AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 106-109
“Keleenụ Jehova”
Gịnị mere ụmụ Izrel ji chefuo otú Jehova si zọpụta ha?
Ha wepụrụ obi ha n’ebe Chineke nọ, na-eche naanị ọdịmma ha
Olee otú ị ga-esi na-egosi Chineke na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere gị?
Echefula ihe ọma niile Jehova meere gị
Na-echeta ihe ndị o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu
Kelee Jehova maka ihe ọma ọ bụla o meere gị