Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ịgaghachi na nke Ndị Gosiri Mmasị?
1. Olee otu ụzọ e si enyere mmadụ aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs?
1 Ịgaghachi na nke onye gosiri na ya chọrọ ịmụta ihe banyere Alaeze Jehova bụ otu ụzọ e si enyere onye ahụ aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20) Oge kacha mma ịga nletaghachi bụ oge anyị na onye gosiri mmasị kwekọrịtara. Gịnị mere na anyị ekwesịghị igbu oge ịga nletaghachi na nke onye anyị ziri ozi ọma?
2, 3. Gịnị mere anyị ekwesịghị igbu oge ịgaghachi?
2 Gịnị Mere A Ga-eji Agaghachi Ozugbo? Ọrụ ‘ikwusa ozi ọma nke a nke alaeze’ agwụwala, ọgwụgwụ usoro ihe a dịkwa nso. (Mat. 24:14; 1 Pita 4:7) Ebe ọ bụ na a ka nwere ‘ụbọchị nzọpụta’ maka ndị nwere mmasị n’eziokwu ahụ, anyị kwesịrị ime ihe ahụ a dụrụ anyị ọdụ ime, nke bụ́ ‘iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa okwu Chineke.’ Otu ụzọ anyị sikwa eme ya bụ ịgaghachi nyere ndị nwere mmasị aka n’egbughị oge.—2 Kọr. 6:1, 2; 2 Tim. 4:2.
3 Setan na-agbasi mbọ ike iwepụ mkpụrụ Alaeze ọ bụla anyị kụrụ n’obi ndị gosiri mmasị. (Mak 4:14, 15) Ndị ezinụlọ ha, ndị ọrụ ibe ha, na ndị ọzọ na-akwakarị ndị nwere mmasị n’eziokwu ahụ emo. Tupu ndị ọzọ emee ka ha kwụsị inwe mmasị, anyị kwesịrị ịgaghachi na nke ha n’egbughị oge.
4. Gịnị ka anyị ga-eme n’ụbọchị mbụ anyị gara na nke mmadụ iji nwee ike ịgara ya nletaghachi?
4 Yienụ Agba: Ọ kacha mma ka gị na onye ahụ kpebie ụbọchị na oge ị ga-abịaghachi tupu ị lawa n’ụbọchị mbụ ahụ. Jụọ otu ajụjụ ị ga-aza ma ị bịa n’ụbọchị ọzọ. Ọ dị mkpa idetu ihe gị na ya kparịtara n’ụbọchị ahụ, ihe gị na ya ga-akparịta ma ị bịa, nakwa mgbe gị na ya yiri agba na ị ga-abịaghachi. Ọ bụrụ na ị ga-enwe ohere ịgaghachi echi ya ma ọ bụkwanụ ma ụbọchị ole ole gachaa, jụọ ya ma ọ̀ bụ gị bịa. Ya bụrụ na ụbọchị mbụ ahụ gị na ya hụrụ bụ ná ngwụsị izu, ya abụrụkwa na onye ahụ agaghị enwe ohere ruokwa ngwụcha izu ọzọ, gwa ya na ị ga-abịa mgbe ahụ. Gị na ya yihaala agba, ahapụkwala ịga.—Mat. 5:37.
5. Olee otú ịgaghachi na nke ndị nwere mmasị n’egbughị oge ga-esi enyere anyị aka ịrụ ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị?
5 Anyị maara na ịgaghachi na nke ndị gosiri mmasị n’egbughị oge bara ezigbo uru. N’ihi ya, gị na ha yie agba mgbe ị ga-abịaghachi, egbukwala oge ịgaghachi, n’ihi na “oge fọdụrụ dị ntakịrị.” (1 Kọr. 7:29) Ọ bụrụ na anyị anaghị egbu oge agaghachi na nke ndị gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ, o yikarịrị ka mbọ anyị na-agba ọ̀ ga na-arụpụtakwu ihe.