O Ruola Otu Narị Afọ Anyị Kwusawara Banyere Alaeze Chineke
1. Gịnị ka a gbara ndị Jehova ume ka ha na-eme kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ?
1 “Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị na-ekwusa ozi ya. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” Ọ fọrọ obere ka o ruo otu narị afọ Nwanna Rutherford kwuru okwu a. Ọ gbakwara ndị Jehova ume ka ha kwusawa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Anyị na-ekwusakwanụ ozi ọma ahụ. Anyị ekwusaala ya n’ebe niile n’ụwa otú ahụ Ndị Kraịst oge ochie mere. (Kọl. 1:23) Olee otú anyị sirila kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke kemgbe otu narị afọ? Olee otú anyị ga-esi kwusara ya na-aga?
2. Olee otú akwụkwọ anyị sirila kwusaa banyere Alaeze Chineke?
2 Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga: Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị ji akwụkwọ anyị ekwusa banyere Alaeze Chineke. Kemgbe afọ 1939, isiokwu akwụkwọ anyị na-ejikarị amụ Baịbụl bụ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. Magazin a na-ekwukarị gbasara Alaeze Chineke na ihe ọ ga-eme. Teta! na-ekwukwa na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka ewepụ nsogbu ụmụ mmadụ. Ụlọ Nche na Teta! bụ magazin a kacha asụgharị n’ụwa niile. Ọ bụkwa ha ka a kacha agụ n’ụwa niile.—Mkpu. 14:6.
3. Olee ihe ndị anyị jirila zie ndị mmadụ ozi ọma?
3 Ndị na-efe Jehova ejirila ihe dị iche iche kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. N’oge ochie, ha ji ụgbọala ndị a rụnyere ígwè okwu, redio na gramafon kwusaa ozi ọma. Ihe ndị ahụ nyeere ndị nkwusa ole na ole e nwere n’oge ahụ aka izi ọtụtụ ndị ozi ọma. (Ọma 19:4) N’oge na-adịbeghị anya, anyị na-eji ihe ndị anyị tinyere na jw.org ezi ọtụtụ nde mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ndị bi n’ebe ndị ọchịchị machiri ọrụ anyị na-esidị na jw.org anụ ozi ọma ahụ.
4. Olee ụzọ pụrụ iche anyị sirila na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?
4 E nwekwara ụzọ ndị ọzọ pụrụ iche ndị Jehova si ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka afọ iri na itoolu gara aga, anyị malitere ịga ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị dị ka n’ọdụ ụgbọala ma ọ bụ n’ahịa. N’oge na-adịbeghị anya, anyị malitere idebe akwụkwọ anyị n’ebe ndị na-ekwo ekwo n’obodo dị iche iche. Ọtụtụ ọgbakọ na-edebekwa akwụkwọ anyị na tebụl ma ọ bụ n’ihe ndị yiri ya n’ebe ndị mmadụ na-agafekarị dị ka n’ebe a na-aba ụgbọala. Ma, ozi ọma ụlọ n’ụlọ ka bụ ụzọ kacha mkpa anyị si ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 20:20.
5. Olee ihe ọtụtụ n’ime anyị na-atụ anya ya n’afọ ije ozi na-abịa?
5 Ihe Ndị Anyị Na-atụ Anya Ha: N’afọ ije ozi nke ga-amalite n’ọnwa Septemba, ọtụtụ ndị ga-amalite ịsụ ụzọ oge niile. Ì nwere ike iso ha? Ọ bụrụ na ị gaghị eso ha, i nwekwara ike ịsụ ụzọ inyeaka mgbe ọ bụla o kwere gị. Ma ì so sụọ ụzọ ma ọ bụ na i soghị, Jehova ga-agọzi mbọ ọ bụla ị na-agba iji kwusaa ozi ọma Alaeze ya.—Mal. 3:10.
6. Gịnị mere ọnwa Ọktoba 2014 ga-eji bụrụ ọnwa pụrụ iche?
6 Ọ bụ n’ọnwa Ọktoba 2014 ka ọ ga-abụ otu narị afọ Kraịst malitere ịchị n’eluigwe. Ọ dabara nnọọ na Ụlọ Nche anyị ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa ahụ kwuru banyere Alaeze Chineke. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị nye ọtụtụ ndị magazin a. Ka anyị na-atụ anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, anyị kwesịrị izi onye ọ bụla nwere mmasị ozi ọma Alaeze Chineke.—Ọrụ 8:12.