Afọ 1914 Ruo Afọ 2014 Bụ Otu Narị Afọ Kraịst Malitere Ịchị n’Eluigwe
N’afọ 1922, J. F. Rutherford ji obi ike kwuo, sị: “Lee, Eze ahụ na-achị achị! . . . Kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” Afọ a emeela ya otu narị afọ Alaeze ahụ malitere ịchị. Ma, ihe Nwanna Rutherford kwuru ka dị anyị ọkụ n’obi. Ka anyị niile gbasie mbọ ike jiri ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nyere ndị mmadụ aka ka ha mata banyere Alaeze Chineke. Ime otú ahụ ga-eme ka ọnwa Ọgọst a bụrụ nke anyị na-agaghị echefu echefu.