Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2010
1. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị bido n’oge kwadowe iji hụ na anyị gara ụbọchị atọ niile nke mgbakọ distrikti 2010?
1 Anyị niile na-atụ anya ịga rie oriri ime mmụọ a kwadebeere anyị ná mgbakọ distrikti nke afọ 2010. A na-agba onye ọ bụla ume ịbịa ụbọchị atọ niile a ga-enwe mgbakọ a. Ná mgbakọ a, anyị ga-agbarịta ibe anyị ume ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe na iwere Jehova ka ọta anyị. (Ọma 26:1, 11; Ilu 2:7) Bido ugbu a mee ka onye nkụzi unu ma ọ bụ onye were gị n’ọrụ mara na mgbakọ a so n’ụzọ dị oké mkpa i si efe Jehova. I bido ugbu a mewe atụmatụ otú ị ga-esi aga, ma nyere ndị chọrọ enyemaka aka, Jehova ga-agọzi mgbalị ndị ị na-eme.—Ọma 37:5; Ilu 10:22.
2. Olee otú anyị nwere ike isi mata ebe ndị a ga-enwe mgbakọ distrikti nakwa otú e si enweta ụlọ?
2 Otú Ị Ga-esi Amata Ebe Ndị Ọzọ A Ga-enwe Mgbakọ: A ga-edepụta ebe niile a ga-enwe mgbakọ distrikti anyị n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ị ga-aga mgbakọ ọzọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ unu, i nwere ike ịnara Room Request Form. I dejupụtachaa fọm ahụ, jiri otu n’ime adres dị n’azụ Room Request Form ndị ọhụrụ anyị nwere ziga ya ebe e kwesịrị iziga ya. A ga-ezitere ndị odeakwụkwọ ọgbakọ fọm a n’oge na-adịghị anya.
3. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị nwere mkpa pụrụ iche aka?
3 Ndị Nwere Mkpa Pụrụ Iche: È nwere onye nọ n’ọgbakọ unu ị maara na ọ chọrọ enyemaka ka o nwee ike ịbịa mgbakọ? Ọ́ gaghị adị mma ma i nyere ya aka? (Ilu 19:17) Ọ bụrụ na onye nkwusa nwere mkpa pụrụ iche chọrọ ka e nyere ya aka chọta ụlọ, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị ikpebi ma ò ruru eru ka e dejupụtara ya ebe ahụ e dere Special Needs n’azụ Room Request Form. Ha kwesịrị ịtụle ntụziaka ndị e dere na fọm ahụ tupu odeakwụkwọ ọgbakọ ezigara Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ fọm ahụ.
4. (a) Olee ndokwa a ga-eme iji hụ na ndị ga-abịa mgbakọ ga-enwe ebe ha ga-ebi? (b) Olee ihe ndị a gwara anyị, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ọma n’ebe e nyere anyị ụlọ? (Gụọ igbe bụ́ “Ntụziaka Banyere Ebe Ị Ga-ebi,” nke dị na peeji nke 6.)
4 Ụlọ: N’ebe niile a ga-enwe mgbakọ, a ga-enwe ngalaba na-enye ụlọ nke ga-eme ka ọ dịrị gị mfe inweta ebe ị ga-ebi. N’ebe ụfọdụ a ga-enwe mgbakọ, a ga-enye ụmụnna ụlọ n’ala mgbakọ, o nwere ike ịbụ n’ụlọ obibi ndị a rụrụ n’ala mgbakọ ma ọ bụkwanụ n’ụlọ ndị nke na-agaghị adịte aka. E nwekwara ike inye ndị ọzọ ụlọ n’ụlọ ndị mmadụ. A ga-enyekwara ndị chọrọ ka e nwetara ha ụlọ na họtel aka inweta ụlọ. N’ebe ọ bụla e nyere gị ụlọ, i kwesịrị isoro ntụziaka Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere.
5. Olee ngọzi ndị anyị na-atụ anya inweta ná mgbakọ distrikti nke afọ 2010?
5 Ná mgbakọ distrikti nke afọ a, a ga-enye anyị ndụmọdụ ndị sitere n’Okwu Chineke, anyị enweekwa ohere isoro ụmụnna anyị nọrịa. (Diut. 16:15) Ka Jehova gọzie mgbalị niile anyị ga-eme iji hụ na anyị gara mgbakọ distrikti nke afọ 2010!
[Igbe dị na peeji nke 5]
Oge Ihe Omume:
Fraịdee na Satọdee
9:20 ụtụtụ - 4:55 uhuruchi
Sọnde
9:20 ụtụtụ - 3:40 uhuruchi
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ntụziaka Banyere Ebe Ị Ga-ebi:
◼ Were ụlọ Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị. Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ebe Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị. Ekwela ka ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru ga-anọ na ya.
◼ Agala n’ebe ndị nwe ụlọ e nyere gị na-achọghị ka ndị mmadụ na-aga. Sie nri naanị ma ọ bụrụ na e kwere ka i mee otú ahụ, siekwa ya naanị n’ebe a gwara gị ka ị nọrọ sie ya.
◼ Agwala onye nwe ụlọ na ị ga-etinyere ya ego n’ihe ya na Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ kwekọrịtara iji hụ na o nyere gị ụlọ ahụ.
◼ Mgbe ị na-achọ ụlọ nke gị, buru ụzọ jụọ Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ iji hụ na ị gaghị were ụlọ ha nwetarala.