Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb20 Septemba p. 3
  • Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịna-agbasa Akụkọ Ụgha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịna-agbasa Akụkọ Ụgha
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Onye Na-amaghị Ihe Na-ekweta Okwu Niile’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Mụtaworo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ị̀ Ma Ihe Niile Merenụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Iji Internet Na-eme Ihe—Nọrọ na Nche Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya!
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
mwb20 Septemba p. 3

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịna-agbasa Akụkọ Ụgha

Ebe otu nwaanyị hụrụ ihe juru ya anya n’ekwentị ya ka ọ nọ na-azụ mkpụrụ osisi.

Taa e nwere ike isi na redio, tiivi, Ịntanet ma ọ bụkwanụ akwụkwọ e biri ebi kọsaara ọtụtụ nde mmadụ ihe n’egbughị oge ọ bụla. Ndị na-efe “Chineke nke eziokwu” achọghị ịna-agbasa akụkọ ụgha, ma mgbe ha na-amaghị ama. (Ọma 31:5; Ọpụ. 23:1) Ihe na-abụghị eziokwu a kọsaara ndị ọzọ nwere ike ịkpata nnukwu nsogbu. Ị chọọ ịmata ma ihe ị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu, jụọ onwe gị sị:

  • ‘M̀ tụkwasịrị ebe akụkọ a si obi?’ E nwere ike onye na-akọrọ m ihe a amaghị ihe niile merenụ. A na-etinyekarị akụkọ si n’aka fere n’aka nnu na ose. N’ihi ya, i kwesịrị ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ị maghị ebe akụkọ ahụ si malite. Ebe ọ bụ na a tụkwasịrị ndị okenye ọgbakọ obi, ha kwesịrị ịkpachara anya karịchaa gbasara ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha na-amaghị ma ọ̀ bụ eziokwu

  • ‘Akụkọ a ò nwere ike imebi aha mmadụ?’ Ọ bụrụ na ọ ga-emebi aha mmadụ ma ọ bụ aha ụfọdụ ndị, ọ kacha mma ka ị ghara ịkọsara ya ndị ọzọ.—Ilu 18:8; Fil. 4:8

  • ‘Akụkọ a ọ̀ dara ka eziokwu?’ Kpachara anya ma ị nụ akụkọ ndị na-atọ ụtọ ná ntị

LEENỤ VIDIO BỤ́ GỊNỊ GA-ENYERE M AKA ỊKWỤSỊ ỊGBA ASỊRỊ? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Ebe e ji ihe kegide otu nwatakịrị nwoke na bọọdụ, a na-amanye mma gburugburu ya na bọọdụ ahụ.

    Dị ka e kwuru n’Ilu 12:18, olee nsogbu ihe mmadụ kwuru nwere ike ịkpata?

  • Ebe ndị mmadụ nọkọrọ ọnụ na-agba asịrị.

    Olee otú Ndị Filipaị 2:4 nwere ike isi nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-ekwu gbasara ndị ọzọ?

  • Ebe otu nwoke gbanyeere onye chọrọ ịgbara ya asịrị azụ.

    Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ ejiri mmadụ mewe ihe ọchị ma ọ bụ kwuwe ihe ọjọọ gbasara onye ahụ?

  • Ebe otu nwoke nọ na-agba asịrị, onye nke ọzọ jikeere ka onye nta akụkọ ana-edekọ ihe ọ na-ekwu.

    Tupu anyị amalite ikwu gbasara ndị ọzọ, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya