Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 60
  • Olee Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee Otú Eziokwu Ga-esi Eme Ka I Nwere Onwe Gị?
    Teta!—2012
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 60

Olee Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Ịtụ ụjọ ọnwụ abụghị ihe ọjọọ n’ihi na ọnwụ bụ onye iro anyị, anyị anaghịkwa eji ndụ anyị egwu egwu. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ma, ọ bụrụ na ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere emee ka mmadụ na-atụ ọnwụ ụjọ na-enweghị isi, ọ ga-eme ka onye ahụ ‘nọrọ n’ohu ná ndụ ya niile.’ (Ndị Hibru 2:​15) Ịmata ihe bụ́ eziokwu ga-eme ka ị ghara ịna-atụ ọnwụ ụdị ụjọ a, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ ghara ịnụ ụtọ ndụ.​—Jọn 8:​32.

Ihe bụ́ eziokwu gbasara ọnwụ

  • Ndị nwụrụ anwụ enweghịzi ihe ha ma. (Abụ Ọma 146:4) Baịbụl ji ọnwụ tụnyere ụra. Ọ bụ ya mere i kwesịghị ịtụwa ụjọ na ị ga na-ata ahụhụ ma ọ bụ gaa n’ebe a ga na-emekpa gị ahụ́ ma ị nwụọ.​—Abụ Ọma 13:3; Jọn 11:11-​14.

  • E nweghị ihe ndị nwụrụ anwụ ga-emeli ndị dị ndụ. Ndị iro anyị na-eme ihe ike nwụọ, o nweghịzi ihe ha ga-emeli anyị. (Aịzaya 26:14) Baịbụl sịrị na “ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi.”​—Ekliziastis 9:6.

  • Ma, ọ pụtaghị na onye ọ bụla nwụrụnụ agaghịzi adị ndụ ọzọ. Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.​—Jọn 5:​28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

  • Chineke kwekwara anyị nkwa na oge na-abịa mgbe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ.’ (Mkpughe 21:4) Baịbụl kwuru banyere oge ahụ, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi,” ha agakwaghị na-atụ ụjọ na ha ga-anwụ.​—Abụ Ọma 37:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya