Olee Otú I Si Azaghachi n’Omume Ọ̀ Gbasara M?
1 Omume ọ̀ gbasara m bụ enweghị mmetụta, enweghị mmasị ma ọ bụ nchegbu. Ọ bụ otu n’ime àgwà ndị a na-ahụkarị na ndị ka sie ike anyị na-ezute n’ozi. Olee otú i si azaghachi ya? Ò mewo ka i selata aka n’ozi gị? Olee otú ị pụrụ isi merie ya ka i wee jiri ozi Alaeze ahụ jekwuru ndị mmadụ?
2 Nke mbụ, chọpụta ihe mere ndị nọ n’ókèala gị ji eme omume ọ̀ gbasara m. Ọ̀ bụ n’ihi na ha enwewo mmechuihu n’aka ndị ọchịchị na ndị ndú okpukpe ha? Hà na-eche na e nweghị ụzọ mgbapụ site ná nsogbu ndị ha na-eche ihu? Hà na-enwe obi abụọ banyere nkwa nke ihe ka mma? Ọ̀ bụ na ha adịghị achọ iche echiche banyere ihe ime mmụọ ọ gwụla ma ha pụrụ ịhụ uru ndị a na-ahụ anya ozugbo?
3 Mee ka Olileanya Alaeze ahụ Pụta Ìhè: E nweghị nsogbu Alaeze ahụ na-agaghị agwọta. Ya mere mgbe anyị pụrụ ime ya, anyị kwesịrị ikwu okwu banyere nkwa Alaeze, na-ezo aka n’okwu Akwụkwọ Nsọ ndị gbara ọkpụrụkpụ, ọbụna ma a sị na o kweghị omume ma ọ bụ dị irè igosi ihe e dere na Bible. (Hib. 4:12) Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi mee ka mkparịta ụka ahụ ruo n’ọnọdụ ahụ?
4 Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịghọta nzube nke nleta anyị. Ọ dị ha mkpa ịghọta na anyị nọ n’ebe ahụ n’ihi ịhụnanya maka ndị agbata obi na nchegbu maka ógbè ahụ. Anyị pụrụ ịjụ ajụjụ e chepụtara nke ọma dị ka, “Gịnị ka i chere bụ́ ngwọta nke [otu nsogbu na-emetụta ógbè ahụ]?” Ọ bụrụ na otu ụzọ njekwu adabaghị, nwalee ọzọ.
5 N’otu ókèala nke ndị ọgaranya ebe ndị nwe ụlọ na-achọghị ịma banyere ozi Alaeze ahụ, ndị nkwusa gbalịrị ịchọta okwu mmalite ga-akpalite mmasị. Mgbe ha na-enyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma, otu di na nwunye nwalere okwu mmalite a: “Ì chere na agụmakwụkwọ dị mma dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ụwa taa? Ì kwere na agụmakwụkwọ zuru ezu ga-agụnye ihe ọmụma nke Bible?” N’otu ehihie ha tinyere akwụkwọ atọ, ndị otu n’ime ha bụ n’aka otu nwanyị mesịrị sị na ya agụwo akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ dum ma nakwere ọmụmụ Bible.
6 Mgbe i zutere omume ọ̀ gbasara m, nwalee ụzọ njekwu dị iche iche, jụọ ajụjụ ndị na-akpali echiche, ma dabere n’Okwu Chineke. Ị pụrụ isi otú ahụ nwee ike inyere ndị ọzọ aka ịnabata olileanya Alaeze anyị magburu onwe ya.