Ọrụ Nkwusa Kasị Ukwuu A Rụtụrụla n’Ụwa!
Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, a haziela Ndịàmà Jehova ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. (1 Kọr. 9:23) N’ọrụ nkwusa a kasị ukwuu a rụtụrụla n’ụwa, anyị na-ezi ndị mmadụ ozi a ugbu a n’ọtụtụ narị asụsụ. Anyị na-ezi ya n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. (Mat. 24:14) Ma olee ihe mere ọrụ a ji dị mkpa? Oleekwa otú e si na-arụ ya n’ebe nile n’ụwa?
Ihe nkiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News zara ajụjụ ndị ahụ site n’ime ka anyị ghọtakwuo akụkụ dị iche iche nke ọrụ anyị na-arụ n’ụwa nile. Ka ị na-ele vidio ahụ, tụlee ajụjụ ndị a: (1) Olee otú e si ahazi ma na-eduzi ọrụ anyị? (2) Olee otú Ngalaba Ide Ihe, Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka, Ngalaba Ihe Osise, na Ngalaba Na-ahụ Maka Vidio na Kaseti A Na-ege Ege si atụnye ụtụ n’ime ka ndị mmadụ nụ ozi ọma? (3) Olee ihe mere anyị ji emefu nnukwu ego n’ibi na ibupụ akwụkwọ? (Jọn 17:3) (4) Akwụkwọ ole ka a na-ebi n’otu afọ? (5) Olee ihe e jirila akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible rụpụta? (Hib. 4:12) (6) Olee ihe a na-eme iji kụziere ndị ìsì na ndị ogbi Bible? (7) Olee otú e si enweta ego e ji akwado ọrụ anyị? (8) Olee otú ọrụ nke Ngalaba Na-enyere Ndị Dọkịta Aka Ịgwọ Ndịàmà Jehova n’Ejighị Ọbara, Ngalaba Ije Ozi, na Ngalaba Na-ahụ Maka Mgbakọ si abara anyị uru? (9) Ebe ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, olee otú vidio a sirila mee ka ị ghọtakwuo (a) mgbalị nzukọ Jehova na-eme ikwusa ozi ọma? (b) ihe karịrị otu narị ebe obibi Betel e nwere n’ụwa nile? (ch) ọzụzụ a na-enye ndị nlekọta na ndị ozi ala ọzọ? (d) uru ọ bara iji ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị amalite ụbọchị ọ bụla na ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ọgbakọ kwa izu? (e) uru ọ bara ịga nzukọ Ndị Kraịst? (f) otú Paradaịs a ga-enwe n’ụwa ga-adị? (Aịsa. 11:9) (g) mkpa ọ dị gị onwe gị iso na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ?—Jọn 4:35.
Olee okwu ọma ndị ikwu gị, ndị enyi gị, ndị nletaghachi gị, na ndị ị na-amụrụ Bible kwurula mgbe i gosichara ha vidio a? Ọ́ gaghị adị mma ka i gosi ya onye ọzọ na nso nso a ma zie ya ozi ọma?—Mat. 28:19, 20.