Ụbọchị Pụrụ Iche A Ga-eji Na-amalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl
1 Malite na January, ọgbakọ nke ọ bụla ga-ewepụta otu ụbọchị n’otu ngwụsị izu kwa ọnwa, ma eleghị anya ngwụsị izu nke mbụ, iji lekwasị anya n’ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ụbọchị a ga-abụ ụbọchị Saturday ma ọ bụ ụbọchị Sunday, dabere na nke ga-akara ọgbakọ unu mma. N’ụbọchị ahụ, ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ ekweghị ka a malitere ha ọmụmụ Baịbụl, ndị nkwusa ka nwere ike inye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ bụ magazin ndị kasị ọhụrụ ha nwere. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi niile kwesịrị ime ndokwa ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a ma nyere ndị nkwusa aka ịmalite ọmụmụ Baịbụl.
2 Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-ekpebi ngwụsị izu nke ha ga-ewepụta Saturday ma ọ bụ Sunday ya maka ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. E kwesịrị ịdị na-echetara ndị nkwusa site n’oge ruo n’oge ka ha kwadebe maka ya ma gbasie mbọ ike ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl mgbe ha nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ na mgbe ha gaghachiri na nke ndị gosiri mmasị.
3 Otú Anyị Ga-esi Kwadebe: Anyị nwere ike ịchọta aro ndị a tụrụ maka otú anyị ga-esi malite ọmụmụ Baịbụl n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 2006 nakwa na peeji nke 6 nke akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible. Ụfọdụ nwere ike ịhọrọ iji traktị malite nke ha, dị ka traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? (Lee peeji nke 6.) Peeji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke August 2007 tụkwara aro otú anyị ga-esi malite ọmụmụ Baịbụl mgbe anyị gaghachiri na nke ndị naara anyị magazin. A ga-ekenye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi iduzi nzukọ ozi ubi ga-ewe naanị nkeji iri ma ghara ịgafe nkeji iri na ise, bụ́ mgbe ha ga-atụle otu aro ma ọ bụ abụọ banyere otú a ga-esi malite ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụ jiri aro ndị ahụ mee ihe ngosi.
4 O doro anya na ọ bụghị mmadụ niile ga-ekwe ka a malite iduziri ha ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ kwe ka a mụọrọ ha Baịbụl ruo ogologo oge. Nke a ekwesịghị ime ka anyị laa azụ, ebe ọ bụ Jehova na-adọta ndị yiri atụrụ ná nzukọ ya. (Jọn 6:44) Ọrụ anyị abụghị naanị ịkụ mkpụrụ nke eziokwu, kamakwa ilekọta na ịkwọsa ndị nke gbanyerela mgbọrọgwụ mmiri, nke ahụ gụnyekwara ịmụrụ ndị nwere obi eziokwu Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.—1 Kọr. 3:9.