgbakọ ahụ. Ụfọdụ ndị nwere mmasị si obodo ndị dị anya nyara ụgbọala ha bịa iji nọrọ ná nnọkọ ụfọdụ nke mgbakọ ahụ. Mbọ anyị gbasiri ike ịkpọ ndị ọzọ mere ka ndị bịaranụ bukwuo ibu. N’otu mba, ndị bịaranụ ji pasent iri abụọ na asaa karịa ndị bịara mgbakọ distrikti n’afọ bu nke ahụ ụzọ.
4 Ịrụzu Ókèala Unu: Unu nwere ike ịmalite ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ma ọ fọdụ izu atọ tupu unu agaa mgbakọ. E kwesịrị ime mgbalị nile e nwere ike ime iji rụzuo ókèala dum nke ọgbakọ unu. N’ọgbakọ ndị nwere ókèala buru oké ibu, ndị nkwusa nwere ike iji akọ kpafanye otu akwụkwọ ịkpọ òkù n’ọnụ ụzọ nke ndị a na-enwetaghị n’ụlọ n’izu ikpeazụ tupu mgbakọ ahụ. Ọgbakọ dị iche iche kwesịrị ịgbalị ka ha kesachaa akwụkwọ ịkpọ òkù nile e nyere ha ma rụzuo ókèala ha ruo ókè o kwere mee. Ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ ga-ewerezi nke ọ bụla fọdụrụnụ jee ozi.
5 Ihe I Nwere Ike Ikwu: I nwere ike ikwu ihe yiri nke a: “Anyị na-ekesa akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ òkù n’ụwa dum ka ha bịa nnọkọ a ga-enwe n’oge na-adịghị anya. Nke a bụ nke gị. Ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a kọwara n’akwụkwọ ịkpọ òkù a.” Igbu okwu nkenke ga-eme ka a gazuo ọtụtụ ebe. Ma, ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere ajụjụ, wepụta oge zaa ajụjụ ya. Ọ bụrụ na mmadụ gosiri mmasị, dee ya edee ma gaghachi na nke onye ahụ ngwa ngwa o kwere mee.
6 Ọ dị mkpa nke ukwuu ka anyị gbalịa iso Kraịst. (Jọn 3:36) Mgbakọ distrikti anyị nke a ga-enwe n’oge na-adịghị anya ga-enyere ndị nile ga-abịa aka ime nke ahụ kpọmkwem. N’ezie, anyị na-atụ anya na a ga-agba àmà dị ukwuu ọzọ n’ihi mbọ a anyị ga-agbasi ike iji kpọsaa Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” Ya mere, jiri ịnụ ọkụ n’obi kpọọ ọtụtụ ndị o kwere mee òkù. Ka Jehova gọzie mgbalị gị nke ukwuu ka i so ná mkpọsa a e jikọtara aka ọnụ na-eme n’ụwa dum.