panitan/stock.adobe.com
Jizọs Ga-akwụsị Ịda Ogbenye
N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu, karịchaa ndị dara ogbenye na ndị na-ata ahụhụ. (Matiu 9:36) O jidị ndụ ya chụọ àjà maka ndị ọzọ. (Matiu 20:28; Jọn 15:13) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-egosi ụmụ mmadụ ọzọ na ọ hụrụ ha n’anya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ iji ike ya ka Eze nke Alaeze Chineke kwụsị ịda ogbenye n’ebe niile n’ụwa.
Ihe Baịbụl kwuru na Jizọs ga-eme magburu onwe ya. Ọ sịrị:
“Ka o kpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ime ndị gị.Ka ọ zọpụta ụmụ ndị ogbenye.”—Abụ Ọma 72:4.
Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs meere anyị nakwa ihe ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu? Otu ụzọ bụ ịmụ banyere “ozi ọma Alaeze Chineke” Jizọs kwusara. (Luk 4:43) Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?”