Otú Anyị Ga-esi Enyere Ndị Na-amaghị Agụ Ihe Aka
1. Olee ụdị ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma mgbe ụfọdụ?
1 Ndị na-amaghị agụ ihe nwere ike chọọ ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi, ma ha bulite Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ, ike agwụ ha. Ọ bụrụ na anyị ahụ ụdị ndị a n’ozi ọma, akwụkwọ mbụ anyị ga-enye ha ekwesịghị ịbụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka ịmara Jehova? Ụmụnna ndị jewere ozi ọma kemgbe n’ihe karịrị iri mba abụọ gwara anyị otú ha si enyere ụdị ndị ahụ aka. Ka anyị hụ ihe ha kwuru.
2. Olee akwụkwọ ndị anyị nwere ike iji mụwara onye na-amaghị agụ ihe Baịbụl?
2 Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe amaghị agụ ihe, i nwere ike iji broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi malite ịmụrụ ya ihe. Otu nwanna nwoke bụ ọsụ ụzọ oge niile kwuru na ihe ya na-eme bụ igosi onye ya chọrọ ịmalitere ọmụmụ ihe broshọ abụọ ahụ, jụzie ya nke ọ chọrọ ka ha mụwa. Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kenya kwuru na broshọ abụọ ahụ na-enyere ụmụnna aka ịmụrụ ndị mmadụ ihe n’ihi na otú kacha mma e si akụziri ndị Afrịka ihe bụ ịna-akọrọ ha akụkọ kama ịna-ajụ ha ajụjụ ha ga na-asa. O nwere ike ịdịrị onye ma akwụkwọ mfe ma gị na ya na-amụ ihe, ya gụpụta, gị ajụọ ya ajụjụ. Ma, ọ bụrụ onye na-amaghị agụ, ihere ga na-eme ya. Ọ bụrụkwanụ na onye ahụ matụ agụ ihe obere, ụfọdụ ụmụnna na-eji broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, ma ọ bụkwanụ akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible amụrụ ya ihe.
3. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere ndị na-amaghị agụ ihe nke ga-enyere anyị aka ịna-akụziri ha ihe?
3 Na-aja Ha Mma: Anyị na onye na-amaghị agụ ihe na-amụ ihe, ihere nwere ike ịna-eme ya. Ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ ime ka obi ruo ya ala. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụbụrụ na-aghọ ọtụtụ ndị na-amaghị agụ ihe nkọ, ha na-aghọtakwa ihe ma a kụziere ha ya. Kwanyere ha ùgwù, eledakwala ha anya. (1 Pita 3:15) Ha mata na mbọ ha na-agba alaghị n’iyi nakwa na ha na-amụta ọtụtụ ihe, ọ ga na-atọ ha ụtọ ka gị na ha mụrụ ihe gawa. N’ihi ya, jiri obi gị niile na-aja ha mma.
Anyị na onye na-amaghị agụ ihe na-amụ ihe, ihere nwere ike ịna-eme ya. Ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ ime ka obi ruo ya ala
4. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị na-amaghị agụ ihe anyị na-amụrụ ihe aka ka ha na-akwadebe ihe anyị na ha ga-amụ tupu anyị abịa?
4 Ọ bụrụgodị na onye ị na-amụrụ ihe amaghị agụ ihe, na-agba ya ume ka ọ na-akwado ihe unu ga-amụ akwado. Ụfọdụ ụmụnna ndị Saụt Afrịka na-agwa onye ha na-amụrụ ihe ka ọ gwa onye ụlọ ha ma ọ bụ enyi ya ma agụ ihe ka o nyere ya aka ịkwadebe ihe ha ga-amụ. Nwanna ọzọ nọ na Briten na-adị na-aka akwụkwọ ya ihe. Ya bịa ịmụrụ mmadụ ihe, ya enye ya akwụkwọ ya ahụ ka o jie ya nkeji ole na ole ka ọ hụ na ọ na-adị mfe ịhụ azịza n’akwụkwọ a kara azịza ya ihe. Ime otú ahụ na-eme ka onye ahụ na-amụ akwụkwọ ahụ, na-akakwa azịza ihe tupu ya abịa ka ha mụọ ihe. Nwanna ọzọ nọ n’India na-adị agwa ndị ọ na-amụrụ ihe ka ha kirie ihe osise dị n’ebe ha ga-amụ n’izu ọzọ, chebakwara ha echiche. Ikiri ihe osise ndị ahụ ga-enyere ha aka ịkwadebe ihe ha ga-amụ.
5. Olee otú ị ga-esi nweere onye ị na-amụrụ ihe na-amaghị agụ ihe ndidi?
5 Nweere Ha Ndidi: N’agbanyeghị akwụkwọ gị na onye na-amaghị agụ ihe na-amụ, kawa ahụ́ na-eme ka ọ ghọta isi ihe unu na-amụ nke ọma. Unu malite ịmụ ihe ọhụrụ, unu nwere ike iji naanị nkeji iri ma ọ bụ nkeji iri na ise mụọ ihe. Kama ịmụ ọtụtụ ihe n’otu ụbọchị, na-amụnụ paragraf ole na ole. Nweere ya ndidi ma ọ bụrụ na ọ na-agbalị ịgụtụwa ihe. Ọ bụrụ na ihe unu na-amụ atọwa ya ụtọ, ọ ga na-agbasi mbọ ike ka ọ mụta ịgụ ihe. Ihe ị ga-eme ga-enyere ya aka bụ ibido mgbe gị na ya malitere ịmụ ihe gwawa ya ka ọ na-abịa ọmụmụ ihe anyị.
6. Olee otú anyị ga-esi enyere ndị na-amaghị agụ ihe aka ka ha mụta ịgụ ihe?
6 Ọ bụrụ na ndị anyị na-amụrụ ihe amụta ịgụ ihe, ọ ga-adịrị ha mfe ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. (Ọma 1:1-3) Ọtụtụ ụmụnna na-abụ ha mụchaa ihe, ha ewepụta nkeji ole na ole jiri akwụkwọ bụ́ How to Read and Write kụziere ndị ha na-amụrụ ihe otú e si agụ ihe. Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe echee na ya agaghị amụtali ịgụ ihe, chetara ya ihe ndị ọ mụtarala. Ime otú a nwere ike ime ka obi sie ya ike. Gwa ya na Jehova ga-enyere ya aka. Gbaakwa ya ume ka ọ rịọ ya ka o nyere ya aka. (Ilu 16:3; 1 Jọn 5:14, 15) Ụfọdụ ụmụnna nọ na Briten na-agwa ndị ha na-amụrụ ihe ihe ndị ga-enyere ha aka ịmụta otú e si agụ ihe. Ha na-agwa ha ka ha buru ụzọ mụta otú e si agụ a b ch d, ha mụtachaa ya, ha amụta otú e si achọta amaokwu Baịbụl. Ha mụta ịgụ Baịbụl, ha agụwazie akwụkwọ anyị ndị na-esighị ike ọgụgụ. Ihe ga-enyere mmadụ aka ịmụta ịgụ ihe bụ ịkụziri onye ahụ otú e si agụ ihe nakwa ime ka onye ahụ nwee mmasị ịmụta ịgụ ihe.
7. Gịnị mere anyị ga-eji na-ezi ndị na-amaghị agụ ihe ozi ọma ma ọ bụ na-amụrụ ha ihe?
7 Jehova anaghị eleda ndị na-amaghị akwụkwọ anya. (Job 34:19) Kama, ọ bụ obi mmadụ ka Jehova na-enyocha. (1 Ihe 28:9) N’ihi ya, ị gaa ozi ọma hụ onye na-amaghị agụ ihe, zie ya ozi ọma. Ọ chọọ ka ị mụwara ya Baịbụl, mụwara ya. Anyị nwere ọtụtụ akwụkwọ ị ga-eji mụwara ya ihe. Ka oge na-aga, unu nwere ike ịmụwa akwụkwọ Bible Na-akụzi ka o nwee ike ịmụta eziokwu dị na Baịbụl.