OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma N’ozi Ọma—Izi Onye Na-apụtaghị Apụta Ozi Ọma
GỊNỊ MERE O JI DỊ MKPA: Otú nkà na ụzụ si aga n’ihu n’ihu na otú ime mpụ si arị ibe ya elu emeela ka ụjọ na-atụzi ọtụtụ ndị imepere ndị ha na-amaghị ụzọ. Ụfọdụ ndị na-etinye kamera e ji ahụ ihe na-eme n’èzí ma ọ bụkwanụ rụnye telefon n’ihu ụlọ ha. O nwere ike ahụ́ agaghị eru anyị ala ma anyị chọwa izi onye anyị na-anaghị ahụ, ma ọ na-ahụ anyị, ozi ọma. Ihe ndị e kwuru n’okpuru ebe a ga-enyere anyị aka ịkata obi zie onye nọ n’ime ụlọ na-apụtaghị apụta ozi ọma ma ọ bụ jiri telefon a rụnyere n’ihu ụlọ zie mmadụ ozi ọma.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
Echela na ha agaghị ege ntị. Ọtụtụ ndị nwere telefon a rụnyere n’ihu ụlọ ma ọ bụ ndị na-achọghị ịpụta apụta na-enwe mmasị ige anyị ntị
Cheta na ụfọdụ kamera nwere ike ịmalite sewa ihe ị na-eme tupu gị akụwadị aka n’ọnụ ụzọ. Ndị nwe ụlọ nwekwara ike ịna-ahụ gị ma ọ bụ na-ege ihe ị na-ekwu ngwa ngwa ị batawara n’ụlọ ha
Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ azaghachi, na-ele kamera ahụ ma ọ bụ telefon ahụ anya na-ekwu okwu ka ị̀ na-agwa onye nwe ụlọ okwu. Na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-ekwu okwu otú i si ekwu ma gị na mmadụ kwuwe okwu ihu na ihu. Kwuo ihe ndị ị kwadoro ikwu ma a sị na onye nwe ụlọ ahụ pụtara. Ọ bụrụ kamera, ekwela ka ihu gị dịrị ezigbo nso na ya. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ azaghachighị gị, ahapụrụla ya ozi
Gị na onye nwe ụlọ kwuchaa, cheta na ọ ka nwere ike ịna-ele gị ma ọ bụ na-ege ihe ị na-ekwu