Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Mee p. 26-31
  • Otú Anyị Kwesịrị Ijiru Aha Jehova Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Anyị Kwesịrị Ijiru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “NDỊ GA-AZA AHA YA”
  • “UNU BỤ NDỊ ÀMÀ M”
  • ỤZỌ NDỊ ỌZỌ ANYỊ SI EGOSI NA ANYỊ JI AHA JEHOVA KPỌRỌ IHE
  • Otú Jizọs Jiruru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • “Toonụ Aha Jehova”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • “Họrọnụ . . . Onye Unu Ga-efe”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Mee p. 26-31

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 23

ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị

Otú Anyị Kwesịrị Ijiru Aha Jehova Kpọrọ Ihe

“Jehova kwuru, sị: ‘Unu bụ ndị àmà m.’”​—AỊZA. 43:10.

IHE A GA-AMỤ

Ihe anyị ga-eme iji gosi na aha Jehova dị nsọ, meekwa ka a kwụsị ịkọcha aha ya.

1-2. Olee otú anyị si mara na Jizọs weere aha Jehova ka ihe dị ezigbo mkpa?

JIZỌS weere aha Jehova ka ihe kacha ya mkpa. Ọ bụ ya kacha mee ka e too aha Nna ya. Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs dị njikere ịnwụ iji gosi na aha Jehova dị nsọ nakwa na ihe niile ọ na-eme ziri ezi. (Mak 14:36; Hib. 10:7-9) Jizọs chịchaa otu puku (1,000) afọ, ọ ga-eji obi ya niile nyefee Nna ya ikike niile o nwere iji doo aha Nna ya nsọ. (1 Kọr. 15:26-28) Otú Jizọs si jiri aha Nna ya kpọrọ ihe mekwara ka anyị mata ọtụtụ ihe banyere otú ya na Nna ya dịruru ná mma. O mere ka o doo anya na Jizọs hụrụ Nna ya n’anya nke ukwuu.

2 Jizọs bịara n’ụwa n’aha Nna ya. (Jọn 5:43; 12:13) O mere ka ndị na-eso ụzọ ya mara aha Nna ya. (Jọn 17:6, 26) Ọ kụziiri ndị mmadụ aha Nna ya, rụọkwa ọrụ ebube ndị ọ rụrụ n’aha ya. (Jọn 10:25) Jizọs rịọdịrị Nna ya ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya “n’ihi aha [ya].” (Jọn 17:11) O doro anya na Jizọs weere aha Nna ya ka ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, olee otú mmadụ ga-esi kwuo na ya na-eso ụzọ Jizọs n’eziokwu ma ọ bụrụ na ọ maghị aha Chineke ma ọ bụ na-akpọ ya?

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị na-eme ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ejiri aha Jehova kpọrọ ihe ma na-akwanyere ya ùgwù. (1 Pita 2:21) N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe mere ndị na-ekwusa “ozi ọma Alaeze Chineke” ji na-aza aha Jehova. (Mat. 24:14) Anyị ga-elebakwa anya n’ihe mere aha Jehova ji kwesị ịdị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa.

“NDỊ GA-AZA AHA YA”

4. (a) Olee ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya tupu ya alaghachi eluigwe? (b) Olee ajụjụ e kwesịrị ịza n’ihi ọrụ ahụ e nyere ha?

4 Obere oge tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu. Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-ekwusa ozi ọma n’ebe niile, ọ bụghị naanị n’Izrel. Ndị nọ ná mba niile ga-emecha nwee ohere iso bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20) Ma, Jizọs sịrị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m.” Ọ̀ ga-adị mkpa ka ndị a ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs mata aha Jehova, ka hà ga-abụ naanị ndị àmà Jizọs? Ihe ndị a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi isi 15 nyeere anyị aka ịza ajụjụ a.

5. Olee otú ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem si gosi na mmadụ niile kwesịrị ịma aha Jehova? (Kọwaakwa foto.)

5 N’afọ 49 Oge Ndị Kraịst, ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem zukọrọ ka ha kwuo banyere ihe ndị na-abụghị ndị Juu kwesịrị ime iji ghọọ Ndị Kraịst. Mgbe ha lebachara anya n’okwu ahụ, Jems bụ́ onye nne ji ya na Jizọs kwuru, sị: “[Pita] akọọrọla anyị nke ọma otú Chineke si cheta ndị mba ọzọ, malitezie isi n’ime ha na-ahọrọ ndị ga-aza aha ya.” Aha ònye ka Jems na-ekwu banyere ya? O kwuru ihe Emọs onye amụma kwuru. Ọ sịrị: “Ka ndị fọdụrụ wee chọsie mụnwa bụ́ Jehova ike, ha na ndị mba ọzọ niile, ndị na-aza aha m. Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova kwuru ihe ndị a.” (Ọrụ 15:14-18) Ọ bụghị naanị na ndị ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-amụta banyere Jehova, kama, ha ga-abụkwa ndị ‘na-aza aha ya.’ Ihe ọ pụtara bụ na ha ga-eme ka ndị ọzọ mara aha Chineke, ndị mmadụ ejirikwa aha ahụ mara ha.

Ebe Jems na-agwa ụfọdụ ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem okwu. Ndị okenye abụọ mepere akwụkwọ mpịakọta ma na-ege ntị.

Ná nnọkọ òtù na-achị isi nwere n’oge ndịozi, ha ghọtara nke ọma na Ndị Kraịst ga-abụ ndị na-aza aha Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6-7. (a) Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa? (b) Olee ihe ọzọ ka mkpa mere o ji bịa n’ụwa?

6 Aha Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” Ihe ndị Jizọs mere gosiri na ọ bụ n’aka ya ka Jehova ga-esi zọpụta ndị nwere okwukwe. Jizọs bịara n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Mat. 20:28) Àjà ahụ o ji ndụ ya chụọ mere ka o kwe omume ịzọpụta ndị mmadụ, ha enwetakwa ndụ ebighị ebi.​—Jọn 3:16.

7 Ma, gịnị mere o ji dị mkpa ka a zọpụta ndị mmadụ? Ọ bụ n’ihi ihe ahụ mere n’ogige Iden. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Adam na Iv, bụ́ nne na nna mbụ anyị, nupụụrụ Jehova isi, nke mere ka olileanya ịdị ndụ ebighị ebi kwaa ha. (Jen. 3:6, 24) Ma, Jizọs bịara n’ụwa ka o mee ihe dị mkpa karịa ịzọpụta ụmụ mmadụ bụ́ ndị mmehie. E kwutọrọ aha Jehova. (Jen. 3:4, 5) N’ihi ya, ịzọpụta ụmụ Adam na Iv gbasara otu ihe ka mkpa, ya bụ, ime ka e doo aha Jehova nsọ. Jizọs bụ onye ga-akacha rụọ ọrụ a n’ihi na ọ nọchitere anya Jehova ma mee ihe niile ọ chọrọ ka o mee.

Olee otú mmadụ ga-esi kwuo na ya na-eso ụzọ Jizọs n’eziokwu ma ọ bụrụ na ọ maghị aha Chineke ma ọ bụ na-akpọ ya?

8. Gịnị ka ndị niile kweere na Jizọs kwesịrị ịghọta?

8 Ọ ga-adị mkpa ka ndị niile nwere okwukwe na Jizọs, ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu, ghọta na ọ bụ Nna Jizọs, bụ́ Jehova Chineke, ga-azọpụta ha. (Jọn 17:3) Ihe ọzọ bụ na dị ka Jizọs, ha ga na-aza aha Jehova. Ọ ga-adịkwa mkpa ka ha ghọta na ido aha ahụ nsọ dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ihe ga-eme ka a zọpụta ha. (Ọrụ 2:21, 22) N’ihi ya, ndị niile na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịmụta banyere Jehova na Jizọs. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ikpeazụ o kwuru n’ekpere ahụ e dere na Jọn isi 17. Ọ sịrị: “Emeela m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ha wee hụ ndị ọzọ n’anya otú ị hụrụ m n’anya, ka mụ na ha wee dị n’otu.”​—Jọn 17:26.

“UNU BỤ NDỊ ÀMÀ M”

9. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji aha Jehova kpọrọ ihe?

9 N’ihi ihe anyị kwurula, o doro anya na ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-edorịrị aha Jehova nsọ. (Mat. 6:9, 10) Ha kwesịrị iwere aha Jehova ka aha kacha mkpa. Ọ pụtara na anyị ga-eme ihe gosiri na anyị ji aha ahụ kpọrọ ihe. N’ihi ya, gịnị ka anyị ga-eme iji doo aha Jehova nsọ ma gosi na ihe Setan kwuru banyere Jehova abụghị eziokwu?

10. Olee ụlọikpe e ji mee ihe atụ n’Aịzaya isi 42 ruo na nke 44? (Aịzaya 43:9; 44:7-9) (Kọwaakwa foto.)

10 N’Aịzaya isi 42 ruo na nke 44, anyị mụtara ihe anyị ga-eme iji doo aha Jehova nsọ. Ebe ahụ kọwara ụlọikpe e ji mee ihe atụ ebe a na-ekpebi onye bụ́ ezigbo chi. Jehova gwara ndị niile sịrị na ha bụ chi ka ha gosi na ha bụ chi n’eziokwu. Jehova kpọkwara ndị àmà chi ndị ahụ ka ha bịa gosi na chi ndị ahụ bụ ezigbo chi. Ma, o nweghị onye a hụrụ.​—Gụọ Aịzaya 43:9; 44:7-9.

Foto ndị na-egosi: Ebe ndị mmụọ ozi na-efegharị n’elu ka ụmụnna nọ n’ụwa niile na-eme ihe ndị ga-eme ka e doo aha Jehova nsọ. 1. Ebe otu di na nwunye ji ihe nkwagharị na-ekwusa ozi ọma. 2. Ebe otu nwanna nwaanyị na-eto eto na-enye nwa klas ha kaadị jw.org. 3. Ebe otu nwanna na-ezi otu nwoke ya na ya nọ n’ụgbọala ọhaneze ozi ọma. 4. Ebe ndị uwe ojii kpuchiri ihu du otu nwanna ha tụrụ ịga n’aka na-apụ. 5. Ebe otu nwanna nwaanyị nọ n’ụlọ ọgwụ na-agwa dọkịta ihe o kweere gbasara ọbara.

E nwere ọtụtụ ụzọ ụlọikpe ahụ e ji mee ihe atụ si gbasa anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)


11. Gịnị ka Jehova gwara ndị ya n’Aịzaya 43:10-12?

11 Gụọ Aịzaya 43:10-12. Jehova kwuru banyere ndị ya, sị: “Unu bụ ndị àmà m. Abụkwa m Chineke.” Jehova na-agwa ha ka ha zaa ajụjụ bụ́: “Ọ̀ dị Chineke ọzọ dị ma e wezụga m?” (Aịza. 44:8) N’ihi ya, ihe ọma Chineke meere anyị bụ na o nyere anyị ohere ịza ajụjụ ahụ. Anyị ga-esi n’okwu anyị na omume anyị gosi na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke. Aha ya dị elu karịa aha ndị ọzọ niile. Anyị ga-esikwa n’otú anyị si ebi ndụ gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu, na-erubekwara ya isi ọ bụrụgodị na Setan na-agbalị ime ka anyị kwụsị. Anyị ga-esi otú ahụ nye aka mee ka e doo aha Chineke nsọ.

12. Olee otú e si mezuo amụma dị n’Aịzaya 40:3, 5?

12 Ọ bụrụ na anyị ana-akwado aha Jehova, anyị na-eme ka Jizọs Kraịst. Aịzaya kwukwara na a ga-enwe onye ‘ga-edozi ụzọ Jehova.’ (Aịza. 40:3) Olee otú e si mezuo amụma a? Jọn Onye Na-eme Baptizim kwadebeere Jizọs ụzọ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ụzọ ahụ bụ “ụzọ Jehova” n’ihi na Jizọs bịara n’aha Jehova, kwuchitekwa ọnụ ya. (Mat. 3:3; Mak 1:2-4; Luk 3:3-6) Otu amụma ahụ kwuru, sị: “A ga-eme ka a mara na Jehova dị ebube.” (Aịza. 40:5) Olee otú e si mee ya? Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ nọchitere anya Jehova nke na ọ dị ka à ga-asị na ọ bụ Jehova n’onwe ya bịara n’ụwa.​—Jọn 12:45.

13. Olee otú anyị ga-esi eme ka Jizọs?

13 Dị ka Jizọs, anyị bụ ndị àmà Jehova. Anyị na-aza aha Jehova ma na-agwa onye ọ bụla anyị hụrụ ọrụ ya ndị dị ebube. Ma, iji mee ya nke ọma, anyị ga-emekwa ka a mata ọrụ dị mkpa Jizọs na-arụ iji doo aha Jehova nsọ. (Ọrụ 1:8) Jizọs bụ Onye Àmà Jehova kachanụ. Anyị na-emekwa ka ya. (Mkpu. 1:5) Ma, olee ụzọ ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị ji aha Jehova kpọrọ ezigbo ihe?

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ ANYỊ SI EGOSI NA ANYỊ JI AHA JEHOVA KPỌRỌ IHE

14. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 105:3, olee otú obi dị anyị banyere aha Jehova?

14 Anyị ji aha Jehova akpa nganga. (Gụọ Abụ Ọma 105:3.) Obi na-adị Jehova ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri aha ya na-eme ọnụ. (Jere. 9:23, 24; 1 Kọr. 1:31; 2 Kọr. 10:17) ‘Iji aha Jehova eme ọnụ’ pụtara na anyị ga na-akpa nganga na Jehova bụ Chineke anyị. Obi na-adị anyị ụtọ na anyị na-agwa ndị ọzọ na aha Jehova dị nsọ nakwa na ihe niile ọ na-eme ziri ezi. Ihere agaghị na-eme anyị mgbe ọ bụla ịgwa ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ klas anyị, ndị agbata obi anyị, na ndị ọzọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ekwensu chọrọ ka anyị kwụsị ịgwa ndị ọzọ banyere aha Jehova. (Jere. 11:21; Mkpu. 12:17) Nke bụ́ eziokwu bụ na Setan na ndị amụma ụgha chọrọ ka ndị mmadụ chefuo aha Jehova. (Jere. 23:26, 27) Ma, otú anyị si jiri aha Jehova kpọrọ ihe na-eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya “malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.”​—Ọma 5:11; 89:16.

15. Gịnị ka ịkpọku aha Jehova pụtara?

15 Anyị anaghị akwụsị ịkpọku aha Jehova. (Joel 2:32; Rom 10:13, 14) Ịkpọku aha Jehova apụtaghị naanị ịma aha Chineke ma na-akpọ ya. Anyị na-amata ụdị Chineke ọ bụ, na-atụsi anya ike ka ọ na-enyere anyị aka ma na-eduzi anyị. (Ọma 20:7; 99:6; 116:4; 145:18) Anyị na-agwakwa ndị ọzọ banyere aha ya na àgwà ndị o nwere, na-agba ha ume ka ha chegharịa ma mee ihe ha kwesịrị ime ka obi dị ya mma.​—Aịza. 12:4; Ọrụ 2:21, 38.

16. Olee otú anyị ga-esi gosi na Setan bụ onye ụgha?

16 Anyị dị njikere ịta ahụhụ n’ihi aha Jehova. (Jems 5:10, 11) Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi, ọ bụrụgodị na anyị ataa ahụhụ maka ya, anyị na-egosi na Setan bụ onye ụgha. N’oge Job, Setan kwuru banyere ndị na-efe Jehova, sị: “Mmadụ nọrọ n’ọnụ ọnwụ, ọ ga-enye ihe niile o nwere ka ọ zọọ ndụ ya.” (Job 2:4) Setan kwuru na ndị mmadụ ga na-efe Jehova naanị ma ọ bụrụ na ihe niile na-agara ha siriri werere nakwa na nsogbu bịara ha, ha ga-ahapụ Jehova. Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, gosiri na ihe ahụ bụ ụgha chara acha. Anyị na-emekwa otú ahụ. Jehova nyere anyị ohere igosi na n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla Setan kpataara anyị, anyị agaghị agbakụta Jehova azụ. Ka obi sie anyị ezigbo ike na Jehova ga na-echebe anyị n’ihi aha ya.​—Jọn 17:11.

17. Olee ụzọ ọzọ e kwuru na 1 Pita 2:12 anyị nwere ike isi too aha Jehova?

17 Anyị na-akwanyere aha Jehova ùgwù. (Ilu 30:9; Jere. 7:8-11) Ebe ọ bụ na anyị na-anọchite anya Jehova ma na-aza aha ya, anyị nwere ike ito aha ya ma ọ bụ mee ka a kọchaa ya. (Gụọ 1 Pita 2:12.) N’ihi ya, anyị chọrọ ịna-eme ihe niile anyị ga-emeli isi n’okwu ọnụ anyị na omume anyị na-eto Jehova. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-eme ka e too aha ya n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè.

18. Olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi gosi na aha Jehova dị anyị mkpa? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

18 Ito aha Jehova dị anyị mkpa karịa otú ndị mmadụ si ele anyị anya. (Ọma 138:2) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na otú anyị si jiri aha Jehova kpọrọ ihe nwere ike ime ka ndị gbara anyị gburugburu na-akparị anyị.a Mgbe Jizọs nwụrụ, ndị mmadụ weere ya ka onye omekome ma kparịa ya. Ma Jizọs dị njikere ịnwụ otú ahụ o si nwụọ ka e nwee ike ito aha Jehova. Baịbụl kwuru na ‘o kweghị ka ihere mee ya’ n’ihi na ihe bụ́ mkpa ya abụghị ihe ndị mmadụ chere gbasara ya. (Hib. 12:2-4) Ihe kacha ya mkpa bụ ime uche Chineke.​—Mat. 26:39.

19. Olee otú obi dị gị banyere aha Jehova? Maka gịnị?

19 Anyị ji aha Jehova akpa nganga. Ọ bụkwa ihe ọma ka Jehova meere anyị kwe ka anyị bụrụ Ndịàmà ya. N’ihi ya, anyị dị njikere idi nkọcha ọ bụla e nwere ike ịkọcha anyị. Aha Jehova dị anyị mkpa karịadị aha anyị. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịna-eto aha Jehova n’agbanyeghị nsogbu Setan nwere ike ịkpatara anyị. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na ọ bụ aha Jehova bụ́ ihe kacha anyị mkpa otú ahụ Jizọs Kraịst gosiri.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị gosiri na aha Jehova dị ndị na-eso ụzọ Jizọs ezigbo mkpa?

  • Olee ụlọikpe e ji mee ihe atụ nke gbasara anyị taa?

  • Olee otú anyị ga-esi gosi na aha Jehova dị anyị mkpa?

ABỤ NKE 10 Toonụ Jehova Chineke Anyị

a Job onye ezi omume malitedịrị iche banyere otú ndị mmadụ si ele ya anya mgbe mmadụ atọ sị na ha bụ ndị enyi ya bịara kwuo na ọ ga-abụrịrị na e nwere ihe ọjọọ o mere. Na mbụ, mgbe ụmụ Job nwụrụ, ihe niile o nwere emiekwa ala, “Job emehieghị, o kwughịkwa na Chineke mere ihe na-adịghị mma.” (Job 1:22; 2:10) Ma mgbe e boro ya ebubo na o mere ihe ọjọọ, ọ maliteziri ‘ikwu okwu n’echeghị echiche.’ Ihe gbasara aha ya bịara dị ya mkpa karịa ime ka e doo aha Jehova nsọ.​—Job 6:3; 13:4, 5; 32:2; 34:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya