“Enweghị M Mmasị”
1 Nke ahụ bụ ihe ndị mmadụ na-ekwukarị n’ebe ụfọdụ ma anyị chọọ izi ha ozi ọma. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịghara ịda mbà n’obi ma ọ bụrụ na ndị anyị chọrọ izi ozi ọma ekwuo na ha enweghị mmasị? Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ozi ọma?
2 Nọgide Na-enwe Ọṅụ: Ọ bụrụ na anyị echeta ihe mere na ọtụtụ mmadụ adịghị enwe mmasị n’ozi ọma, nke ahụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ. Ndị kweere n’ozizi evolushọn ma ọ bụ ndị a zụlitere n’ebe ndị mmadụ na-ekweghị na Chineke dị, nwere ike ha agaghị ama uru Bible bara. Ndị ọzọ nwere ike bụrụ ndị ike ige ozi ọma gwụrụ n’ihi omume ihu abụọ ha chọpụtarala n’okpukpe. Ihe na-eme ka ụfọdụ ndị ghara inwe mmasị pụrụ ịbụ n’ihi nkụda mmụọ na enweghị olileanya. (Efe. 2:12) Ndị ọzọ ‘achọghị ịma’ banyere ozi ọma anyị n’ihi na nchegbu nke ndụ a na-anyịgbu ha.—Mat. 24:37-39.
3 N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị adịghị egosi mmasị n’ozi ọma ahụ, anyị pụrụ inwe ọṅụ n’ihi na anyị maara na mgbalị anyị na-ewetara Jehova otuto. (1 Pita 4:11) Ọzọkwa, ịgwa ndị ọzọ eziokwu ahụ, ọbụnadị ndị na-adịghị eji ya akpọrọ ihe, na-ewusi okwukwe anyị ike. Ka anyị hụ na anyị na-ele ndị nọ n’ókèala anyị anya otú Jehova si ele ha. O nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị obodo Nineve, bụ́ ndị na-amaghị “nke bụ́ aka nri ha na aka ekpe ha.” (Jona 4:11) Ozi ọma ahụ dị ndị nọ n’ókèala anyị mkpa! N’ihi ya, ike izi ha ozi ọma ekwesịghị ịgwụ anyị, kama anyị kwesịrị ịdị na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi mee ka ha nwewe mmasị n’ozi Bible.
4 Soro Ha Kwurịta Ihe Na-enye Ha Nsogbu n’Obi: Ikekwe, iji malite okwu gị, ị pụrụ ikwulite otu ihe na-enye ndị bi n’ókèala unu nsogbu n’obi ma jụọ onye nwe ụlọ ihe o chere banyere ya. Gee ntị mgbe ọ na-agwa gị ihe o chere, ya kwusịa, i gosi ya okwu nkasi obi dị na Bible banyere ihe ahụ na-enye ya nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe otu ọdachi mere n’otu ógbè, ihe otu Onyeàmà bịara na-eme bụ, ya ruo n’ụlọ ọ bụla, ya agwa ndị nwe ụlọ otú ọdachi ahụ si wute ya. O kwuru, sị, “Ozugbo m mere otú ahụ, ndị nwe ụlọ na-amalite iso m kwurịta okwu. Eziri m ọtụtụ mmadụ ozi ọma n’ụbọchị ahụ n’ihi mmasị ahụ m gosiri n’ihe ndị na-eme ná ndụ ha.”
5 Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu ọ bụla ụmụ mmadụ na-enwe taa. Gbalịa ịchọpụta nsogbu nke kasị enye onye nwe ụlọ nsogbu n’obi. O nwere ike ikwe ka ị kọwaara ya ihe Bible kwuru mere ọ ga-eji enwe olileanya. Ọ bụrụgodị na ọ jụ, o nwere ike nwee mmasị ige ntị “ọbụna n’oge ọzọ.”—Ọrụ 17:32.