IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Na-amụ Ihe Ka I Nwee Ike Ịkọrọ Ndị Ọzọ Ihe Ị Mụtara
Ịmụ ihe nwere ike ime ka obi dị anyị ụtọ. Ma, anyị ga-aka enwe obi ụtọ ma anyị na ndị ọzọ kwurịta ihe ndị anyị mụtara ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso. Ilu 11:25 ji ihe atụ kọwaa otú o nwere ike isi eme. Ọ sịrị: “Onye na-enyejukwa ndị ọzọ mmiri afọ ka a ga-enyeju mmiri afọ.”
Ọ bụrụ na anyị akọọrọ ndị ọzọ ihe anyị mụtara, ọ ga-enyere anyị aka icheta isi ihe ndị ahụ ngwa ngwa, meekwa ka anyị ghọtakwuo ha. Ebe ọ bụkwa na ihe anyị mụtara nwere ike ịbara ndị ọzọ uru, ọ na-eme anyị obi ụtọ ịkọrọ ha ihe ndị ahụ bara ezigbo uru.—Ọrụ 20:35.
Megodị ihe a: N’izu na-abịa abịa, chọta ohere ị ga-eji gwa mmadụ ihe ị mụtara. I nwere ike ịgwa ya onye ezinụlọ unu, onye ọgbakọ unu, onye gị na ya na-arụkọ ọrụ, nwa akwụkwọ ibe gị, onye agbata obi gị, ma ọ bụkwanụ onye ị hụrụ n’ozi ọma. Gbalịa jiri okwu nke aka gị kọwaara onye ahụ ihe ị mụtara. Meekwa ka ọ dị mfe, dookwa ya anya.
Cheta na: Ihe mere i ji akọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara abụghị ka i gosi ha na ụbụrụ na-aghọ gị nkọ, kama ọ bụ ka ị gbaa ha ume.—1 Kọr. 8:1.