Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Iji Telefon Ezi Ozi Ọma
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Ọ bụ ụzọ ọzọ anyị na-esi enyere ndị mmadụ aka ka ha mụta ihe ga-eme ka a zọpụta ha. (2 Pita 3:9) Ọ bụ eziokwu na ịga n’ụlọ n’ụlọ bụ ụzọ anyị kacha esi ezi ozi ọma Alaeze Chineke, anyị na-esikwa ụzọ ndị ọzọ ezi ndị anyị na-enwetaghị n’ụlọ ozi ọma.—Mat. 24:14; Luk 10:1-7; Mkpu. 14:6.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Unu na-enwe ofufe ezinụlọ, meenụ ihe ngosi ebe mmadụ ji telefon na-ezi ozi ọma.