Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/14 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe n’Ịntanet Na-akụziri Ụmụ Gị Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2014
km 5/14 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Gịnị ka nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ka okwukwe ha sikwuo ike?

E nwere ọtụtụ ihe ndị nne na nna na-eme iji zụọ ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna ma na ha na ụmụ ha ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụtụtụ bara uru. Ụfọdụ na-ejikwa oge ha ji enwe ofufe ezinụlọ ele vidio anyị ma ọ bụ kwurịta otú ihe dị n’isiokwu gbasara ndị na-eto eto ga-esi baara ụmụ ha uru. Ụfọdụ na-eme ihe ngosi dabara n’otu akụkọ Baịbụl ma ọ bụ mụọ ihe ha ga-ekwu n’ozi ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwukwe ụmụ anyị sikwuo ike, anyị kwesịrị ịna-akụziri ha ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl.—Hib. 6:1.

Chegodị otú anyị si amụrụ ndị mmadụ ihe. Anyị gaa ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ gaa nletaghachi, anyị na-agbalị ka anyị na onye ahụ mụwa akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Anyị na ya mụchaa ya, anyị amụwa akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Gịnị mere anyị na ha ji amụ akwụkwọ abụọ a? Akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi na-enyere ha aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi. Ma, akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” na-eme ka ha mata otú ha ga-esi na-eme ihe ha mụtara na Baịbụl. Ịmụ akwụkwọ abụọ ahụ na-enyere ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ aka ịgbanye mgbọrọgwụ n’ime Kraịst, ma “gbasie ike n’okwukwe.” (Kọl. 2:6, 7) Akwụkwọ ndị a ga-abakwara ụmụ anyị uru. Anyị kwesịrị ịkụziri ha banyere àjà Kraịst chụrụ, Alaeze Chineke, na ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Ha kwesịrị ịma ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ nakwa ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. Obi kwesịrị isi ha ike na e nweghị ndị ọzọ na-akụzi eziokwu si na Baịbụl ma e wezụga Ndịàmà Jehova. Ha kwesịkwara ịghọta ihe mere Chineke ji nye iwu ndị dị na Baịbụl, marakwa otú ha ga-esi na-azụ “ikike nghọta” ha. (Hib. 5:14) Ka ndị nne na nna na-agbalị ịkụziri ụmụ ha ihe ndị a, ha kwesịrị icheta afọ ole ha dị nakwa ụdị ihe ha ga-aghọtali tupu ha akụziwere ha isiokwu ụfọdụ. Ma, ụbụrụ na-aghọ ọtụtụ ụmụaka nkọ nke na ha nwere ike ịmụta ihe ndị miri emi dị na Baịbụl mgbe ha ka pere mpe.—Luk 2:42, 46, 47.

E nwere ihe si n’akwụkwọ Bible Na-akụzi a ga-etinye n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ka o nyere ndị nne na nna aka ịna-akụziri ụmụ ha ihe. Ị gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO, ị ga-ahụ ya. E mechaa, a ga-etinyekwa ndị nke si n’akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke.” Ma, nne na nna nwekwara ike iji akwụkwọ ndị ahụ n’onwe ha kụziere ụmụ ha ihe. Ndị nne na nna ga-eji aka ha kpebie ma ọ̀ bụ ná mgbede ha ji enwe Ofufe Ezinụlọ ka ha ga-atụle ya ka ọ̀ bụ mgbe ha na-amụrụ ụmụ ha ihe otu otu, ka ọ̀ bụkwanụ mgbe ha na-akụziri nwa ha otú ọ ga-esi na-amụ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya