AKỤKỌ NDỤ
“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
N’ABALỊ iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2010, anọ m na Strasbọg bụ́ obodo mara mma dị na Frans. Mana, ihe mere m ji gaa ebe ahụ abụghị ilegharị anya. Eso m ná ndị ọkàiwu e zigara n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ka ha gaa gbachitere ihe ruuru Ndịàmà Jehova. Ndị ọchịchị gwara ụmụnna anyị ka ha kwụọ ụtụ isi fọrọ obere ka ọ bụrụ nde yuro iri isii na anọ (64,000,000) (ya bụ, ihe dị ka otu narị ijeri naịra na ijeri iri atọ) (130,000,000,000). Anyị gara ebe ahụ ka anyị mee ka ha mata na iwu akwadoghị ụtụ isi a ha chọrọ ka anyị kwụọ. Ihe kadị mkpa abụghị ego ole a gwara anyị kwụọ. Ọ bụrụ na anyị emerie n’ikpe ahụ, ọ ga-eto aha Jehova, wetara ụmụnna anyị aha ọma, meekwa ka ha nwee ike ịna-efe Jehova na Frans n’enweghị onye ga-enye ha nsogbu. Ihe mere n’ikpe ahụ gosiri na “ọ bụ Jehova nwe agha” ahụ. (1 Sam. 17:47) Ka m kọwaa ihe m na-ekwu.
N’afọ 1999, ndị ọchịchị Frans kwuru na alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Frans ga-akwụ ụtụ isi n’onyinye ụmụnna nyere malite n’afọ 1993 ruo n’afọ 1996. Anyị wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe ndị dị na Frans. Ma, ha ekpeghị ikpe ziri ezi n’okwu ahụ. Anyị wepụrụ ya n’ụlọikpe mkpegharị ikpe dị na Frans. Ma, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha kpebiri. Ndị ọchịchị Frans jichiri ego alaka ụlọ ọrụ anyị dowere n’ụlọ akụ̀, nke karịrị nde yuro anọ na ọkara (4,500,000) (ya bụ, ihe karịrị ijeri naịra itoolu) (9,000,000,000). Olileanya ikpeazụ anyị nwere bụ iwepụ okwu ahụ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. Ma, tupu ụlọikpe ahụ ekpebie ikpe ahụ, ha chọrọ ka anyị na ndị ọkàiwu gọọmenti nọrọ n’ihu otu onye na-anọchite anya ụlọikpe ahụ lee ma ànyị ga-edozili okwu ahụ.
Anyị tụrụ anya na onye ahụ na-anọchite anya ụlọikpe ahụ ga-amanye anyị ikweta ịkwụ ụfọdụ n’ime ego ahụ ndị ọchịchị Frans chọrọ ka anyị kwụọ. Ma, anyị ghọtara na inye ha ego ọ bụla ga-emegide ihe Baịbụl kwuru ọ bụrụgodị otu yuro. Ụmụnna anyị ndị nọ n’obodo ahụ nyere ego ahụ iji kwado ozi Alaeze. N’ihi ya, ọ bụghị ndị ọchịchị nwe ego ahụ. (Mat. 22:21) N’agbanyeghị ya, anyị gara ebe ahụ iji kwanyere ụlọikpe ahụ ùgwù.
Ebe ndị ọkàiwu anyị nọ n’ihu Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop n’afọ 2010
Ebe anyị nọ kwuo okwu ahụ bụ n’otu ọnụ ụlọ mara mma a na-anọ enwe nnọkọ n’ụlọikpe ahụ. Okwu ahụ agaghị nke ọma ná mmalite. Mgbe onye ahụ na-anọchite anya ụlọikpe ahụ na-ekwu okwu mbido ya, o kwuru na Ndịàmà Jehova ga-akwụ ụfọdụ n’ime ego ahụ ndị ọchịchị Frans chọrọ ka ha kwụọ. Mmụọ Jehova mere ka anyị jụọ ya, sị: “Ị̀ ma na ndị ọchịchị Frans ejichiela ihe karịrị nde yuro anọ na ọkara anyị dowere n’ụlọ akụ̀?”
Otú ihu ya dị gosiri na ihe ahụ were ya ezigbo iwe. Mgbe ndị ọkàiwu gọọmenti Frans kwetara na ha weere ego ahụ, otú o si ele okwu ahụ anya gbanwere kpamkpam. Ọ baara ha ezigbo mba ma mechie nnọkọ ahụ ozugbo. M chọpụtara mgbe ahụ na Jehova agbanweela ihe niile gbasara okwu ahụ ka anyị nwee ike imeri na ya. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị pụrụ ebe ahụ. Ihe mezirinụ tụrụ anyị n’anya.
N’abalị iri atọ n’ọnwa Jun afọ 2011, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpelaara anyị ikpe. Ha kwuru na iwu akwadoghị ụtụ isi ahụ ndị ọchịchị Frans chọrọ ka anyị kwụọ, gwakwa ha ka ha nyeghachi anyị ego ahụ ha jichiri ma kwụọ anyị ọmụrụ nwa. Ihe a dị ezigbo mkpa e kpebiri na-eme ka ndị ọchịchị ghara inye anyị nsogbu na Frans. Ajụjụ ahụ mmụọ Jehova mere ka anyị jụọ yiri okwute ahụ Devid gbara Golayat n’isi. O mere ka egwú dagharịa. Gịnị mere anyị ji merie? Ọ bụ n’ihi na dị ka Devid gwara Golayat, “ọ bụ Jehova nwe agha” ahụ.—1 Sam. 17:45-47.
Ọ bụghị naanị n’okwu a ka anyị meriri. Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị siri ike na ndị okpukpe na-emegide anyị, Ndịàmà Jehova emeriela n’okwu ikpe dị otu puku, narị abụọ na iri abụọ na ise (1,225) n’ụlọikpe kacha elu ná mba iri asaa nakwa n’ụlọikpe ndị na-ekpebi ihe na-eme ná mba dị iche iche. Mmeri a anyị meriri n’ụlọikpe na-eme ka anyị nweta ihe ruuru anyị, dị ka ndị ọchịchị ideba aha anyị ka okpukpe iwu kwadoro, ikwusa ozi ọma, ịjụ ime ememme ndị e ji eto mba, na ịjụ ka a mịnye anyị ọbara.
Olee otú m si soro gaa ikpe na Yurop ebe ọ bụkwanụ na m na-eje ozi n’Isi Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Niu Yọk dị n’Amerịka?
NNE NA NNA M BỤ NDỊ OZI ALA ỌZỌ NA-ANỤ ỌKỤ N’OBI
Papa m bụ́ George na mama m bụ́ Lucille gara klas nke iri na abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ha nọ na-eje ozi n’Etiopia mgbe a mụrụ m n’afọ 1956. Ha si n’aha “Filip onye na-ezisa ozi ọma” gụọ m Philip. (Ọrụ 21:8) N’afọ na-eso ya, ndị ọchịchị machiri anyị iwu n’obodo ahụ. Ọ bụ eziokwu na m ka dị ezigbo obere, mana m na-echeta na ndị ezinụlọ anyị na-efe Chineke na nzuzo. Mgbe m dị obere, ọ na-atọ m ụtọ. Ma, ọ dị mwute na ndị ọchịchị manyere anyị ịhapụ obodo ahụ n’afọ 1960.
Mgbe Nwanna Nathan H. Knorr (n’isi isi aka ekpe) letara ndị ezinụlọ anyị n’Adis Ababa dị n’Etiopia n’afọ 1959
Mgbe ndị ezinụlọ anyị kwagara Wichita dị na Kansas dị n’Amerịka, ndị mụrụ m ka nọkwa na-anụ ọkụ n’obi otú ahụ ha na-anụ mgbe ha na-eje ozi ala ọzọ. Ha na-eme ihe ha na-amụta. Ha kụzikwaara mụ na nwanne m nwaanyị tọrọ m bụ́ Judy na nwanne m nwoke nke m tọrọ bụ́ Leslie ịhụ Jehova n’anya na iji obi anyị niile na-efe ya. A mụkwara ụmụnne m abụọ ahụ n’Etiopia. M mere baptizim mgbe m dị afọ iri na atọ. Mgbe afọ atọ gachara, ndị ezinụlọ anyị kwagara Arekipa dị na Peruu bụ́ ebe a chọkwuru ndị nkwusa.
N’afọ 1974, mgbe m dị naanị afọ iri na asatọ, alaka ụlọ ọrụ dị na Peruu zigara mụ na ụmụnna nwoke anọ ọzọ ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. E zigara anyị n’ebe a na-ezitụbeghị ozi ọma n’Ugwu Andiz. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga na-ekwusa ozi ọma n’obodo ndị na-asụ Kechua na Aịmara. Ihe anyị na-eji eme njem bụ ụgbọala anyị ji mere ụlọ, nke anyị na-akpọ Ụgbọ Noa n’ihi na ọ dị ka igbe buru ibu. Ọ na-atọ m ụtọ ma m cheta otú anyị si eji Baịbụl akụziri ndị obodo ahụ na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ ịda ogbenye, ọrịa, na ọnwụ. (Mkpu. 21:3, 4) Ọtụtụ n’ime ha malitere ife Jehova.
Ụgbọala anyị ahụ anyị na-akpọ “Ụgbọ Noa” n’afọ 1974
E ZIGARA M N’ISI ỤLỌ ỌRỤ ANYỊ
Mgbe Nwanna Albert Schroeder letara Peruu n’afọ 1977, ọ gbara m ume ka m tinye akwụkwọ ije ozi na Betel dị n’isi ụlọ ọrụ anyị. O so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. M mere ihe o kwuru. N’oge na-adịghị anya, n’abalị iri na asaa n’ọnwa Jun afọ 1977, m malitere ije ozi na Betel dị na Bruklin. N’ime afọ anọ ọzọ, m rụrụ ọrụ ná ngalaba ndị na-ehicha ụlọ na ndị na-emezi ihe ndị mebiri emebi.
Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ n’afọ 1979
N’ọnwa Jun afọ 1978, ahụrụ m otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Elizabeth Avallone ná mgbakọ mba niile e nwere na Niu Ọlịns dị na Luiziana. Nne na nna ya jikwa obi ha niile na-ejere Jehova ozi otú ahụ nne na nna m na-eme. Elizabeth na-asụ ụzọ kemgbe afọ anọ. Ọ chọkwara iji ndụ ya niile jee ozi oge niile. Mụ na ya nọ na-ezirịta ozi. N’oge na-adịghị anya, anyị riri ibe anyị obi. Anyị lụrụ n’abalị iri abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 1979. Ọ bịara soro m jewe ozi na Betel.
Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ mbụ anyị bụ́ Brooklyn Spanish nabatara anyị nke ọma. Anyị nọkwara n’ọgbakọ atọ ndị ọzọ. Ha hụrụ anyị n’anya, gbaakwa anyị ume ịnọsi ike n’ozi Betel. Otú a ha si kwado anyị tọgburu anyị atọgbu. Obi dịkwa anyị ụtọ maka aka ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị nyeere anyị ilekọta ndị nne na nna anyị mgbe ha mere agadi.
Ụmụnna na-eje ozi na Betel nọ n’ọgbakọ Brooklyn Spanish n’afọ 1986
ỌRỤ M RỤRỤ NÁ NGALABA OKWU IWU
O juru m anya na a gwara m ka m jewe ozi ná Ngalaba Okwu Iwu na Betel n’ọnwa Jenụwarị afọ 1982. Afọ atọ na-eso ya, e dunyere m ịga mahadum mụọ gbasara iwu ka m bụrụ ọkàiwu. M mụtara na ndị nọ n’Amerịka nakwa n’ebe ndị ọzọ nwere ikike ime ọtụtụ ihe n’ihi ọtụtụ mmeri Ndịàmà Jehova meriri n’ụlọikpe. Anyị mụrụ gbasara ikpe ndị a dị mkpa nke ọma na klas.
N’afọ 1986, mgbe m dị afọ iri atọ, a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta Ngalaba Okwu Iwu. Obi dị m ụtọ na a tụkwasịrị m obi nye m ọrụ a n’agbanyeghị na mụ akatabeghị ahụ́. Ma, o juru m anya n’ihi na e nweghị ọtụtụ ihe m ma, amakwa m na ọrụ a adịghị mfe.
M ghọrọ ọkàiwu n’afọ 1988. Ma, amaghị m na akwụkwọ m gụrụ na mahadum akpaala adịm ná mma mụ na Jehova aka ọjọọ. Ịga ụlọ akwụkwọ dị elu nwere ike ime ka mmadụ na-achọ inwetakwu ihe, meekwa ka ọ na-eche na ya ka ndị ọzọ na-agụghị akwụkwọ otú ọ gụrụ. Nwunye m nyeere m aka mụ ebidokwa ịna-eme ihe ndị m na-emebu ka mụ na Jehova dị ná mma tupu mụ agaa mahadum. O were oge. Mana, ka oge na-aga, m ji nwayọọ nwayọọ mee ka mụ na Jehova dịwakwa ná mma. Ihe mere m egosila m na mmadụ ịma ọtụtụ ihe abụghị ihe kacha mkpa ná ndụ. Ihe na-eme ka ndụ mmadụ nwee isi bụ ma ya na Jehova dị n’ezigbo mma, ya ejiri obi ya hụ ma Jehova ma ndị ya n’anya.
ỊGBACHITERE OZI ỌMA NAKWA ỊGBALỊ IJI IHE IWU KWURU KWADO IZISA OZI ỌMA
Mgbe m gachara mahadum, m tinyeziri uche m n’inyere ngalaba anyị aka ilebara okwu iwu ndị e nwere na Betel anya na ịna-aga n’ụlọikpe iji chebe nzukọ Jehova nakwa ka a ghara ịkwụsị anyị ikwusa ozi ọma. Ọrụ m na-atọ m ezigbo ụtọ. Ma e nwekwara ihe isi ike ya na ya so n’ihi na ihe na-agbanwe n’ike n’ike ná nzukọ Jehova. Dị ka ihe atụ, n’oge mbụ, anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha nye onyinye ma anyị nye ha akwụkwọ. Mana, malite n’afọ 1991, a gwara Ngalaba Okwu Iwu ka ha nye aka mgbe a chọrọ inye ntụziaka otú a ga-esi akwụsị ya. Ndịàmà Jehova na-enyezi ndị mmadụ akwụkwọ n’anaghị ha ego. Ihe a mere ka ọrụ a na-arụ na Betel nakwa ozi ọma a na-ekwusa dị mfe. O nyekwara aka ka a ghara ịna-enye anyị nsogbu ịkwụ ụtụ isi. Ụfọdụ ndị chere na ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-enweta ego ga-ezu ịna-ebipụta akwụkwọ a ga na-enye ndị mmadụ, ya emezie ka ọtụtụ ghara ịna-amụta gbasara Jehova. Ihe a emetụdịghị ma otu. Ndị na-efe Jehova malite n’afọ 1990 gawa amụbaala karịa okpukpu abụọ. Taakwa, ndị mmadụ na-enweta akwụkwọ ndị ha ji amụ Baịbụl n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Achọpụtala m na ihe mere ka nnukwu mgbanwe ndị a na-enwe ná nzukọ Jehova na-aga nke ọma bụ naanị n’ihi na Jehova na-enyere anyị aka nakwa n’ihi ntụziaka si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.—Ọpụ. 15:2; Mat. 24:45.
Ihe na-eme ka anyị na-emeri n’okwu ndị anyị nwere n’ụlọikpe abụghị maka na anyị nwere ezigbo ndị ọkàiwu. Ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ka ndị ọchịchị kpelaara anyị ikpe bụ àgwà ọma Ndịàmà Jehova. Achọpụtara m ihe a n’afọ 1998, mgbe mmadụ atọ so n’Òtù Na-achị Isi n’oge ahụ na ndị nwunye ha gara mgbakọ pụrụ iche ndị e nwere na Kuba. Otú ha si dịrị obiọma ma na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù mere ka ndị ọchịchị mara na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe a gbaara ha àmà karịa ihe anyị na ha kwuru mgbe anyị na-ekwurịta okwu.
Ma mgbe ụfọdụ, ihe anyị na-eme iji kwụsị mmegbu a na-emegbu ndị Jehova bụ ịga n’ụlọikpe iji ‘gbachitere ozi ọma nakwa ịgbalị iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.’ (Fil. 1:7) Dị ka ihe atụ, ruo ọtụtụ afọ, ndị ọchịchị nọ na Yurop na Saụt Koria ekwetaghị na ụmụnna anyị nwere ike ịjụ ịga agha ma ọ bụrụ na ha achọghị ịbanye amị. Ihe a mere ka a tụọ ihe dị ka puku ụmụnna anyị iri na asatọ (18,000) mkpọrọ na Yurop, tụọkwa ihe karịrị puku ụmụnna anyị iri na itoolu (19,000) mkpọrọ na Saụt Koria n’ihi na akọnuche ha ekweghị ha baa amị.
N’ikpeazụ, n’abalị asaa n’ọnwa Julaị afọ 2011, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpere ikpe pụrụ iche gbasara Nwanna Bayatyan na mba Aminia ma kpebie na mba niile dị na Yurop kwesịrị ịhapụ ụmụ amaala ha ka ha na-arụ ọrụ ndị ọzọ na-agbasaghị ịga agha ma ọ bụrụ na akọnuche ha ma ọ bụ ihe ha kweere ekweghị ha baa amị. Ụlọikpe dị na Saụt Koria kpebikwara ihe yiri ya n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jun afọ 2018. Ọ bụrụgodị na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna anyị bụ́ okorobịa bara amị, ụlọikpe ndị a agaraghị ekpebi ikpe ndị a otú a.
Ngalaba Okwu Iwu dị n’isi ụlọ ọrụ anyị nakwa n’alaka ụlọ ọrụ anyị n’ụwa niile na-agbasi mbọ ike ịgbachitere ndị Jehova ka ha nwee ike ịna-efe Jehova ma na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke. Obi dị anyị ụtọ na anyị gara kwuchite ọnụ ụmụnna anyị ndị ọchịchị na-emegide. Ma ànyị meriri n’ụlọikpe ma ọ bụ na anyị emerighị, akwụkwọ anyị gbara na-eme ka a gbaara ndị gọvanọ, ndị eze, na mba niile àmà. (Mat. 10:18) Ndị ikpe, ndị na-anọchi anya ndị ọchịchị, ụlọ ọrụ mgbasa ozi, nakwa ọhaneze na-eche banyere amaokwu Baịbụl ndị anyị dere n’akwụkwọ anyị ji gbaa akwụkwọ ma ndị nke anyị na-ekwu n’ụlọikpe iji kwado ihe anyị na-ekwu. Ndị nwere ezi obi na-amata ndị Ndịàmà Jehova bụ, na-amatakwa na ihe ndị ha kweere si na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha aghọọla ụmụnna anyị.
JEHOVA, I MEELA
Kemgbe afọ iri anọ, esorola m leba anya n’okwu ikpe gbasara alaka ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụwa niile, pụtakwa n’ihu ọtụtụ ụlọikpe dị elu nakwa n’ihu ndị ọrụ gọọmenti a na-akwanyere ùgwù. Ahụrụ m ụmụnna ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ ná Ngalaba Okwu Iwu n’isi ụlọ ọrụ anyị nakwa n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụwa n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe. Jehova agọziela m, ndụ m jukwara m afọ.
Nwunye m bụ́ Elizabeth ji obi ya niile na-akwado m kemgbe afọ iri anọ na ise, ma n’oge ihe dị mma ma n’oge ihe siri ike. M ji ya kpọrọ ihe n’ihi na o meela ihe a n’agbanyeghị na ọ na-arịa ọrịa na-eme ka ike na-agwụ ya.
Anyị ejirila anya anyị hụ na ọ bụghị anyị na-eme ka anyị nweta ike na mmeri. Ihe Devid kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Jehova bụụrụ ndị ya ike.” (Ọma 28:8) N’eziokwu, “ọ bụ Jehova nwe agha a.”