Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/07 p. 8
  • Ṅomie Ihe Nlereanya Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ṅomie Ihe Nlereanya Jizọs
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Kụziere Ndị Dị Umeala n’Obi Ije Ije n’Ụzọ Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 9/07 p. 8

Ṅomie Ihe Nlereanya Jizọs

1. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ?

1 Mgbe anyị na-eme ndị na-eso ụzọ, anyị kwesịrị iburu n’uche na ihe nlereanya anyị pụrụ inwe mmetụta dị nnọọ mma n’ahụ́ ndị na-ahụ ihe anyị na-eme. Jizọs ji okwu ọnụ na omume ya kụzie ihe. Ndị maara Jizọs hụrụ otú o si nụọ ọkụ n’obi, otú o si hụ ndị mmadụ n’anya, otú ọchịchọ ya si hiwe isi n’ido aha Nna ya nsọ, na otú o si gbaa mbọ nke ukwuu iji hụ na ya mezuru uche Nna ya.—1 Pita 2:21.

2. Olee otú ihe nlereanya anyị nwere ike isi metụta ndị anyị na ha na-arụkọ n’ozi?

2 Mgbe Anyị Nọ n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ: Dị ka Jizọs mere, ihe nlereanya anyị na-emetụta ndị anyị na ha na-arụkọ n’ozi. Ndị ọhụrụ na ndị nkwusa na-abụghị aka ochie, bụ́ ndị na-ahụ otú anyị si eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, ga-echebara ugboro ole ha na-aga ozi ọma echiche. Mgbe ha hụrụ ọṅụ anyị na-enwe nakwa otú anyị si egosi ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, nke ahụ ga-echetara ha na ọ dị mkpa inwe àgwà ndị dị otú ahụ mgbe ha nọ n’ozi. Mgbe ha hụrụ otú anyị si eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe nke ọma, otú anyị si eme nletaghachi, nakwa otú anyị si eduzi ọmụmụ Bible, ọ ga-akpali ha ime otú ahụ.

3. Olee otú ihe nlereanya anyị nwere ike isi kụziere ndị anyị na-eduziri Bible ihe, oleekwa ihe ha pụrụ ịmụta?

3 Mgbe Anyị Na-eduzi Ọmụmụ Bible: Ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible ga-ahụ otú anyị si akpa àgwà. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na anyị nwere ike ịkọwara ha mkpa ọ dị ịkwadebe ihe anyị na ha ga-amụ, ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e dere na ya, na ịka ihe n’ebe ha hụrụ isi ihe ndị dị n’ihe ha na-amụ, ha ga-achọpụta ma ànyị kwadebekwara akwadebe. (Rom 2:21) Ọ bụrụ na anyị na-abịa kpọmkwem mgbe anyị kwuru na anyị ga-abịa ịmụrụ ha ihe, nke ahụ ga-eme ka ọ dịkwuoro ha mfe ịhụ na ọ dịghị ihe ọzọ ga-ewere oge ha ji amụ Bible. Ha ga-ahụkwa otú anyị si adị njikere ịchụ onwe anyị n’àjà nakwa otú okwukwe anyị si sie ike. Ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụrụ na ndị na-eduziri ndị ha na-amụrụ Bible ihe na-agbasochi ihe nlereanya Jizọs anya, ndị ahụ ha na-amụrụ Bible na-aghọkarị ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma na ndị na-arụpụta ihe dị mma n’ozi ha.

4. Mgbe anyị bịara ọmụmụ ihe, gịnị ka ihe nlereanya anyị na-akụzi?

4 Mgbe Anyị Gara Ọmụmụ Ihe: Ndị nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị iji ihe nlereanya ha na-akụzi ihe mgbe ha bịara ọmụmụ ihe. Ndị nwere mmasị, bụ́ ndị maliterela ịbịa ọmụmụ ihe, na-erite uru n’ezi ihe nlereanya nke ha na-ahụ n’ọgbakọ. Ha na-ahụ otú ụmụnna si emekọrịta ihe nke ọma, otú ha si dịrị n’otu, nakwa otú ha si eji ejiji kwesịrị ekwesị. (Ọma 133:1) Ha ga-ahụkwa ihe nlereanya anyị na-esetịpụ n’ịnọgidesi ike na-abịa ọmụmụ ihe nakwa n’ikwupụta okwukwe anyị n’ihu ọha. Otu onye ọhụrụ nke bịara otu n’ime ọmụmụ ihe anyị n’otu oge hụrụ otú nwatakịrị nwanyị si nwee ike iji Bible nke ya sapeta otu amaokwu a chọrọ ịgụ nakwa otú o si legide ya anya ka a na-agụ ya. Ihe nlereanya nwatakịrị ahụ kpaliri ya ịrịọ ka a mụwara ya Bible.

5. Olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji leda uru ihe nlereanya anyị bara anya?

5 Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume iṅomi ezi ihe nlereanya nke ibe anyị. (Fil. 3:17; Hib. 13:7) Ya mere, anyị kwesịrị icheta na ọ bụrụ na anyị ana-agbasochi ihe nlereanya Jizọs anya, ndị ọzọ ga-ahụ ya, nke ahụ ga-akpalikwa ha iṅomi anyị. N’ihi nke a, ka anyị buru n’uche okwu ndị a e dere na 1 Timoti 4:16: “Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya