Jiri Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl Kpọrọ Ihe
1. Olee otú anyị ga-esi na-arụzu ọrụ ahụ Jizọs gwara anyị rụọ na Matiu 28:19, 20?
1 Jizọs nyere anyị ọrụ ‘ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma na-ezi ha ihe.’ (Mat. 28:19, 20) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl mgbe ọ bụla, ọ bụghị naanị n’ụbọchị ahụ pụrụ iche ọgbakọ wepụtara iji na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Aro ndị a tụrụ na paragraf ndị na-esonụ nwere ike inyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme.
2. Olee ndị anyị nwere ike ịgwa ka anyị na ha mụwa Baịbụl?
2 Gwa Ndị Mmadụ Ka Gị na Ha Mụwa Baịbụl: Ọ bụrụ na anyị na-agwakarị ndị mmadụ na anyị ga-achọ ka anyị na ha mụwa Baịbụl, anyị ga-enwe ike ịhụ onye ga-ekwe ka anyị na ya mụwa Baịbụl. (Ekli. 11:6) Ị̀ gwatụla mmadụ na ị ga-achọ ka gị na ya mụwa Baịbụl n’oge mbụ ị hụrụ ya n’ozi ọma? Otu ọgbakọ dị n’Amerịka wepụtara otu ọnwa zuru ezu mee ya. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ inweta mmadụ iri anọ na abụọ ha bidooro ọmụmụ Baịbụl! Echekwala na ndị ị na-agara nletaghachi ma na anyị na ndị mmadụ na-amụ Baịbụl. Ị gaara ha nletaghachi n’ụbọchị ọzọ, gbalịa gwa ha na ị ga-achọ ka gị na ha mụwa Baịbụl. Ọ bụrụ na ha ekweghị, nsogbu adịghị. Akwụsịla ịgara ha nletaghachi. Ị̀ jụọla ndị agbata obi gị, ndị ikwu gị, ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị ma hà ga-achọ ka gị na ha mụwa Baịbụl? I nwekwara ike ịjụ ndị gị na ha na-amụ Baịbụl ma hà nwere ndị enyi na ụmụnne ndị ga-achọkwa ịmụ Baịbụl.
3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl, oleekwa mgbe anyị nwere ike inye ya ndị mmadụ?
3 Ihe Ga-enyere Anyị Aka: Otu n’ime ihe ga-enyere anyị aka ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl bụ traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? I nwere ike inye ya ndị mmadụ ma hà naara akwụkwọ anyị ndị ọzọ ma ọ bụ na ha anaghị. Anyị nwere ike inye ya ndị mmadụ mgbe anyị nọ ozi ọma n’ebe a na-azụ ahịa, n’ozi okporo àmà, mgbe anyị gara nletaghachi, ma ọ bụkwanụ tinye ya n’akwụkwọ ozi anyị dere iji zie mmadụ ozi ọma. Anyị nwekwara ike ịfanye ya n’ụlọ ndị na-anọghị n’ụlọ. Gbalịa na-eji ya ma i mewe njem, ma ị gawa ahịa, nakwa ma ị gawa ọrụ. N’azụ traktị ahụ, a kọwara otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, kwuokwa na ọ bụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ka anyị na ha na-eji amụ ya.
4. Olee otú anyị nwere ike isi jiri traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl?
4 I nye mmadụ traktị ahụ, i nwere ike igosi ya ajụjụ ndị dị n’ihu peeji traktị ahụ ma jụọ onye ahụ sị, “Olee ajụjụ nke ị ga-achọ ka anyị leba anya na ya?” Gị na onye ahụ tụlezie ebe a zara ajụjụ ahụ na traktị ahụ. Unu mechaa, gụọrọ ya ma ọ bụ kọwaara ya ihe e dere n’azụ traktị ahụ bụ́ ebe e kwuru otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl. I nweziri ike igosi ya ebe a kọwakwuru ajụjụ ahụ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nyezie ya akwụkwọ ahụ, gị na ya kwuokwa mgbe ọzọ ị ga-abịa ka unu kparịtakwuo.
5. Gịnị mere anyị ga-eji na-agwa ndị mmadụ na anyị ga-achọ ka anyị na ha mụwa Baịbụl?
5 N’ókèala ọgbakọ ọ bụla, a ka nwere ndị agụụ ịma eziokwu Baịbụl na-agụ. Ọ bụrụ na anyị na-agwakarị ndị mmadụ na anyị ga-achọ ka anyị na ha mụwa Baịbụl, anyị ga-enwe ọtụtụ ndị anyị na ha ga-amụ Baịbụl, nweekwa obi ụtọ inyere ha aka ịbanye n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ.—Mat. 7:13, 14.