Mkpa Gị Bụrụ Ime Ka Ndị Mmadụ Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
1. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka e nwee ike ịzọpụta ndị mmadụ?
1 Ihe ndị e dere n’akụkọ ozi anyị nke afọ 2014 gosiri na anyị gbara ezigbo mbọ n’ikwusa ozi ọma Alaeze. (Mat. 24:14) Anyị na-esi n’ụzọ dị iche iche ezi ọtụtụ ndị ozi ọma taa karịa otú anyị si emebu. Ụzọ ndị ahụ bụ ịga n’ụlọ n’ụlọ, ikesa traktị na akwụkwọ ịkpọ òkù nakwa ịkpọsa akwụkwọ anyị n’ebe ndị na-ekwo ekwo. Ma ka e nwee ike ịzọpụta ndị mmadụ, anyị kwesịrị inyere ha aka ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otú anyị ga-esi nyere ha aka bụ ịmụrụ ha Baịbụl.—1 Tim. 2:4.
2. Olee ụfọdụ ajụjụ nwere ike inyere mmadụ aka iburu ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’obi?
2 Buru Ịmalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl n’Obi: Ọ bụrụ na mmadụ enwee mmasị n’ozi ọma, ị̀ na-ajụta ya ebe o bi ma ọ bụ nata ya nọmba ekwentị ya ka i nwee ike ịchọrọ ya gaa ozugbo ka gị na ya mụwa Baịbụl? Ị̀ gbalịala ịmalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl mgbe unu nọ ozi ụlọ n’ụlọ? È nwetụla mgbe ị gbalịrị ịmalitere ndị ị na-ewegara magazin n’ọnwa ọ bụla ọmụmụ Baịbụl? Ì gositụla ndị ọrụ unu, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị agbata obi gị, ndị ikwu gị, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ vidio Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? ma ọ bụ vidio Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl? Ọ bụrụ na ị na-akpọsa akwụkwọ anyị n’ebe na-ekwo ekwo, ị̀ na-agwa ndị weere ndị nke anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe na anyị na ha nwere ike ịmụwa Baịbụl?
3. Gịnị na-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma nke ọma?
3 Jehova na Jizọs Na-enyere Anyị Aka: Mgbe Jizọs na-enye iwu ka anyị mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị, “gaanụ.” Ihe a o kwuru gosiri na anyị ga-agba ezigbo mbọ na ya, na-achọpụtakwa ụzọ ndị anyị ga-esi eme ya. Ma, ọ hapụghị anyị ka anyị jiri aka anyị na-eme ya n’ihi na o kwere anyị nkwa na ya ga-anọnyere anyị. (Mat. 28:19, 20) Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya, na-enyekwa anyị ọzụzụ na ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịkụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl. (Zek. 4:6; 2 Kọr. 4:7) Ọ ga-adị mma ka anyị rịọ Jehova ka o mee ka ikwusa ozi ọma na-agụ anyị agụụ nakwa ka o nye anyị ike anyị ga-eji na-ekwusa ya.—Fil. 2:13.
4. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agba mbọ eme ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?
4 Ikwusa ozi ọma na-eme anyị ezigbo obi ụtọ. Ma, obi ga-aka adị anyị ụtọ ma anyị kụziere mmadụ eziokwu dị na Baịbụl, onye ahụ emechaa sonyere anyị ‘n’ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ.’ (Mat. 7:14; 1 Tesa. 2:19, 20) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị na-eme Jehova obi ụtọ “n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”—2 Pita 3:9.