Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Ọktoba 1
“Ọtụtụ ndị na-eche ma ahụhụ ha na-ata na nsogbu ndị ha na-enwe ọ̀ na-ewutekwa Chineke. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Abụ Ọma 34:18.] Isiokwu malitere na peeji nke 19 kwuru otú Chineke si enyere anyị aka imeri nsogbu ndị dị ka, iche na anyị abaghị uru, inwe oké mwute, nakwa obi anyị ịta anyị ụta gabiga ókè.”
Teta! Ọktoba–Disemba
“A na-egosi ndị mmụọ ọjọọ, ndị dibịa afa na ndị amoosu n’ọtụtụ fim ndị a na-eme taa. Ọ̀ dị gị ka e nwere ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ n’eziokwu? [Chere ka ọ zaa. Gụzie 1 Ndị Kọrịnt 10:20] Isiokwu a kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere ndị mmụọ ọjọọ nakwa ihe anyị ga-eme ka ha ghara inweta anyị. Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 22.
Ụlọ Nche Nọvemba 1
“Anyị niile chọrọ inwe ihe otú ga-eju anyị afọ. Ì chere na ọ dị mkpa na anyị ga-enwerịrị ego tupu anyị enwee afọ ojuju? [Chere ka ọ zaa.] Otu onye so ná ndị dere Baịbụl mụtara inwe afọ ojuju mgbe ihe dị ụkọ. [Gụọ Ndị Filipaị 4:11, 12.] Magazin a kwuru ihe ise Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju.”
Teta! Ọktoba–Disemba
“Gụọ Matiu 5:39. Kwuzie, sị: “Ì chere na ihe Jizọs na-ekwu ebe a bụ ka anyị ghara ime ihe ọ bụla mgbe a na-emegbu anyị? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere mmadụ ichebe onwe ya na ịga kpesara ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị ụlọ ikpe mgbe a na-emegbu ya. Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 24.