Mgbe E Kwesịrị Idejupụta Fọm Please Follow Up (S-43)
Anyị kwesịrị idejupụta fọm a ma anyị hụ onye na-ebighị n’ókèala anyị, bụ́ onye nwere mmasị ịmụ Baịbụl, ma ọ bụkwanụ ma anyị hụ onye na-anaghị asụ asụsụ anyị (ma ọ̀ bụ nke mba ọzọ na-asụ ma ọ̀ bụkwanụ nke a na-asụ n’obodo anyị). Mgbe mbụ, anyị na-edejupụta ya ma anyị hụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ n’ozi ọma, ma hà nwere mmasị ịmụ Baịbụl ma ọ̀ bụ na ha enweghị. Ma ugbu a, anyị ga na-edejupụta ya naanị mgbe anyị hụrụ onye nwere mmasị ịmụ Baịbụl. Mgbe anyị na-agaghị elewe ma onye ahụ ò nwere mmasị ịmụ Baịbụl bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ogbi. Anyị nweta onye ogbi ọ bụla n’ozi ọma, anyị kwesịrị idejupụta fọm S-43.
Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị dejupụtachaa fọm ahụ? Anyị kwesịrị inye ya odeakwụkwọ ọgbakọ anyị. Ọ bụrụ na ọ ma ọgbakọ dị nso na-eji asụsụ ahụ amụ ihe, ọ ga-ezigara ya ndị okenye ọgbakọ ahụ ka ha nwee ike ziga onye ga-aga na-eduziri onye ahụ nwere mmasị ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na ọ maghị ọgbakọ o kwesịrị izigara ya, ọ ga-ezigara ya alaka ụlọ ọrụ.
Ọ bụrụ na onye ahụ nke gosiri mmasị na-asụ asụsụ ọzọ (ma ọ̀ bụ nke mba ọzọ na-asụ ma ọ̀ bụkwanụ nke a na-asụ n’obodo anyị) ma biri n’ókèala anyị, anyị nwere ike ka na-agara ya nletaghachi ruo mgbe nwanna nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ahụ ọ na-asụ amụ ihe ga-abịawa na nke ya ịmụrụ ya ihe. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na e nweghị ọgbakọ dị nso nke na-eji asụsụ onye ahụ na-asụ amụ ihe. Ya dị otú ahụ, anyị kwesịrị iji akwụkwọ anyị ọ bụla e dere n’asụsụ ya na-aga eleta ya. Ọ bụrụkwa na o kwe mee, anyị nwere ike malitere onye ahụ ọmụmụ Baịbụl.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa November 2009, peeji nke 4.